Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Filipaị 2:1-30

  • Ndị Kraịst kwesịrị ịdị umeala n’obi (1-4)

  • E bugoro Kraịst n’okwá maka na ọ dị umeala n’obi (5-11)

  • Na-emenụ ihe ga-eme ka a zọpụta unu (12-18)

    • Unu na-enwu ka ìhè (15)

  • Pọl ga-ezite Timoti na Epafrọdaịtọs (19-30)

2  Ọ bụrụ na e nwere agbamume ọ bụla unu ga-enye maka na unu na Kraịst dị n’otu, ọ bụrụ na e nwere okwu nkasi obi ọ bụla ịhụnanya ga-eme ka unu kwuo, ọ bụrụ na unu na-eche banyere ibe unu, ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya ma na-emetere ibe unu ebere,*  na-emenụ ihe ndị a ka m nwekwuo ọṅụ. M ga-enwekwu ọṅụ ma unu na-enwe otu obi na otu ịhụnanya, na-adị n’otu ma na-enwe otu echiche.+  Unu esela okwu+ n’ihe ọ bụla unu na-eme ma ọ bụ kwe ka onwe unu na-ebu unu isi,+ kama dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.+  Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma,+ kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.+  Na-echenụ echiche otú a ka Kraịst Jizọs.+  N’agbanyeghị na ọ dịbu ka Chineke,+ o cheghị echiche ka o weghara ọkwá Chineke, ya bụ, ka ya na Chineke hara.+  Mba, kama ọ hapụrụ ihe niile ọ bụ ma dịrị ka ohu,+ wee bụrụ mmadụ.*+  Mgbe ọ ghọrọ mmadụ, o weturu onwe ya ala ma rube isi ruo ọnwụ,+ ya bụ, ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ.*+  Ọ bụ ya mere Chineke ji bugoo ya n’ọkwá ka elu,+ jirikwa obiọma nye ya aha karịrị aha ọ bụla ọzọ,+ 10  ka ikpere niile wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’ụwa ma nke ndị nọ n’ime ala,*+ 11  ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị,+ ka e wee nye Chineke Nna otuto. 12  Ndị m hụrụ n’anya, unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ ya, ma karịchaa ugbu a m na-anọghị ya. N’ihi ya, jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-eme ka a zọpụta unu. 13  N’ihi na ọ bụ Chineke na-enye unu ume maka na ọ dị ya ezigbo mma ime otú ahụ. Ọ na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya. 14  Unu atamula ntamu+ ma ọ bụ na-arụrịta ụka+ n’ihe ọ bụla unu na-eme, 15  ka unu wee bụrụ ndị a na-anaghị ata ụta na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ Chineke+ ndị na-emerụghị onwe ha n’ọgbọ a jọgburu onwe ya, nke rụkwara arụ.+ Ma unu na-enwu ka ìhè n’etiti ha n’ụwa a,+ 16  unu na-ejisikwa okwu na-enye ndụ aka ike.+ N’ihi ya, m ga-enwe ihe mere m ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ụbọchị Kraịst, ebe m ma na agbaghị m ọsọ n’efu ma ọ bụ rụsie ọrụ ike n’efu. 17  Ma, ọ bụrụgodị na a na-awụsa m ka àjà mmanya+ n’elu àjà unu na-achụ+ nakwa n’ozi dị nsọ* nke okwukwe mere ka unu na-eje, obi dị m ụtọ, esokwa m unu niile na-aṅụrị ọṅụ. 18  Na-enwekwanụ obi ụtọ otú m na-enwe, sorokwanụ m na-aṅụrị ọṅụ. 19  Enwere m olileanya na m ga-ezitere unu Timoti+ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị Jizọs, ka e wee gbaa m ume mgbe m ga-anụ gbasara unu. 20  N’ihi na enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya. 21  N’ihi na ndị ọzọ niile na-achọ ihe ga-adị ha mma, ọ bụghị ihe ga-adị Jizọs Kraịst mma. 22  Ma unu ma na o gosiri ụdị onye ọ bụ, na dị ka nwata+ ya na nna ya nọ, o so m gbasie mbọ ike n’ikwusakwuru ndị ọzọ ozi ọma. 23  N’ihi ya, ọ bụ ya ka m nwere olileanya izitere unu ozugbo m hụrụ otú ihe si dịrị m. 24  N’eziokwu, obi siri m ike na m ga-abịakwa n’oge na-adịghị anya+ ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị. 25  Ma ka ọ dị ugbu a, echere m na m kwesịrị izitere unu Epafrọdaịtọs, nwanna m na onye ọrụ ibe m na onye agha ibe m, nakwa onye ozi unu zitere ka o gbooro m mkpa m,+ 26  ebe ọ bụ na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ unu niile, ebe ọ bụkwa na o wutere ya na unu nụrụ na ọ rịara ọrịa. 27  N’eziokwu, ọ rịara ọrịa nke na ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ; ma Chineke meere ya ebere. N’eziokwu, ọ bụghị naanị yanwa ka o meere ebere, o mekwaara mụnwa ebere, ka m wee ghara iruwe uju ọzọ n’elu nke m na-eru. 28  N’ihi ya, m na-ezite ya ngwa ngwa, ka unu wee ṅụrịa ọṅụ ọzọ mgbe unu ga-ahụ ya, mụnwa akwụsịtụkwa ichegbu onwe m. 29  N’ihi ya, nabatanụ ya otú unu si anabata ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, jirikwanụ ụdị ndị a kpọrọ ihe,+ 30  n’ihi na ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ n’ihi ọrụ Kraịst,* o mekwara ihe gaara ata isi ya,* ka o wee jeere m ozi unu gaara ejere m ma a sị na unu nọ n’ebe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-enwere ibe unu ọmịiko.”
Na Grik, “dịrị n’ụdị ụmụ mmadụ.”
Ya bụ, ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ.
Ma ọ bụ “ozi a na-ejere ọhaneze.”
O nwere ike ịbụ, “ọrụ Onyenwe anyị.”
Ma ọ bụ “o tinyekwara mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ.”