Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU NKE 6

Otú Ụmụaka Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye

Otú Ụmụaka Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye

“Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova.”—Abụ Ọma 127:3

Di na nwunye mụta nwa mbụ ha, obi na-abụ ha sọ aṅụrị. Ha na-eji oge ha na ike ha niile na-elekọta ya. O nwere ike ime ka ha ghara ịna-ehi ụra nke ọma. Ihe a niile nwekwara ike ime ka di na nwunye na-eleghara ibe ha anya. Ma, ọ bụrụ na ha ahazie oge ha, ha ga na-elekọta nwa ha, birikwa n’udo. Olee otú Baịbụl ga-esi enyere ha aka?

1 OTÚ NWA ỌHỤRỤ SI AGBANWE NDỤ DI NA NWUNYE

IHE BAỊBỤL KWURU: Baịbụl kwuru na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma.” O kwukwara na ịhụnanya adịghị achọ ọdịmma nke ya nakwa na ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Uche nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-adịkarị naanị n’ebe nwa ya nọ. Ọ dị otú ahụ, di ya nwere ike ichewe na nwunye ya na-eleghara ya anya. Ma, nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ kwesịrị icheta na ọ ga na-elekọtakwa di ya. O jiri ndidi na-elekọta nwa ya ma jiri obiọma na-emeso di ya ihe, ọ ga-edo di ya anya na ọ ka hụrụ ya n’anya. Ọ gaghịkwa esiri di ya ike iso ya na-elekọta nwa ha.

Baịbụl gwara ndị bụ́ di, sị: “Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ dị ka ihe ọmụma si dị.” (1 Pita 3:7) N’ihi ya, di kwesịrị ịghọta na nwunye ya na-eji oge ya na ike ya elekọta nwa ọhụrụ ha. Ọrụ dị n’ilekọta nwa ọhụrụ nwere ike ime ka ọ ghara ịna-ezu ike ma ọ bụ mee ka ọ na-echegbu onwe ya. Oge ụfọdụ, o nwedịrị ike ime ihe ga-ewe di ya iwe. Ma, di ya ga-agbalị na-ejide onwe ya, n’ihi na “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.” (Ilu 16:32) Ọ ga-agbalịkwa ka otú o si emeso nwunye ya na-egosi na ọ ghọtara ihe ya na ya na-alụ. Ọ ga-enyekwara ya aka mgbe ọ bụla ọ chọrọ ka o nyere ya aka.—Ilu 14:29.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Di: Nyere nwunye gị aka na-elekọta nwa unu, ma n’ehihie ma n’abalị. Ekwela ka ihe ọzọ gbochie gị na nwunye gị na nwa gị ịna-anọrị

  • Nwunye: Mgbe ọ bụla di gị chọrọ inyere gị aka lekọta nwa unu, hapụ ya ka o nyere gị aka. Ọ bụrụ na o metachaghị ihe otú ị tụrụ anya ya, akatọla ya. Kama, wetuo obi kụziere ya otú ọ ga-esi eme ihe ahụ

2 NA-AHỤKWUNỤ IBE UNU N’ANYA

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ha ga-aghọ otu anụ ahụ́.’ (Jenesis 2:24) N’agbanyeghị na onye nke atọ abatala n’ezinụlọ unu, cheta na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ka bụ “otu anụ ahụ́.” Gbaanụ mbọ ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya.

Nwunye, mgbe ọ bụla di gị nyeere gị aka lekọta nwa, jaa ya mma. Okwu ọma ị gwara ya ga-eme ka obi dị ya mma. (Ilu 12:18) Di, na-agwa nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya. Na-aja ya mma maka otú o si elekọta gị na nwa.—Ilu 31:10, 28.

“Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Na-emerenụ ibe unu ihe ọma mgbe ọ bụla. Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji na-akparịta ihe ụfọdụ, gee ibe unu ntị, jaakwa ibe unu mma. Ihe gbasara mmekọahụ ekwesịghị ịna-esere gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu. Cheta ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Unu ajụla inye ya ibe unu, ọ gwụla ma ùnu kwekọrịtara.” (1 Ndị Kọrịnt 7:3-5) N’ihi ya, kparịtanụ banyere ya otú ọ gaghị na-esere unu okwu. Ọ bụrụ na unu na-enwere ibe unu ndidi, marakwa na ihe ọ bụla kwesịrị inwe oge ya, unu ga-ahụkwu ibe unu n’anya.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-ewepụtanụ oge unu abụọ ga-eji na-anọrị

  • Na-emere di gị ma ọ bụ nwunye gị ụmụ irighiri ihe ndị ga-egosi ya na ị hụrụ ya n’anya

3 NA-AZỤNỤ NWA UNU

IHE BAỊBỤL KWURU: “Malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta.” (2 Timoti 3:15) Kpebienụ otú unu ga-esi akụziri nwa unu ihe. Echela na o nweghị ihe nwa ọhụrụ ga-amụtali. Ụbụrụ ụmụaka na-aghọ nkọ. Mgbe ha nọ n’afọ, ha na-amata olu gị, na-amakwa mgbe obi dị gị ụtọ ma ọ bụ mgbe iwe ji gị. Malite mgbe ọ ka dị ezigbo obere gụwara ya ihe. N’agbanyeghị na o nwere ike ọ gaghị na-aghọta ihe ị na-agụ, ọ ga-eme ka ịgụ ihe na-atọ ya ụtọ ma o too.

Echela na nwa gị erubeghị ịnụ banyere Chineke. O kwesịrị ịnọ ya mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere. (Diuterọnọmi 11:19) Unu na ya gwuwe egwu, na-agwanụ ya banyere ihe ndị Chineke kere. (Abụ Ọma 78:3, 4) Nwa unu na-eto, ọ ga-ahụ na unu hụrụ Jehova n’anya, yanwa ga-ahụkwa Jehova n’anya.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Rịọ Chineke ka o nyere unu aka ịzụ nwa unu

  • Na-agwa ya ihe gbasara Chineke mgbe niile ka o nwee ike isi na nwata mara Chineke