Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Pọl

Onye M Ga-eṅomi—Pọl

Onye M Ga-eṅomi—Pọl

Pọl onyeozi maara otú obi na-adị ya. O kwuru eziokwu, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” Pọl chọrọ ime ihe ziri ezi. O dere, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị.” Gịnịzi bụ nsogbu Pọl? O kwuru, sị: “Ana m ahụ . . . iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” Ọ naghị atọ Pọl ụtọ na ya anaghị emecha nke ọma. Ọ kwara arịrị, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya!”—Ndị Rom 7:21-24.

Ihe i mejọrọ ọ̀ na-eme ka ị na-ahụsi anya? Ya bụrụ otú ahụ, cheta na ọ na-adị Pọl otú ahụ mgbe ụfọdụ. Ma Pọl makwa na Kraịst nwụrụ maka ndị dị ka ya. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Ndị Rom 7:25) Pọl weere ihe mgbapụta ahụ dị ka onyinye e nyere ya. O dere, sị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Ndị Galeshia 2:20) Mgbe obi dara gị mbà, tụgharịa uche n’àjà mgbapụta ahụ. Ọ bụrụkwa na ihe ndị ị mejọrọ na-eme ka ị na-ada mbà, echefula na Kraịst nwụrụ maka ndị mmehie, ọ bụghị maka ndị zuru okè.