Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Ime M Baptizim?

È Kwesịrị Ime M Baptizim?

ISI NKE 37

È Kwesịrị Ime M Baptizim?

Kanye akara n’eziokwu ma ọ bụ n’ụgha n’okwu ndị a:

Ọ bụ iwu na a ga-eme Ndị Kraịst baptizim.

□ Eziokwu

□ Ụgha

Ihe a ga-ekwo eme gị baptizim bụ ka ị ghara ime mmehie.

□ Eziokwu

□ Ụgha

Baptizim so n’ihe ga-eme ka a zọpụta gị.

□ Eziokwu

□ Ụgha

Ọ bụrụ na e meghị gị baptizim, ị gaghị aza Chineke ajụjụ maka omume gị.

□ Eziokwu

□ Ụgha

Ọ bụrụ na a na-eme ndị enyi gị baptizim, ọ pụtara na i ruola ka e mee gị baptizim.

□ Eziokwu

□ Ụgha

Ọ BỤRỤ na ị na-eme ihe Chineke kwuru, ọ bụrụkwa na i meela ka gị na ya bụrụ enyi, gị ana-akọkwara ndị ọzọ ihe i kweere, i kwesịrị ichewe echiche ime baptizim. Ma olee otú ị ga-esi mata ma ì jikerela ka e mee gị baptizim? Ka i nwee ike ịza ajụjụ ahụ, ka anyị leba anya n’okwu ndị ahụ a gwara gị kanye eziokwu ma ọ bụ ụgha na ha.

Ọ bụ iwu na a ga-eme Ndị Kraịst baptizim.

Eziokwu. Jizọs nyere iwu ka e mee ndị na-eso ụzọ ya baptizim. (Matiu 28:19, 20) N’eziokwu, Jizọs ji aka ya gaa ka e mee ya baptizim. Ọ bụrụ na ị chọrọ iso Kraịst, mgbe e kwesịrị ime gị baptizim bụ mgbe i toruru ikpebi ka e mee gị ya nakwa mgbe o si gị n’obi.

Ihe a ga-ekwo eme gị baptizim bụ ka ị ghara ime mmehie.

Ụgha. Baptizim bụ ihe ị ga-eji agwa ọhaneze na ị rarala onwe gị nye Jehova. Ihe mere ị ga-eji rara onwe gị nye Jehova abụghị ka ị ghara ime ihe ị chọrọ ime na nzuzo, kama ọ bụ n’ihi na ị chọrọ ime ihe o kwuru.

Baptizim so n’ihe ga-eme ka a zọpụta gị.

Eziokwu. Baịbụl kwuru na baptizim dị mkpa maka nzọpụta. (1 Pita 3:21) Ma, ọ pụtaghị na baptizim bụ ụgwọ ị na-akwụ ụlọ ọrụ ịnshọransị maka ndụ gị, a dịghị ama ama ọdachi emee. Ihe mere a ga-eji eme gị baptizim bụ na ị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa iji obi gị niile na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mak 12:29, 30.

Ọ bụrụ na e meghị gị baptizim, ị gaghị aza Chineke ajụjụ maka omume gị.

Ụgha. Jems 4:17 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ maara otú ọ ga-esi mee ihe ziri ezi ma o meghị ya, ọ bụụrụ ya mmehie”—ma è mere ya baptizim ma ọ bụ na e meghị ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị ma ihe ziri ezi, toruokwa ịma ihe ị ga-eji ndụ gị eme, gị na papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ Onye Kraịst ọzọ tozuru okè nwere ike ikwurịta okwu banyere ime baptizim. I mee otú ahụ, ị ga-amụta ihe ị ga-eme ka e mee gị baptizim.

Ọ bụrụ na a na-eme ndị enyi gị baptizim, ọ pụtara na i ruola ka e mee gị baptizim.

