Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TETA! Nke 4 n'Afọ 2017 | Ọrụ I Ji n’Aka Ọ̀ Karịrị Akarị?

Ọtụtụ ndị taa ji ọtụtụ ọrụ n’aka nke na ha enweghị ohere ọ bụla maka ezinụlọ ha na ndị ọzọ.

Olee otú anyị nwere ike isi na-ewepụta oge maka ezinụlọ anyị na ndị ọzọ?

Otu nwoke nwere amamihe kwuru, sị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.”​—⁠Ekliziastis 4:⁠6.

“Teta!”a kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka iji oge anyị na-eme ihe ndị bara uru, dị ka, otú anyị ga-esi na-ahazi ihe ndị anyị na-eme nke ọma.

 

ISIOKWU TETA! A

Ọrụ I Ji n’Aka Ọ̀ Karịrị Akarị?

Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike inweta oge ga-ezuru ha iji rụọ ọrụ ha, na nke ga-ezuru ha iji mee ihe ndị dị n’ụlọ. Olee ihe na-akpata ya? Gịnị nwere ike ike inye aka?

Njem Dị Ịtụnanya Nnụnụ Arctic Tern Na-eme

Echeburu na ogologo njem nnụnụ arctic tern na-eme kwa afọ iji si n’otu ngwụcha ụwa fere gaa ná ngwụcha ụwa nke ọzọ, bụ ihe dị ka puku kilomita iri atọ na ise na narị kilomita abụọ. Ma, ihe ahụ bụ naanị ụfọdụ n’ime ya.

‘Ezi Aha Dị Mma Karịa Akụ̀ Dị Ukwuu’

Mmadụ ò nwere ike inwe aha, ndị mmadụ a na-akwanyekwara ya ùgwù. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Mgbe Ụmụaka Gara Biri nke Ha

Ihe ụfọdụ ndị dị na nwunye na-agabiga na-akarị akarị ma ụmụ ha too ma si n’ụlọ pụọ. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ime ka ọnọdụ a bụrụ nke na-eweta obi ụtọ?

AJỤJỤ ỌNỤ

Onye Gụrụ Gbasara Ụbụrụ Mmadu Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

N’isiokwu a Prọfesọ Rajesh Kalaria kwuru gbasara ọrụ ya na ihe ndị o kweere. Olee ihe mere o ji nwee mmasị na sayensị? Gịnị mere o ji chọọ ịmatakwu gbasara otú ndụ si malite?

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọnwụnwa

Ịgba alụkwaghịm, nsogbu ahụ́ ike, na akọnuche ịpịa mmadụ ụtarị so ná nsogbu ụfọdụ ịdaba n’ọnwụnwa na-akpata taa. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịdaba n’ọnwụnwa?

È KERE YA EKE?

Ihe Mere Mkpụrụ Osisi Pollia Berry Ji Acha Anụnụ Anụnụ | È kere Ya Eke?

Ihe mere mkpụrụ osisi a ji na-acha anụnụ anụnụ esighị n’ime ya, ma, anụnụ anụnụ nke ya pụrụ iche. Gịnịzi mere o ji maa mma dị egwu otú ahụ?

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Mụ na Ezinụlọ M Aka Ịna-ebi n’Udo?

Ihe Baịbụl kwuru enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ka ha na ezinụlọ ha na-ebi n’udo.

Monica Richardson: Onye Dọkịta Ekwuo Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

Ọ chọwara ịchọpụta ma ihe na-eme n’ịmụ nwa ọ̀ nọkatara na-eme ka è nwere onye ma ihe kere ya. Gịnị ka o mechara chọpụta n’ihe ọ na-arụ?