Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi na-atọ Chineke, “Onye na-anụ ekpere,” ụtọ ịnụ ekpere anyị.​—ABỤ ỌMA 65:2

Na-ekpe Ekpere Ka Chineke Gọzie Gị

Na-ekpe Ekpere Ka Chineke Gọzie Gị

Chineke nyere anyị onyinye pụrụ iche. Onyinye ahụ bụ ịgwa ya otú obi dị anyị n’ekpere. Devid onye amụma kpere ekpere, si: “Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.” (Abụ Ọma 65:2) Ma olee otú anyị ga-esi ekpe ekpere ka Chineke nwee ike ịnụ ekpere anyị, ya agọziekwa anyị?

JIRI NKWANYE ÙGWÙ NA-AGWA CHINEKE OBI GI N’EKPERE

Ikpe ekpere ga-eme ka ị wụpụ obi gị n’ihu Chineke dị ka mmiri, ya bụ, ịgwa Chineke otú obi dị gị. (Abụ Ọma 62:8) Ekpere anyị si n’ala ala obi anyị kpee na-atọ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ụtọ.

NA-AKPỌ CHINEKE AHA YA MGBE Ị NA-EKPE EKPERE

Ọ bụ eziokwu na Chineke nwere ọtụtụ utu aha, ma o nwere naanị otu aha. Chineke kwuru, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa n’Akwụkwọ Nsọ. Ọtụtụ ndị amụma kpọrọ Chineke aha ya mgbe ha na-ekpe ekpere. Ebreham kwuru, sị: “Biko, . . . Jehova . . . ka m gaa n’ihu ikwu okwu.” (Jenesis 18:30) Anyịnwa kwesịkwara ịkpọ Chineke aha ya bụ́ Jehova mgbe anyị na-ekpe ekpere.

JIRI ASỤSỤ NA-ERU GỊ N’OBI NA-EKPE EKPERE

Chineke na-aghọta ihe anyị na-eche n’echiche na otú obi dị anyị n’agbanyeghị asụsụ anyị na-asụ. Okwu ya gwara anyị, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”​—Ọrụ Ndịozi 10:​34, 35.

Ka Chineke nwee ike ịgọzi anyị, ọ bụghị naanị ekpere ka anyị kwesịrị ịna-ekpe. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe anyị kwesịrị ime.