Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe a bụ ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Aịzaya a hụrụ n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Nke dị n’elu bụ akwụkwọ Aịzaya e ji asụsụ arabik a na-ede n’oge a sụgharịa. Okwu Chineke ka dị otú ọ dị, ọ gbanwebeghi

À Gbanweela Ihe Ndị E Dere n’Okwu Chineke?

À Gbanweela Ihe Ndị E Dere n’Okwu Chineke?

Ụfọdụ ndị na-eche ma à gbanweela ihe ndị e dere n’Okwu Chineke. Aịzaya onye amụma kwuru na Okwu Chineke “ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 40:8) Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na a gbanwebeghị ihe ndị e dere n’Okwu Chineke?

Chineke nwere ike ọ ga-eji echebe Okwu ya na ime ka a ghara ịgbanwe ihe na ya. N’oge ochie, mgbe e ji aka na-edepụtaghachi Okwu Chineke, ndị depụtaghachiri ya na-asa anya na mmiri gụọ mkpụrụ okwu niile dị na ya iji hụ na e nweghị ihe e tinyere, gbanwee ma ọ bụ wepụ na ya. Ma ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ ezughị okè, ndị depụtaghachiri Okwu Chineke dehiere obere ihe ụfọdụ na ya.

GỊNỊ GA-EME KA OBI SIE ANYỊ IKE NA AKWỤKWỌ NSỌ E NWERE TAA NA NKE MBỤ BỤ OTU?

E nwere ọtụtụ puku Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie. Ọ bụrụ na e dehie ihe ole na ole n’otu, iji ya tụnyere ndị ọzọ ga-eme ka a mata nke bụ́ eziokwu. Ị chọọ ịmụtakwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Has the Bible Been Changed or Tampered With?” na jw.org.

Dị ka ihe atụ, tụlee Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ e dere n’oge ochie. Ọ bụ ndị bedouin chọpụtara ya n’ọgba dị nso n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ n’afọ 1947. E nwere ihe ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ dị n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ. E dere ha ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga. Ndị ọkà mmụta ji ha tụnyere Akwụkwọ Nsọ anyị nwere taa. Ma, olee ihe ha chọpụtara?

Mgbe ndị ọkà mmụta ji nwayọọ tụlee akwụkwọ mpịakọta ndị ochie, a chọpụtara na ihe ndị dị n’Okwu Chineke anyị nwere taa na ihe ndị mbụ * e dere n’Okwu Chineke bụ otu. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke gbara mbọ hụ na e nweghị ihe a gbanwere n’Akwụkwọ Nsọ ya anyị nwere taa.

N’ihi ya, anyị nwere ike ịgụ Okwu Chineke obi esie anyị ike na enweghị ihe a gbanwere na ya. Ka anyị buru ihe a n’uche tụlee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta gbasara Chineke site n’aka ndị amụma ya.

^ par. 7 Ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ The Complete Dead Sea Scrolls in English, peeji nke iri na isii. Ọ bụ Geza Vermes dere ya.