Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Mgbe Mmadụ Abụọ Chọrọ Ịlụ Gbasara

Mgbe Mmadụ Abụọ Chọrọ Ịlụ Gbasara

IHE MERE O JI ESI IKE ODIDI

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Amaka * kwuru, sị: “Echere m na ahụla m onye ga-alụ m. Agwara m onwe m na ọ bụ nwoke a ka mụ na ya ga-ebi. Ma mgbe anyị kpara ọnwa abụọ, agwara m ya na achọghịzi m ka e nwee ihe jikọrọ mụ na ya. Onye gwa m na ọ bụ otú a ka anyị ga-esi tisaa, agaghị m ekweta.”

Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Ebere kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe na-amasị m na-amasịkwa onye mụ na ya na-akpa. M chere na o nweghị ihe ga-eme ka anyị ghara ịlụ. Ma ka oge na-aga, achọpụtara m na ihe anaghị adabara anyị abụọ. Ahụkwara m nsogbu m na-aga ịbanye na ya, mụ agwa ya ka anyị kwụsị ịkpa.”

Ọ bụrụ na ụdị ihe ụmụ agbọghọ abụọ a kwuru emetụla gị, isiokwu a ga-enyere gị aka ka i die ya.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Mmadụ abụọ chọrọ ịlụ gbasaa, ọ na-ewute ha abụọ. E nwere otu nwa agbọghọ ya na onye chọrọ ịlụ ya kpara naanị ọnwa isii tupu ha agbasaa. Aha ya bụ Chinyere. O kwuru, sị: “Ahụ́ gwụrụ m n’ihi na ahụrụ m ya n’anya, achọkwara m ka mụ na ya biri. Ma tupu anyị amara ihe na-emenụ, anyị agbasaala. Ọ na-abụ m nụ egwú na-atọ anyị abụọ ụtọ, mụ echeta otú anyị si enwe aṅụrị mgbe ahụ anyị ka na-akpa. M gaa ebe ụfọdụ anyị abụọ na-adị aga mgbe ahụ, ya ana-ewute m na mụ na ya anọghịzi. Ọ bụ otú a ka ọ dị m mgbe ahụ n’agbanyeghị na ọ bụ m gwara ya ka ọ gawara onwe ya.”

Mgbe ụfọdụ, ọ na-aka mma ka a gbasaa n’agbanyeghị na ọ na-agbawa obi. Ebere kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike ịgba nkịtị ka ọ ghara itiwa onye nke ọzọ obi. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ha abụọ anọgide na-akpa n’agbanyeghị na ihe anaghị adabara ha, obi ga-emecha gbawaa ha abụọ.” Chinyere kwukwara otu ihe ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na obi anaghị adị gị mma mgbe gị na mmadụ na-akpa, obi agaghịkwa na-adị gị mma ma ọ bụrụ na unu emechaa lụọ. Ọ bụrụ na unu achọpụta ya n’oge ma gawara onwe unu, ọ ga-akara unu mma.”

Ọ bụrụ na gị na onye ị chọrọ ịlụ agbasaa, ọ pụtaghị na ị bụ ajọ mmadụ. Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ abụọ chọrọ ịlụ ibe ha na-emecha lụọ. Ọ bụrụ na obi esighị gị ma ọ bụ onye gị na ya na-akpa ike na ije unu ga-enwe isi, ịgbasa nwere ike ịkara unu mma. Ọ bụrụkwa na unu emechaa gbasaa, echela na ị bụ ajọ mmadụ. I nwere ike idi ya. Gịnị ga-enyere gị aka?

IHE I NWERE IKE IME

Kweta na ọ gaghị adịrị gị mfe. Ebere kwuru, sị: “Onye mụ na ya kwụsịrị ịkpa abụghị naanị enyi m, ọ bụ ezigbo enyi m.” Ọ bụrụ na mmadụ na onye ọ hụrụ n’anya agbasaa, ọ ga-ewute ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Okoro kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ chọrọ ịlụ agbasaa, ọ ga-ewuterịrị ha n’agbanyeghị na ihe mere ha ji gbasaa bụ ka ihe dị mma.” N’oge Eze Devid nọ ná nsogbu, o dere, sị: ‘N’ogologo abalị dum, m na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.’ (Abụ Ọma 6:6) O nwere ike ịdị anyị otú a ọ dị Eze Devid. Mgbe ụfọdụ, ihe ga-enyere mmadụ aka idi ụdị mgbawa obi ahụ bụ iji nwayọọ na-edi ya. Ihe ga-enyekwaranụ ya aka bụ ịghọta otú obi dị ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Abụ Ọma 4:4.

Mete ndị ga-enyere gị aka enyi. Ịkpa ndị ọzọ nso n’ụdị oge a adịghị mfe. Nwa agbọghọ ahụ aha ya bụ Amaka kwuru, sị: “Mgbe mụ na nwoke ahụ chọburu ịlụ m gbasara, ihe m mere bụ ịnọrọ onwe m. M malitere ịnọ naanị m ka m nwee ike inweta onwe m ma chebara ihe niile merenụ echiche, marakwanụ otú mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ.” Ma, Amaka mechara kpawa ndị enyi ya nso. O kwuru, sị: “Otú m si na-akpa ha nso emeela ka obi na-adị m mma. O meekwala ka mgbasa ahụ anyị gbasara ghara ịna-ewute m otú o sibu ewute m.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 17:17.

Mụta ihe na ya. I nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Ihe a merenụ ọ̀ kụziiri m ebe ụfọdụ m nwere ike ịrụ ọrụ? Ọ bụrụ na o nwere ihe m mụtara, ọ̀ ga-enyere m aka ma mụ na onye ọzọ kpawa?’ Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nnenna kwuru, sị: “Ka oge na-aga, m bịara nwetatụwa onwe m. Ma, o were m oge tupu mụ enwee ike idi ihe niile merenụ.” Okoro kwetakwara ihe a o kwuru. Ọ sịrị: “O were m otu afọ tupu mụ enweta onwe m mgbe mụ na onye m chọrọ ịlụ gbasara. O wekwara m ogologo oge tupu mụ amụta ihe na ya. Ihe mụ na ije jere n’oge ahụ mere ka m ghọtakwuo ụdị mmadụ m bụ, mụ amụtakwuo ọtụtụ ihe gbasara ụmụ nwaanyị nakwa ihe mmadụ kwesịrị ime ma ya na onye ọ chọrọ ịlụ na-akpa. Obi anaghịzi agbawa m otú o si agbawabu m.”

Kọọrọ Jehova otú obi dị gị. Baịbụl kwuru na Chineke ‘na-agwọ ndị e tiwara obi, na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.’ (Abụ Ọma 147:3) Jehova anaghị agwa mmadụ onye ọ ga-alụ, e kwesịghịkwa ịta ya ụta ma mmadụ abụọ chọrọ ịlụ mechaa gbasaa. Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ihe ọ bụla gbasara anyị na-emetụ ya n’obi. Kọọrọ ya ihe ọ bụla na-enye gị nsogbu n’obi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 5:7.

^ para. 4 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.