Ụgha. I kwesịrị isi n’ala ala obi gị kpebie ka e mee gị baptizim. (Abụ Ọma 110:3) Naanị mgbe e kwesịrị ime gị baptizim bụ mgbe ị ghọtara ihe a chọrọ ka Onyeàmà Jehova na-eme, na mgbe ị ma na ị dịla njikere ime ya.—Ekliziastis 5:4, 5.

Baptizim Ga-agbanwe Ndụ Gị

Ime baptizim ga-eme ka ị gbanwee ndụ gị, meekwa ka i nweta ọtụtụ ngọzi. Ma, ọ bụ nnukwu ọrụ, ya bụ, ime ihe ị gwara Jehova mgbe ahụ ị na-arara onwe gị nye ya.

Ị̀ chọrọ ịrara onwe gị nye Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị inwe obi ụtọ. Ị ga-enweta ihe ùgwù na-enweghị atụ, nke bụ́ iji obi gị dum na-ejere Jehova ozi nakwa ibi ndụ gosiri na ị rarala onwe gị nye ya n’ezie.—Matiu 22:36, 37.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Mụta otú ị ga-esi esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ga-eme ka i jiri ndụ gị mee ihe bara uru.

AMAOKWU BAỊBỤL

Nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.Ndị Rom 12:1.

NDỤMỌDỤ

Gwa papa gị na mama gị ka ha nyere gị aka chọta onye ga-enyere gị aka inwe ọganihu ka e mee gị baptizim.—Ọrụ 16:1-3.

Ị̀ MA NA . . . ?

Baptizim a ga-eme gị so ‘n’akara’ dị mkpa ga-eme ka a zọpụta gị.—Ezikiel 9:4-6.

IHE M GA-EME!

Ka m ruo eru ịbụ onye e mere baptizim, m kwesịrị ịghọtakwu ihe ndị a Baịbụl kụziri: ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere baptizim ji dị ezigbo mkpa?

● Gịnị nwere ike ime ka e mee nwatakịrị baptizim oké ngwa ngwa?

● Gịnị nwere ike ime ka nwatakịrị jụ ịrara onwe ya nye Chineke, ka e mee ya baptizim?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 306]

“Ọ na-abụ, m cheta na e meela m baptizim, ya enyere m aka ime mkpebi ziri ezi na izere ihe ọ ga-abụ m mechaa, mụ abanye ná nsogbu.”—Holly

[Igbe na Foto dị na peeji nke 307]

Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Banyere Baptizim

Gịnị ka baptizim pụtara? Imikpu gị na mmiri pụtara na ndụ ochie gị anwụọla. Isi na mmiri kulite gị pụtara na ị dịla ndụ ugbu a ime uche Jehova.

Gịnị ka ịrara ndụ gị nye Jehova pụtara? Ọ pụtara ịjụ onwe gị, ikwe Chineke nkwa na uche ya bụ ihe mbụ ị ga na-eme ná ndụ. (Matiu 16:24) Tupu e mee gị baptizim, i kwesịrị ibu ụzọ rara onwe gị nye Chineke site n’ekpere.

Gịnị ka i kwesịrị iji ndụ gị na-eme tupu e mee gị baptizim? I kwesịrị ịna-eme ihe Okwu Chineke kwuru, ma na-agwa ndị ọzọ ihe i kweere. I kwesịrị ịna-ekpeku Chineke ekpere ma na-amụ Okwu ya, meekwa ka gị na ya bụrụ enyi. I kwesịrị ịna-ejere Jehova ozi n’ihi na ọ bụ ihe kpebiri ime, ọ bụghị n’ihi na ndị ọzọ na-enye gị nsogbu ka i mee otú ahụ.

È nwere afọ ole mmadụ kwesịrị ịdị tupu e mee ya baptizim? Ihe dị mkpa abụghị afọ ole mmadụ dị. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị itoru etoru, matakwa ihe a na-ekwu, ka i nwee ike ịghọta ihe nraranye pụtara.

