Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Josef

Onye M Ga-eṅomi—Josef

Onye M Ga-eṅomi—Josef

Josef nọ n’ọnọdụ tara akpụ. Nwunye nna ya ukwu nyere ya nsogbu ọtụtụ ugboro ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ugbu a, nwaanyị ahụ abịakwala ọzọ! Ma ọ nwataghị Josef. N’ezie, Josef amaghị ọnụ jijiji. Ọ gwara ya, sị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” Mgbe nwaanyị ahụ siri ọnwụ, ọbụna jide Josef, ihere emeghị Josef ịgba ọsọ. N’ezie, o si n’ụlọ ahụ gbapụ! Josef gosiri na ya na-akpa ezi àgwà.Jenesis 39:7-12.

Mmadụ nwekwara ike ịgwa gị ka gị na ya nwee mmekọahụ mgbe agụụ mmekọahụ na-agụ gị. Ihe ga-enyere gị aka ịjụ abụghị naanị ijide onwe gị. Kama ọ bụ ịchọ ime ihe ga-adị Onye kere gị, bụ́ Jehova Chineke, mma. Leenụ, agụụ mmekọahụ gụrụ Josef, otú ahụ ọ na-agụkwa gị. Ma, o chetụdịghị echiche ime ihe ahụ na-agụ ya n’ụzọ ga-akpasu Onye kere ya iwe. N’otu aka ahụ, o kwesịrị ido gị anya na omume rụrụ arụ na-ewe Chineke iwe, na-akpatakwa obi mgbawa n’ikpeazụ. N’ihi ya, gbalịsie ike ịmụta omume ọma ma na-eme ya dị ka Josef.