Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe Na-echebe Onye Nwere Ya

Amamihe Na-echebe Onye Nwere Ya

“Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ịbasiri ogbenye mba ike maka iji ego gbara onwe ya enweghị isi.”—ILU 13:8, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

N’EZIOKWU, e nwere uru dị n’inwe ego. Ma, e nwere nsogbu ndị ya na ya na-agakọ, nke ka nke, n’oge ọjọọ a anyị bi na ya. (2 Timoti 3:1-5) N’obodo ụfọdụ, ndị nwere ego na-aghọrọ ndị ohi na ndị na-atọrọ mmadụ anụ oriri.

Otu akwụkwọ akụkọ kwuru ihe na-eme n’otu obodo ka na-emepe emepe. Ọ sịrị: “Iji égbè ezu ohi, igwu wayo na ịtọrọ mmadụ na-eme ka ndị ọgaranya na ndị ogbenye dịrị n’iro. Ị gaa n’ụlọ nri dị iche iche, ị ga-ahụ ndị nche ka ha ji égbè na-eche nche. A na-agba ụlọ ndị nwere ego ogige, ndị nche ana-echekwa ha nche. A na-etinyecha ha ọkụ, kamera, na ihe ndị ga-emerụ onye ọ bụla chọrọ isi n’ogige gafeta ahụ́.” Ụdị ihe a na-emekwa n’ọtụtụ obodo.

Ma, Baịbụl gosiri na ihe a niile agbasaghị ndị ogbenye. Olee uru ihe ahụ Ilu 13:8 kwuru ga-abara gị? Ọ bụrụ na i bi n’ebe ndị omekome juru ma ọ bụkwanụ na ị ga-aga ụdị ebe ahụ, egosila ndị mmadụ na i nwere ego. Chee echiche nke ọma tupu i kpebie ihe ị ga-eyi ma ọ bụkwanụ ihe ị ga-eji apụ apụ, ka ọ ghara ịdọrọ anya ndị mmadụ. Ilu 22:3 kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”

Ụdị amamihe a Baịbụl kwuru ka anyị nwee gosiri na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya. Ọ chọghị ka anyị daba ná nsogbu. Ekliziastis 7:12 kwuru na “amamihe bụ ihe nchebe” n’ihi na ọ “na-echebe ndị nwe ya ndụ.”