Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-akpata Esemokwu n’Ezinụlọ?

Gịnị Na-akpata Esemokwu n’Ezinụlọ?

E NWERE otu nwaanyị onye Gana aha ya bụ Sarah. * Ọ lụrụ di kemgbe afọ iri na asaa. O kwuru, sị: “Ihe na-esekarịrị mụ na di m okwu bụ ego. Ihe bụ́ iwe m bụ na ọ bụ m na-ebu ibu ezinụlọ anyị, di m anaghịdị ajụ m otú m si na-eme ya. Mụ na ya anaghị atụpụrụ onwe anyị ọnụ kemgbe ọtụtụ izu.”

Di ya bụ́ Jacob kwuru na ya na nwunye ya na-agwa ibe ha okwu ọjọọ mgbe ụfọdụ. O kwukwara na ihe na-akpatakarị ya bụ na ha na-aghọtahie ibe ha maka na ha anaghị agwakarị ibe ha ihe ha chọrọ ime. Ihe ọzọ o kwuru mere ha ji esekarị okwu bụ na ha na-ewerekarị ụmụ obere ihe ha gaara eleghara anya ka nnukwu ihe.

E nwere nwoke bụ́ onye India aha ya bụ Nathan ka lụrụ nwaanyị ọhụrụ. O kwuru na ọgọ ya nwoke baara ọgọ ya nwaanyị mba otu ụbọchị, ọgọ ya nwaanyị ewee iwe hapụrụ ya ụlọ. O kwuru na mgbe ọ jụrụ ọgọ ya nwoke ihe mere o ji gwa nwunye ya okwu otú ahụ, ya adị ya ka ọ̀ na-akparị ya. Ọgọ ya nwoke abawaziere onye ọ bụla mba.

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-esekarị okwu mgbe ọ bụla ị gwara ya okwu na-adịghị mma mgbe ahụ́ na-agbakasị ya. Mkparịta ụka unu ji olu ọma bido nwedịrị ike dagharịa, unu amalite ise okwu. O nweghị mmadụ zuru okè, n’ihi ya, anyị nwere ike ịghọtahie ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụkwanụ ihe ha bu n’obi mee ihe ha mere. N’agbanyeghị ya, anyị ga-emeli ka udo dị n’ezinụlọ anyị.

Olee ihe di na nwunye nwere ike ime ma ha nwee nghọtahie? Olee ihe onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ime ka ha nwee ike ịdịghachi ná mma? Gịnị ga-enyere ezinụlọ dị iche iche aka ịna-ebi n’udo? Biko, gụọ isiokwu ndị na-esonụ ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.