Abụ Ọma 19:1-14
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
19 Eluigwe na-akọsa ebube Chineke.+
Mbara igwe na-akọsa ọrụ aka ya.+
2 Kwa ụbọchị, okwu ha na-asọpụta ka mmiri,Kwa abalị, ha na-egosi na ị ma ihe.
3 Ha anaghị ekwu okwu. E nweghị ihe ọ bụla ha na-ekwu.
A naghị anụ olu ha.
4 Ma ụda ha* eruola n’ụwa niile,Ozi ha rukwara n’ebe niile mmadụ bi n’ụwa.*+
Chineke amaarala anyanwụ ụlọikwuu n’eluigwe.
5 O yiri nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ nke si n’ụlọ ya na-apụta.
Ọ na-aṅụrị ọṅụ ka dike nke ji ọṅụ na-agba ọsọ.
6 Ọ na-esi n’otu nsọtụ eluigwe apụtaGaa gburugburu ruo na nsọtụ nke ọzọ.+
E nweghịkwa ebe okpomọkụ ya na-anaghị eru.
7 Iwu Jehova zuru okè.+ Ọ na-eme ka mmadụ nweghachi ume.*+
Ihe Jehova na-echetara ndị ya bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ Ọ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.+
8 Ntụziaka Jehova ziri ezi. Ọ na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ.+
Ihe Jehova nyere n’iwu enweghị ntụpọ. Ọ na-eme ka anya na-enwu gbaa.+
9 Ịtụ egwu Jehova dị mma.+ Ọ na-adịru mgbe ebighị ebi.
Ihe Jehova kpebiri bụ eziokwu. Ha niile ziri ezi.+
10 Ha bara ezigbo uru karịa ọlaedo,Karịa ezigbo ọlaedo,*+Ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,+ mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-agụpụtasị.
11 E jirila ha dọọ ohu gị aka ná ntị.+
Onye na-edebe ha na-enweta ụgwọ ọrụ buru ibu.+
12 Ònye ga-amatali na ya emejọọla ihe?+
Gbaghara m mmehie niile m na-amaghị na m mere.
13 Ekwela ka ohu gị dị mpako.+
Ekwela ka mpako na-achị m.+
Mgbe ahụ, m ga-abụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+Agaghịkwa m eme mmehie dị oké njọ.
14 Biko, Jehova, Oké Nkume m+ na Onye Mgbapụta m,+Ka ihe m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe dị gị mma.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “eriri ha ji atụ̀ ihe.”
^ Ma ọ bụ “n’ala.”
^ Ma ọ bụ “na-eweghachi mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”