Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Lidia

Onye M Ga-eṅomi—Lidia

Onye M Ga-eṅomi—Lidia

N’agbanyeghị na Lidia ka malitere iso ụzọ Jizọs amalite, o lere Pọl na ndị ha na ya so ọbịa n’echeghị ka a gwa ya agwa. (Ọrụ 16:14, 15) N’ihi ya, ya na ha kpakọrịtara. Nke ahụ bụ ezigbo ihe ùgwù. Mgbe a tọpụrụ Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ, olee ebe ha gara? Ha laghachiri n’ụlọ Lidia n’egbughị oge!—Ọrụ 16:40.

Ì nwere ike ime ihe ahụ Lidia mere, ya bụ, imeta ndị ọzọ enyi? Olee otú ị ga-esi eme ya? Malite nwayọọ nwayọọ. Gbalịa jiri otu onye malite. I nwere ike ime ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị na gị na otu onye ga-ekwurịta okwu mgbe ọ bụla ị gara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Gbalịa mụmụọ ọnụ ọchị. Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekwu, jụọ onye ahụ ajụjụ ma ọ bụ kọọrọ ya banyere onwe gị. Gee onye ahụ ntị nke ọma. Ka oge na-aga, ahụ́ ga-eru gị ala ikwu ihe ndị ọzọ. Okwu ọma si n’obi na-atọkarị ndị mmadụ ụtọ. (Ilu 16:24) Lidia nwetara ezigbo ndị enyi n’ihi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-ele ọbịa. Ọ bụrụ na i ṅomie ya, ị ga-enwetakwa ezigbo ndị enyi!