Gaa n'Isiokwu

‘Na-ezisa Ozi Ọma’

Mgbakọ Ukwu Ndịàmà Jehova nke Afọ 2024

Ị gaghị akwụ ụgwọ iji bata A gaghịkwa ana gị ego

Ihe Ụfọdụ A Ga-eme ná Mgbakọ A

Nnọkọ Fraịdee: Ị ga-achọpụta ihe ndị na-egosi na ihe ndị a kọrọ gbasara ndụ Jizọs n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn mere eme n’eziokwu. Ị ga-amụtakwa otú akụkọ ndị ahụ dị na Baịbụl ga-esi abara anyị uru taa.

Nnọkọ Satọdee: Olee amụma ndị e buru gbasara ọmụmụ Jizọs na oge ọ bụ nwatakịrị? Oleekwa otú amụma ndị ahụ si mezuo?

Nnọkọ Sọnde: A ga-ekwu okwu isiokwu ya bụ “Ihe Mere na Anyị Anaghị Atụ Ụjọ Akụkọ Ọjọọ.” N’okwu ahụ, ị ga-amata ihe mere obi ji eru nde kwuru nde ndị mmadụ ala taa nakwa ihe mere obi ji sie ha ike na ọdịnihu ga-aka mma n’agbanyeghị na ihe na-akakwu njọ n’ụwa.

Ihe Nkiri

Oziọma Jizọs Kwusara: Nke 1

Ezigbo Ìhè Nke Ụwa

Otú e si mụọ Jizọs bụ ọrụ ebube, bụrụkwa naanị nke mbụ n’ime ọtụtụ ihe dị mkpa mere mgbe Jizọs dị obere. Nne na nna ya kpọgara ya Ijipt mgbe otu ajọ eze chọrọ igbu ya. Mgbe e mechara, Jizọs mere ihe tụrụ ụfọdụ ndị nkụzi a ma ama n’oge ya n’anya. A ga-egosi ihe ndị a na ihe ndị ọzọ n’agba nke mbụ na nke abụọ n’ihe nkiri a ga-ele n’ụbọchị Fraịdee na Satọdee.

Lee vidio ndị a maka mgbakọ ukwu nke afọ a

Gịnị Ka Anyị Na-eme ná Mgbakọ Ukwu Anyị?

Chọpụta ihe ị ga-ahụ ná mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova.

Mgbakọ Ukwu Ndịàmà Jehova nke Afọ 2024: ‘Na-ezisa Ozi Ọma’

Lee ihe ụfọdụ anyị ga-amụta ná mgbakọ ukwu nke afọ a.

Ihe Ụfọdụ Si n’Ihe Nkiri Bụ́: Oziọma Jizọs Kwusara

Ọtụtụ ndị ma na otú e si mụọ Jizọs bụ ọrụ ebube. Ma, olee ihe ndị mere tupu a mụọ ya nakwa ihe ndị mere mgbe a mụchara ya?