Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka

Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.” ​—ILU 17:17.

Ihe Ọ Pụtara

O nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-eme eme ma ọ bụrụ na isi akpakọghịzi enyi anyị ọnụ. Mana, anyị nwere ike igosi na anyị hụrụ enyi anyị n’anya ma anyị nyere ya aka idi nsogbu a ọ na-enwe. Olee otú anyị ga-esi nyere ya aka.

Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka

‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa.’​—JEMS 1:19.

Otu ụzọ kacha mma ị ga-esi enyere enyi gị aka bụ ige ya ntị mgbe ọ chọrọ ikwu okwu. Echela na ị ga-azaghachirịrị ihe ọ bụla o kwuru. Mee ka ọ mata na ị na-anụ ihe ọ na-ekwu nakwa na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ya, akatọla ya ma ọ bụ maa ya ikpe. Cheta na o nwere ike ikwu ihe ndị ọ na-ebughị n’obi ikwu, ndị ọ ga-emecha kwaara mmakwaara.​—Job 6:​2, 3.

“Na-agụgụ ndị dara mbà.”​—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.

Enyi gị nwere ike ịna-echegbu onwe ya ma ọ bụ na-eche na e nweghị uru ọ bara. Ị ga-akasi ya obi ma gbaa ya ume ma ọ bụrụ na ị na-eme ka obi sie ya ike na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụrụgodị na ị maghị kpọmkwem ihe i kwesịrị ikwu.

“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya”​—ILU 17:17.

Na-enyere ya ezigbo aka. Kama iche na ị ma otú ị ga-esi nyere ya aka, jụọ ya ihe ọ ga-achọ ka i mee. Ọ bụrụ na ọ na-esiri enyi gị ike ịkọwa ihe ndị dị ya mkpa, gbalịa tụọrọ ya aro ihe gị na ya nwere ike imekọ ọnụ, dị ka gị na ya iso kpagharịa. Ma ọ bụkwanụ i nwere ike ịgwa ya ka ị gaara ya ahịa, ka i hichaara ya ụlọ, ma ọ bụ meere ya ihe ndị ọzọ.​—Ndị Galeshia 6:2.

‘Na-enwe ndidi.’​—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.

O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adị enyi gị nke ikwu okwu. Mee ka obi sie ya ike na ọ ga-amasị gị ige ya ntị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ikwu okwu. Ọrịa enyi gị na-arịa nwere ike ime ka o kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-ewute gị. O nwere ike ịkagbu ihe gị na ya kwetaburu na unu ga-eme ma ọ bụkwanụ ahụ́ agbakasịwa ya. Mgbe ị na-agbalị inyere ya aka, na-enwere ya ndidi, na-egosikwa na ị ghọtara nsogbu ya.​—Ilu 18:24.

Inyere Ya Aka Nwere Ike Ime Ka Ihe Katụrụ Ya Mma

“Ana m agbalị ka m bụrụ ezigbo enyi ọ ga-atụkwasịli obi. Ọ bụ eziokwu na enweghị m ike ime ka nsogbu ya laa, ma m na-agbalị ege ntị n’ihe ọ chọrọ ikwu. Mgbe ụfọdu, naanị ihe dị ya mkpa bụ onye ga-ege ya ntị ka obi ruo ya ala.”​—Farrah, a onye enyi ya na-arịa isi mgbaka na ọrịa na-eme ka ọ na-echegbukarị onwe ya ma ghara ịna-enwe mmasị iri nri.

“Otu n’ime ndị enyi m dị ezigbo obiọma, ọ makwa otú e si agba mmadụ ume. Ọ kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ya rie nri ọ kwọrọ aka sie. Otú o si gosi m na ọ hụrụ m n’anya mere ka m gwa ya otú obi dị m. Ihe a gbara m ezigbo ume.”​—Ha-eun, onye na-arịa isi mgbaka.

“Ndidi dị ezigbo mkpa. Mgbe ọ bụla nwunye m mere ihe wutere m, m na-echeta na ọ bụ ọrịa ya kpatara ya, ọ maghị ụma na-eme ya. Ihe a na-enyere m aka ka m ghara iwe iwe, na-emekwa ka m na-emetara ya ebere.”​—Jacob, onye nwunye ya na-arịa isi mgbaka.

“Nwunye m enyerela m ezigbo aka, ọ na-akasikwa m obi. Mgbe ọ bụla nchegbu mere ka obi daa m mbà, ọ naghị amanye m ime ihe ọ bụla m na-achọghị ime. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-ahapụ ime ihe ọ gaara enwe mmasị ime. Otú o si emesapụrụ m aka ma na-anapụ onwe ya ihe ụfọdụ n’ihi m mere ka ọ bụrụ ọpụrụiche.”​—Enrico, onye na-arịa ọrịa na-eme ka ọ na-echegbukarị onwe ya.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.