Akwụkwọ Ozi Jems Dere 3:1-18

  • Ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-azụli ire (1-12)

    • Ọ bụghị unu niile kwesịrị ịbụ ndị nkụzi (1)

  • Amamihe nke si n’eluigwe (13-18)

3  Ụmụnna m, ọ bụghị unu niile kwesịrị ịbụ ndị nkụzi, n’ihi na unu ma na Chineke ga-enyocha anyị nke ọma maka ihe anyị kụziri, kpeekwa anyị ikpe maka ya.+  N’ihi na anyị niile na-emejọ ihe* ọtụtụ ugboro.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla anaghị emejọ ma o kwuwe okwu, ọ bụ onye zuru okè, onye nwere ike ịtụrụ ahụ́ ya niile ụka.  Ọ bụrụ na anyị ekee eriri e ji eduzi ịnyịnya n’ọnụ ya ka ọ na-erubere anyị isi, anyị na-eduzikwa ahụ́ ya niile.  Ọ bụkwa otú ọ dị n’ihe gbasara ụgbọ mmiri. Ọ bụ eziokwu na ọ na-ebu ezigbo ibu, oké ifufe na-enugharịkwa ya, ma, a na-eji obere ụmara na-akwọ ya ka ọ gaa ebe onye nọ n’isi ụgbọ chọrọ ka ọ gaa.  Ire bụkwa ntakịrị ihe dị n’ahụ́ anyị, ma anyị na-eji ya etu ọnụ. Ntakịrị ọkụ nwekwara ike ịgba oké ọhịa ọkụ.  Ire dị ka ọkụ.+ Ọ bụ ihe dị anyị n’ahụ́, nke na-eme ihe ọjọọ, na-emerụkwa ahụ́ niile.+ O nwere ike ịla ndụ mmadụ n’iyi. Ọ dịkwa ka Gehena* n’ihi na ọ na-ala ihe n’iyi.  E nwere ike ịzụ ụdị anụ ọhịa niile na nnụnụ na anụ ndị na-arị arị na anụ ndị bi n’oké osimiri. Ụmụ mmadụ azụọkwala ha.  Ma ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-azụli ire. Ire dị njọ. Mmadụ anaghị ejideli ya. Ihe juru na ya bụkwa nsí na-egbu mmadụ.+  Anyị na-eji ya eto Jehova* Nna anyị. Anyị na-ejikwa ya abụ ụmụ mmadụ ọnụ, ndị e kere ha “adịrị ka Chineke.”+ 10  N’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na ịbụ ọnụ si apụta. Ụmụnna m, ihe ndị a ekwesịghị ịna-eme.+ 11  Mmiri dị mma ọṅụṅụ* na mmiri na-atọ nnu nnu* hà na-esi n’otu isi mmiri asọpụta? 12  Ụmụnna m, osisi fig ò nwere ike ịmị mkpụrụ oliv, ka osisi vaịn ò nwere ike ịmị mkpụrụ fig?+ Mmiri nnu enweghịkwa ike ịgbapụta mmiri dị mma ọṅụṅụ. 13  Ò nwere onye n’ime unu ma ihe, na-aghọtakwa ihe? Ya na-akpa àgwà ọma, dịrịkwa nwayọọ. Ọ bụ ya ga-egosi na ọ ma ihe. 14  Ma ọ bụrụ na unu na-enwere ibe unu anyaụfụ,+ na-esekwa okwu,*+ unu etula ọnụ+ na unu ma ihe. Ọ bụrụ na unu na-eme otú a, unu na-agha ụgha. 15  Ụdị amamihe a esighị n’eluigwe. Kama ọ bụ nke ụwa,+ nke ndị anụ ahụ́ na-achị, nakwa nke ndị mmụọ ọjọọ. 16  N’ihi na n’ebe ọ bụla e nwere anyaụfụ na esemokwu,* ọgba aghara na ụdị ihe ọjọọ niile na-adị ebe ahụ.+ 17  Ma amamihe nke si n’eluigwe na-ebu ụzọ eme ka obi mmadụ dị ọcha.+ Ọ na-emekwa ka onye ahụ na-eme udo,+ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ na-eji obi ya niile erube isi, na-emetere ndị ọzọ ebere, na-eme ihe dị mma,*+ ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu,+ gharakwa ịdị ihu abụọ.+ 18  Ndị na-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị ná mma+ na-eme ka udo dịrị na-aga,+ ọ na-emekwa ka ha na-eme ihe dị mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “na-ada.”
Gụọ A5.
Na Grik, “Mmiri na-atọ ụtọ.”
Na Grik, “mmiri na-elu ilu.”
O nwere ike ịbụ, “na-achọkwa ihe ga-abara naanị onwe unu uru.”
O nwere ike ịbụ, “na ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru.”
Ma ọ bụ “na-amị ọtụtụ ezigbo mkpụrụ.”