Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Mụ na Ezinụlọ M Aka Ịna-ebi n’Udo?

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Mụ na Ezinụlọ M Aka Ịna-ebi n’Udo?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee. Ọ ga-enyeliri unu aka. Lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nke nyeerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịna-ebi n’udo n’ezinụlọ ha:

  1.   Lụọnụ otú iwu kwuru. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị alụọ dị ka iwu si kwuo, ha abụọ amarakwa na ha abụrụla otu ná ndụ ha niile, ọ ga-eme ka ha na-ebi n’udo.​—Matiu 19:4-6.

  2.   Hụnụ ibe unu n’anya, na-akwanyekwaranụ ibe unu ùgwù. Otu ụzọ unu ga-esi eme ya bụ ịna-emeso ibe unu otú unu ga-achọ ka e si mesoo unu.​—Matiu 7:12; Ndị Efesọs 5:25, 33.

  3.   Unu agwakwala ibe unu okwu ọjọọ. Medaa obi na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu, ọ bụrụgodị na ihe o kwuru ma ọ bụ ihe o mere kpasuru gị iwe. (Ndị Efesọs 4:31, 32) N’Ilu 15:1, Baịbụl sịrị na “azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”

  4.   Unu agbakwala n’èzí. Achụkwala nwoke ma ọ bụ nwaanyị. (Matiu 5:28) Baịbụl sịrị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ.”​—Ndị Hibru 13:4.

  5.   Jirinụ ịhụnanya na-azụ ụmụ unu. Unu adịla na-agbachi ụmụ unu nkịtị ma ha mee ihe ọjọọ. Ma, unu ejikwala aka ike na-azụ ha.​—Ilu 29:15; Ndị Kọlọsi 3:21.