Ọ́ bụrụkwanụ na ị chọrọ ka e mee gị baptizim ma papa gị na mama gị agwa gị cheretụ? Ma eleghị anya, ha chọrọ ka ị ghọtakwuo otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-ebi ndụ. Elegharala okwu ha anya. Jiri oge ahụ mee ka enyi gị na Jehova bụ sikwuo ike.—1 Samuel 2:26.

Igbe dị na peeji nke 308 na 309]

Ebe M Dere Ihe

Ị̀ Na-eche Echiche Ka E Mee Gị Baptizim?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ma ì ruola ka e mee gị baptizim, tụlee ajụjụ ndị a na ihe ndị a e kwuru n’okpuru ebe a. Tupu i dee azịza gị, buru ụzọ gụọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara.

Olee ụzọ ndị i si egosi ugbu a na ị tụkwasịrị Jehova obi?Abụ Ọma 71:5. ․․․․․

Olee otú i sirila gosi na ị zụọla ikike nghọta gị ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi?Ndị Hibru 5:14. ․․․․․

Ugboro ole ka ị na-ekpe ekpere? ․․․․․

Ị̀ na-akpọ okwu aha mgbe ị na-ekpe ekpere? Gịnị ka ekpere gị na-egosi banyere ịhụnanya ị hụrụ Jehova?Abụ Ọma 17:6. ․․․․․

N’ebe a, dee ihe mgbaru ọsọ ị chọrọ isetịpụ n’ihe banyere ekpere. ․․․․․

Ị̀ na-amụchi Baịbụl anya?—Jọshụa 1:8. ․․․․․

Gịnị ka ị na-amụ mgbe ị na-amụ ihe? ․․․․․

N’ebe a, dee ihe mgbaru ọsọ ị chọrọ isetịpụ n’ihe banyere ọmụmụ Baịbụl gị. ․․․․․

Ị̀ na-arụpụta ihe n’ozi gị? (Ihe atụ: Ì nwere ike ịkọwara ndị ọzọ ozizi ndị bụ́ isi na Baịbụl? Ị̀ na-aga eletaghachi ndị nwere mmasị? Ị̀ na-agbalị ka i duzie ọmụmụ Baịbụl n’ụlọ ndị mmadụ?)

□ Ee □ Ee e

Ị̀ na-aga ozi ọma ọ bụrụgodị na papa gị na mama gị agaghị?Ọrụ 5:42.

□ Ee □ Ee e

N’ebe a, dee ihe mgbaru ọsọ ị chọrọ isetịpụ n’ihe banyere ozi ọma.2 Timoti 2:15. ․․․․․

Ị̀ na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya, ka ị̀ na-aga mgbe ọ dabara?Ndị Hibru 10:25. ․․․․․

Olee ụzọ ndị ị na-esi ekere òkè n’ọmụmụ ihe? ․․․․․

Ị̀ na-aga ọmụmụ ihe mgbe papa gị na mama gị na-agaghị (ma ha kwe gị gaa)?

□ Ee □ Ee e

Ì nwere ike ikwu n’ezie na ime uche Chineke na-atọ gị ụtọ? Abụ Ọma 40:8.

□ Ee □ Ee e

Ì nwere ike inye ihe atụ ụfọdụ mgbe ị jụrụ ime ihe ụmụaka ibe gị chọrọ ka i mee?Ndị Rom 12:2. ․․․․․

Gịnị ka ị chọrọ ime ka ịhụnanya ị hụrụ Jehova sikwuo ike?Jud 20, 21. ․․․․․

Ị̀ ga na-efe Jehova ọ bụrụgodị na papa gị na mama gị nakwa ndị enyi gị akwụsị ife ya?Matiu 10:36, 37.

□ Ee □ Ee e

[Foto dị na peeji nke 310]

Dị ka alụmdi na nwunye, baptizim na-agbanwe ndụ mmadụ—e kwesịghị iji ya gwurie egwu