Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU NKE 1

Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo

Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo

“Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị.”—Matiu 19:4

Ọ bụ Jehova * Chineke malitere alụmdi na nwunye. Baịbụl gwara anyị na mgbe Chineke kere Iv, ọ kpọọrọ ya kpọtara Adam. Obi tọrọ Adam ezigbo ụtọ, o wee sị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m.” (Jenesis 2:22, 23) Jehova chọkwara ka ndị bụ́ di na nwunye taa na-enwe obi ụtọ.

Mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye, o nwere ike iche na ha agaghị na-ese okwu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị di na nwunye na-anaghị ese okwu n’agbanyeghị na ha hụrụ ibe ha n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 7:28) N’akwụkwọ a, ị ga-ahụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere unu aka ịna-ebi n’udo n’ezinụlọ unu ma unu na-eme ha.—Abụ Ọma 19:8-11.

1 NA-ARỤ ỌRỤ JEHOVA NYERE GỊ

IHE BAỊBỤL KWURU: Di bụ onyeisi ezinụlọ.—Ndị Efesọs 5:23.

Ọ bụrụ na ị lụọla nwaanyị, Jehova chọrọ ka ị na-elekọta ya nke ọma. (1 Pita 3:7) Chineke mere ya ka ọ bụrụ onye ga na-enyere gị aka. Ọ chọkwara ka ị na-akwanyere ya ùgwù, hụkwa ya n’anya. (Jenesis 2:18) I kwesịrị ịhụ nwunye gị n’anya ruo n’ókè na ị ga na-ebute ọdịmma ya ụzọ.—Ndị Efesọs 5:25-29.

Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị nọ na di, Jehova chọrọ ka ị na-akwanyere di gị ùgwù nke ukwuu. Ọ chọkwara ka ị na-enyere ya aka ịrụ ọrụ ya nke ọma. (1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 5:33) Di gị kpebie ihe unu ga-eme, kwado ya. (Ndị Kọlọsi 3:18) Ọ bụrụ na ị na-asọpụrụ di gị, ọ ga-ahụ gị n’anya, Jehova ga-ahụkwa gị n’anya.—1 Pita 3:1-6.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ị ga-eme ka ị bụrụkwuo ezigbo mmadụ. Gee ntị n’ihe ọ ga-agwa gị, gbaakwa mbọ ka i mee ihe ọ gwara gị

  • Nwee ndidi. Ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka unu ga-eji mụtacha otú unu ga-esi na-ebi n’udo

2 EMELA YA IHE GA-EWUTE YA

IHE BAỊBỤL KWURU: I kwesịrị ịna-eme ihe ga-adị di gị ma ọ bụ nwunye gị mma. (Ndị Filipaị 2:3, 4) Cheta na Jehova achọghị ka anyị na-emesi ndị ọzọ ike, n’ihi ya, ejila di gị ma ọ bụ nwunye gị egwu egwu. Kama, jiri obiọma na-emeso ya ihe. (2 Timoti 2:24) Baịbụl kwuru na okwu e kwuru “n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” N’ihi ya, na-ata okwu gị ezé. (Ilu 12:18) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ka ị na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu ọma nke ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya.—Ndị Galeshia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 4:6.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Rịọ Chineke ka o nyere gị aka ka obi ruo gị ala ma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuwe ihe dị mkpa unu chọrọ ime nakwa ka ị ghara ịbụ ekwe ekwe

  • Chebara ihe ị ga-ekwu na otú ị ga-esi ekwu ya echiche

3 NWEENỤ OTU OBI

IHE BAỊBỤL KWURU: Baịbụl kwuru na mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye, “ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:5) N’agbanyeghị na unu abụọ bụ otu anụ ahụ́, unu ka bụkwa mmadụ abụọ. Ọ bụghị mgbe niile ka ihe masịrị gị ga-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị. N’ihi ya, gbalịanụ ka obi unu bụrụ otu. (Ndị Filipaị 2:2) O kwesịghị ịbụ unu na-akpa ihe dị mkpa unu ga-eme, onye nke a na-ekwu n’elu, onye nke ọzọ ana-ekwu n’ala. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “A na-eji ndụmọdụ eme ka atụmatụ guzosie ike.” (Ilu 20:18) N’ihi ya, mgbe ọ bụla unu na-ekpebi ihe unu ga-eme, kwenụ ka ihe Baịbụl kwuru nyere unu aka.—Ilu 8:32, 33.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị otú obi dị gị, ọ bụghị naanị ihe ndị i chere unu ga-eme ma ọ bụ ihe ị chọrọ ka o mee

  • Tupu i kweta imere mmadụ ihe, buru ụzọ gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị

^ para. 4 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.