Ilu 17:1-28

  • Ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma (13)

  • Tupu esemokwu amalite, pụọ (14)

  • Ezigbo enyi hụrụ enyi ya n’anya mgbe niile (17)

  • “Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ” (22)

  • Onye ma ihe anaghị ekwu ọtụtụ okwu (27)

17  Ọ ka mma na mmadụ na-ata ibé achịcha kpọrọ nkụ n’ebe udo dị+Kama ịnọ na-eri oriri n’ụlọ ebe a na-ese okwu.+   Ohu nke na-aghọta ihe ga-achị nwa na-emechu mmadụ ihu. Ohu ahụ ga-eso ụmụ nna ya ukwu keta akụ̀ ka à ga-asị na ọ bụ nwanne ha.   A na-eji ite na ọkụ anụcha ọlaọcha na ọlaedo,+Ma, ọ bụ Jehova na-enyocha obi.+   Onye ọjọọ na-ege okwu ọjọọ,Onye aghụghọ na-egekwa asịrị.+   Onye na-akwa ogbenye emo na-akparị Onye kere ya,+A ga-atakwa onye ọ bụla na-aṅụrị ọṅụ maka ọdachi dakwasịrị onye ọzọ ahụhụ.+   Okpueze ndị agadi bụ ụmụ ụmụ ha,A na-akwanyekwara ụmụ ùgwù n’ihi nna* ha.   A naghị atụ anya na onye nzuzu ga-ekwu okwu dị mma,+Onye ọchịchị* ekwesịghịkwa ịna-agha ụgha.+   Onye na-enye onyinye na-ewere onyinye ya ka nkume dị oké ọnụ.*+ Ebe ọ bụla ọ gara, onyinye ya na-eme ka ihe gaziere ya.+   Onye na-agbaghara* ihe ọjọọ e mere ya na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọn’anya,+Ma onye na-ekwukarị gbasara ihe ọjọọ e mere ya na-ekewa ndị bụ́ ezigbo enyi.+ 10  Mba a baara onye na-aghọta ihe na-abara ya ezigbo uru+Karịa ihe a pịara onye iberiibe ugboro otu narị.+ 11  Onye ọjọọ na-enupụ isi mgbe niile,Ma a ga-eziga onye ozi obi tara mmiri ka ọ taa ya ahụhụ.+ 12  Ọ kaara mmadụ mma na ya na anụ ọhịa bea a napụrụ ụmụ ya zutereKama ọ ga-ezute onye nzuzu mgbe ọ na-eme iberiibe.+ 13  Ọ bụrụ na mmadụ na-eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma,Ihe ọjọọ agaghị apụ apụ n’ụlọ ya.+ 14  Ịmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere idei mmiri ụzọ. Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.+ 15  Jehova kpọrọ onye na-ekwu na ikpe amaghị onye ajọ omume asị,+Kpọọkwa onye na-ekwu na ikpe mara onye ezi omume asị. 16  Ọ bụrụ na onye nzuzu achọghị ịma ihe,È nwere uru ọ bara na ọ ma ihe ọ ga-eme ka ọ mara ihe?+ 17  Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.+ Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.+ 18  Onye na-enweghị uche na-anọ n’ihu onye agbata obi ya kwe nkwa* ma kwetaNa ya ga-ana onye ọzọ n’ibé.+ 19  Onye hụrụ esemokwu n’anya hụrụ mmehie n’anya.+ Onye ọ bụla nke na-eme ka ọnụ ụzọ ụlọ ya dị elu ga-ada.+ 20  Ihe agaghị agaziri onye obi ya jọrọ njọ,*+Onye na-aghọgbu ndị ọzọ ga-alakwa n’iyi. 21  Onye ọ bụla bụ́ nna nwa nzuzu ga na-eru uju. Nna nwa na-enweghị uche anaghịkwa enwe obi ụtọ.+ 22  Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ nke na-agwọ mmadụ ọrịa,+Ma obi ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ mmadụ.*+ 23  Onye ajọ omume ga-anara aka azụ* na nzuzo,Ka o wee mee ka a ghara ikpe ikpe ziri ezi.+ 24  Onye na-aghọta ihe na-agbalịsi ike ka ọ mara ihe,Ma anya onye nzuzu anaghị adị otu ebe.+ 25  Nwa nzuzu na-eme ka nna ya na-eru uju,Ọ na-emekwa ka obi gbawaa nne ya.+ 26  Ịta onye ezi omume ahụhụ* adịghị mma,Ịpịa onye a na-akwanyere ùgwù ihe adịghịkwa mma. 27  Onye ma ihe anaghị ekwu ọtụtụ okwu,+Onye na-aghọta ihe na-anọkwa jụụ.+ 28  A ga-eweredị onye nzuzu nke gbachiri nkịtị ka onye ma ihe,Werekwa onye na-ejide ọnụ ya aka ka onye na-aghọta ihe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị mụrụ.”
Ma ọ bụ “Onye a ma ama.”
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Na Hibru, “na-ekpuchi.”
Na Hibru, “kwee mmadụ n’aka.”
Ma ọ bụ “onye obi ya gbagọrọ agbagọ.”
Ma ọ bụ “na-amịkpọ ọkpụkpụ.”
Ma ọ bụ “ga-eri ngarị.”
Ma ọ bụ “Iri onye ezi omume iwu.”