Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU NKE 2

Agbala n’Èzí

Agbala n’Èzí

“Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Mak 10:9

Jehova gwara ndị lụrụ di na nwunye na ha ekwesịghị ịghọ ibe ha aghụghọ. (Malakaị 2:16) Ihe a Chineke kwuru bara uru n’ihi na di na nwunye agaghị atụkwasị ibe ha obi ma ọ bụrụ na otu n’ime ha na-agba n’èzí. Oleekwanụ otú ha ga-esi ahụ ibe ha n’anya ma ọ bụrụ na ha atụkwasịghị ibe ha obi?

Taa, ọtụtụ ndị di na nwunye na-agba n’èzí. E nwere ihe abụọ i kwesịrị ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghara ịbanye ná nsogbu a.

1 EJILA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ EGWU EGWU

IHE BAỊBỤL KWURU: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Ezinụlọ gị so n’ihe ndị kwesịrị ịdị gị mkpa ná ndụ. Di na nwunye kwesịrị iji ibe ha kpọrọ ihe.

Jehova achọghị ka obi gị dị n’ebe nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ nọ. Ọ chọkwara ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ‘na-ekpori ndụ.’ (Ekliziastis 9:9) Ọ chọghị ka ị na-eleghara onye ị lụrụ anya, kama ka ị gbalịa na-eme ya obi ụtọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Na-eme ihe ga-egosi di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya nakwa na i jighị ya egwu egwu.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji na-anọrị, na-egenụ ibe unu ntị

  • Echezila banyere naanị onwe gị, kama, na-eche banyere di gị ma ọ bụ nwunye gị

2 CHEBE OBI GỊ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:28) Ọ bụrụ na ihe di ma ọ bụ nwunye na-eche mgbe niile bụ ihe rụrụ arụ, e nwere ike ikwu na ọ na-agba n’èzí.

Jehova kwuru na anyị kwesịrị ‘ichebe obi anyị.’ (Ilu 4:23; Jeremaya 17:9) Ihe ọ pụtara bụ na i kwesịghị ịna-ele ihe na-adịghị mma anya. (Matiu 5:29, 30) Ọ ga-adị mma ka i mee ka Job. Ọ sịrị na ya na anya ya gbara ndụ na ya agaghị ele nwaanyị ọzọ anya, agụụ ya ewee gụọ ya. (Job 31:1) Kpebie na ị gaghị ele ndị gba ọtọ. Kpebiekwa na ị ga-ezere ihe ọ bụla ga-eme ka obi gị dịwa n’ebe onye ọzọ na-abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Mee ka ndị mmadụ mara na ị hụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya

  • Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị ekwuo na otú i si aga nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ nso adịghị ya mma, gee ya ntị