Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru 10:1-39

  • Ọbara anụmanụ enweghị ike iwepụ mmehie (1-4)

    • E nwere ihe Iwu ahụ nọchiri anya ya (1)

  • Kraịst chụrụ àjà naanị otu ugboro (5-18)

  • Ụzọ ọhụrụ nke na-eduba ná ndụ (19-25)

    • Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị (24, 25)

  • Anyị ekwesịghị ịkpachara anya na-eme mmehie (26-31)

  • Obi ike na okwukwe ga-eme ka anyị tachie obi (32-39)

10  Iwu ahụ* nọchiri anya+ ihe ọma ndị na-abịa abịa,+ ma ọ bụghị ya bụ ihe ọma ndị ahụ. N’ihi ya, o nweghị* ike iji àjà ndị a na-achụ mgbe niile kwa afọ mee ka ndị na-abịakwute Chineke zuo okè.+  A sị na o nwere ike ime ka ha zuo okè, ọ̀ bụ na a garaghị akwụsị ịchụ àjà ndị ahụ maka na obi agaghịzi na-ama ndị na-efe Chineke ikpe ma e mehaala ka ha dị ọcha otu ugboro?  Ma àjà ndị ahụ na-echetara ndị mmadụ kwa afọ+ na ha bụ ndị mmehie,  n’ihi na ọbara oké ehi na ọbara ewu enweghị ike iwepụ mmehie.  N’ihi ya, mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ sịrị: “‘Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, kama ị kwadebeere m ahụ́.  I nweghị mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie.’+  M wee sị: ‘Lee, abịala m ime uche gị, Chineke+ (e dere banyere m n’akwụkwọ mpịakọta).’”  Mgbe o kwuchara, sị: “Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, i nweghịkwa mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie,” ya bụ, àjà ndị Iwu* kwuru ka a na-achụ,  o kwuziri, sị: “Lee, abịala m ime uche gị.”+ O wepụrụ ihe nke mbụ ka o wee webata nke abụọ. 10  Ọ bụ “uche”+ Chineke a mere e ji jiri àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro mee ka anyị dị nsọ.+ 11  Onye nchụàjà ọ bụla na-eguzo kwa ụbọchị na-eje ozi dị nsọ*+ ma na-achụ otu ụdị àjà ugboro ugboro,+ bụ́ àjà ndị na-enweghị ike iwepụcha mmehie.+ 12  Ma nwoke a chụrụ otu àjà maka mmehie, bụ́ àjà ga-adịru mgbe niile, nọrọzie ala n’aka nri Chineke.+ 13  Malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-eche ruo mgbe a ga-eme ka ndị iro ya bụrụ ihe o ji agbakwasị ụkwụ.+ 14  N’ihi na ọ bụ otu àjà ọ chụrụ ka o ji mee ka ndị a na-edo nsọ zuo okè+ mgbe niile. 15  Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị àmà na ọ bụ eziokwu, n’ihi na mgbe o kwuchara, sị: 16  “‘Ihe a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ahụ gachara,’ ka Jehova* kwuru. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’obi ha,’”+ 17  o kwuziri, sị: “Agaghịzi m echeta mmehie ha na omume ọjọọ ha.”+ 18  Ebe ọ bụ na a gbagharala ha mmehie ha, e nweghịzi àjà a ga-achụ maka mmehie. 19  Ụmụnna m, ebe ọ bụ na ọbara Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike isi n’ụzọ e si abanye n’ebe nsọ*+ ahụ na-abanye, 20  bụ́ ụzọ ọhụrụ o megheere anyị nke na-eduba ná ndụ, nke e si n’ákwà mgbochi ahụ abanye,+ ya bụ, ahụ́ ya, 21  ebe ọ bụkwa na anyị nwere onye nchụàjà ukwu na-elekọta ụlọ Chineke,+ 22  ka anyị jiri ezi obi na-abịa Chineke nso ma nwee okwukwe siri ezigbo ike, ebe ọ bụ na e meela ka obi anyị dị ọcha ka anyị ghara inwe akọnuche ọjọọ,+ e jirikwa mmiri dị ọcha sachaa ahụ́ anyị.+ 23  Ka anyị nọgidesie ike na-ekwupụta olileanya anyị n’ihu ọha n’amaghị jijiji,+ n’ihi na onye kwere anyị nkwa kwesịrị ka a tụkwasị ya obi. 24  Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ.+ 25  Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị+ otú ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume+ ma na-emekwu ihe ndị a ebe anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.+ 26  N’ihi na ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme mmehie mgbe anyị matachara eziokwu nke ọma,+ e nweghịzi àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie anyị,+ 27  kama ihe ga-echere anyị bụ ikpe dị egwu na iwe Chineke na-enwu ka ọkụ nke ga-erepịa ndị na-emegide ya.+ 28  Onye ọ bụla dara Iwu Mosis, a na-egbu ya n’emetereghị ya ebere* ma mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbaa akaebe na o mere otú ahụ.+ 29  Ọ̀ bụ na unu echeghị na ahụhụ a ga-ata onye zọrọ Ọkpara Chineke ụkwụ ga-aka njọ, bụ́ onye na-ejighị ọbara ọgbụgba ndụ+ e ji doo ya nsọ kpọrọ ihe, onye ledakwara mmụọ nke amara Chineke anya ma mejọọ ya?+ 30  N’ihi na anyị ma Onye kwuru, sị: “Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.” E dekwara, sị: “Jehova* ga-ekpe ndị ya ikpe.”+ 31  Mmadụ daba n’aka Chineke dị ndụ, nke ya agwụla. 32  Ma, na-echetanụ ụbọchị ndị gara aga, bụ́ mgbe e mechara ka unu hụ ìhè.+ N’oge ahụ, unu tachiri obi mgbe unu nọ na-atagbu onwe unu n’ahụhụ. 33  N’oge ụfọdụ, a kparịrị unu n’ihu ọha* ma kpagbuo unu. N’oge ụfọdụkwa, unu so ndị e mere ụdị ihe ndị a taa ahụhụ.* 34  N’ihi na unu meteere ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ebere, unu akwụsịghịkwa inwe ọṅụ mgbe e bukọọrọ ihe unu,+ ebe unu ma na unu nwere ihe ka mma, nke na-adịgide adịgide.+ 35  N’ihi ya, unu akwụsịla inwe obi ike,* ebe ọ bụ na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.+ 36  N’ihi na unu kwesịrị ịtachi obi,+ ka unu wee nweta ihe Chineke kwere ná nkwa mgbe unu mechara uche ya. 37  N’ihi na ọ ka fọrọ “obere oge,”+ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarute, ọ gaghịkwa egbu oge.’+ 38  “Ma onye nke m nke na-eme ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe,”+ ‘ọ bụrụkwa na o si n’ebe m nọ laa azụ, ihe ya agaghị amasị m.’*+ 39  Ma anyị abụghị ụdị ndị na-ala azụ ka e wee bibie anyị,+ kama anyị bụ ndị nwere okwukwe ka e wee chebe ndụ* anyị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ndị mmadụ enweghị.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “na-ejere ọhaneze ozi.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’Ebe Kacha Nsọ.”
Ma ọ bụ “n’enwereghị ya ọmịiko.”
Gụọ A5.
Na Grik, “a kpọpụtara unu n’ọgbọ egwuregwu.”
Ma ọ bụ “unu kwụ ndị e mere ụdị ihe ndị a n’akụkụ.”
Na Grik, “ikwu okwu n’atụghị ụjọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”