Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | BAỊBỤL Ọ̀ KA BARA URU?

Hụ Ndị Ọzọ n’Anya

Hụ Ndị Ọzọ n’Anya

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”Ndị Kọlọsi 3:14.

URU Ọ BARA: Ụdị ịhụnanya Baịbụl kacha kwuo okwu ya abụghị nke gbasara ije nwoke na nwaanyị. Kama, ọ bụ ezigbo ịhụnanya. Onye nwere ụdị ịhụnanya a na-enwe ọmịiko, na-agbaghara ndị ọzọ, dịrị obi umeala, na-eme ihe ziri ezi, nwee obiọma, dịrị nwayọọ, na-enwekwa ndidi. (Maịka 6:8; Ndị Kọlọsi 3:12, 13) Ịhụnanya nzuzu anaghị adịte aka. Ma, ezigbo ịhụnanya na-adịgide adịgide.

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Brenda. Ọ lụrụ di kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ atọ. O kwuru, sị: “Di na nwunye na-ahụ ibe ha n’anya ma ha lụọ ọhụrụ. Ma, ka oge na-aga, ha na-ahụkwu ibe ha n’anya karịa mgbe ahụ ha lụrụ ọhụrụ.”

E nwere otu nwoke aha ya bụ Sam. Ọ lụrụ nwaanyị kemgbe ihe karịrị afọ iri na abụọ. O kwuru, sị: “Obi na-atọ mụ na nwunye m ụtọ mgbe niile ma anyị hụ otú ihe Baịbụl kwuru si baa uru ma dị mfe omume. Ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka ihe na-aga siriri werere. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị m mfe ime ihe o kwuru. Dị ka ihe atụ, ọ naghị adịrị m mfe mgbe ọ bụla ezigbo iwe ji m, mgbe m chọrọ ime ihe ga-abara naanị m uru, ma ọ bụ mgbe ike gwụrụ m. Ọ na-abụ ụdị ihe ndị a mee, mụ arịọ Jehova ka o nyere m aka ka m na-eme ihe dị mma. M na-agazi makụọ nwunye m. Tupu mụ amara ihe na-emenụ, ọ na-adị ka o nweghị ihe merenụ.”

“A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya”

Jizọs Kraịst kwuru na “a na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na Baịbụl nwere ike ime ka mmadụ nwee ezigbo amamihe. Ihe ndị e dere na ya ka bara uru taa. Ọ na-abara mmadụ niile uru n’agbanyeghị obodo ha si ma ọ bụ omenala ha. Otú ihe e kwuru na ya si gbasa ụmụ mmadụ gosiri na ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye kere ụmụ mmadụ, nyere anyị ya. Uru dị n’ime ihe Baịbụl kwuru gosiri na ihe a niile bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ (Abụ Ọma 34:8) Ị̀ ga-eme ihe a o kwuru?