Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?

Ihe Ndị Na-akpata Nchegbu Juru Ebe Niile

Ihe Ndị Na-akpata Nchegbu Juru Ebe Niile

Otu nwoke aha ya bụ Paul, onye Zimbabwe, kwuru, sị: “Agara m ịzụ ihe oriri otu ụbọchị, naanị ihe m hụrụ bụ biskit. Ọnụ ahịa biskit jikwa okpukpu puku iri rịa elu. N’echi ya, o nweghịzi ndị nwere ihe mmadụ nwere ike ịzụrụ rie.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Janet, onye Amerịka, kwuru, sị: “Di m gwara m otu ụbọchị na ya alụjuola, nakwa na ya ga-ahapụ mụ na ụmụ anyị. Amaghị m otú m ga-esi edi ihe a. Olee otú naanị m ga-esi lekọtawa ụmụ anyị?”

Otu nwaanyị aha ya bụ Alona, onye Izrel, kwuru, sị: “Ọ na-abụ m nụ ụda opi na-egosi na a na-aga ịtụ bọmbụ, mụ agbaba ebe a na-anọ eze mgbọ, makpuru ala ka bọmbụ na-ada. Ihe a niile mechaa, aka ka ga na-ama m jijiji ruo ọtụtụ awa.”

Anyị bi n’oge ọtụtụ ihe na-echegbu ndị mmadụ, ya bụ, “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ụfọdụ ihe na-echegbu ndị mmadụ taa bụ ụkọ ego, nsogbu ezinụlọ, agha, ọrịa ọjọọ, na ọdachi ndị na-emere onwe ha na ndị nke ụmụ mmadụ na-akpata. Ụfọdụ na-echegbukwa onwe ha maka echi. Ha hụ etuto n’ahụ́ ha, ha echewe ma ọ̀ ga-emecha ghọọ ọrịa kansa. Ha nwekwara ike ịna-echegbu onwe ha maka otú ihe ga-adịrị ụmụ ụmụ ha ma ha too.

Iche gbasara ihe ụfọdụ adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, anyị chọọ ịga ka e lee anyị ahụ́, ka a gbaa anyị ajụjụ ọnụ tupu e wee anyị n’ọrụ, ma ọ bụ na-akwado ime ihe ọhaneze ga-ekiri, anyị ga na-eche otú ọ ga-esi gaa. Anyị buru ụzọ chee gbasara ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu, o nwere ike ime ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu. Ma, anyị ga-akpatara onwe anyị ezigbo nsogbu ma anyị na-echegbu onwe anyị. Na nso nso a, e lere ihe karịrị puku mmadụ iri isii na puku asatọ ahụ́ ma chọpụta na ichetụ oké echiche nwere ike ime ka mmadụ nwụchuo ọnwụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jụọ, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” N’eziokwu, nchegbu anaghị agbatịkwu ndụ mmadụ. Ọ bụkwa ya mere Jizọs ji gwa anyị, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Matiu 6:25, 27) Ma, olee otú anyị ga-esi kwụsị ichegbu onwe anyị?

Ihe ga-enyere anyị aka bụ inwe ezi amamihe, inwe okwukwe na Chineke nakwa inwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ bụrụgodị na anyị enweghị nsogbu taa, o nwere ike ịbịara anyị echi. N’ihi ya, ka anyị hụ otú ihe atọ ndị ahụ si nyere Paul, Janet, na Alona aka, ha aghara ịna-echegbu onwe ha.