Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú m ga-esi eme ihe ndị m kpebiri ime?

Olee otú m ga-esi eme ihe ndị m kpebiri ime?

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee otú m ga-esi eme ihe ndị m kpebiri ime?

OLEE nke ị ga-achọ inwe n’ime ihe ndị a?

● Inwekwu obi ike

● Inwekwu ndị enyi

● Inwekwu obi ụtọ

Nke bụ́ eziokwu bụ na i nwere ike inwe ha atọ! Olee otú ị ga-esi enwe ha? Ihe ị ga-eme bụ ikpebi na ị ga-enwe ha ma gbaa mbọ hụ na i nwetara ha. Tụlegodị ihe ndị a.

Inwekwu obi ike Ọ bụrụ na i nwee obere ihe ndị i kpebiri ime ma hụ na i mere ha, obi ga-esizi gị ike ikpebi ime ndị nke karịrị ha. Obi ga-esikwukwa gị ike imeri nsogbu ndị ọzọ na-abịara gị kwa ụbọchị, dị ka ịgwa ndị ọgbọ gị na ị gaghị eme ihe ọjọọ ha chọrọ ka i mee. Nke a nwekwara ike ime ka ndị ọzọ hụ na obi siri gị ike ime ihe ọma ma bido ịkwanyere gị ùgwù. Ụfọdụ ndị na-enye gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ nwedịrị ike kwụsịlata inye gị nsogbu. N’eziokwu, ha nwedịrị ike ịjawa gị mma.—Gụọ Matiu 5:14-16.

Inwekwu ndị enyi Ọ bụ ndị ma ihe ha chọrọ ime ná ndụ ma na-agba mbọ eme ha ka ndị mmadụ na-emetekarị enyi. Ọ bụrụkwa na ndị enyi gị metere gị enyi n’ihi na i nwere ihe ndị i kpebiri ime ná ndụ, ha ga-eso ná ndị ga-enyere gị aka ịhụ na i mere ihe ndị ahụ.—Ekliziastis 4:9, 10.

Inwekwu obi ụtọ Nke bụ́ eziokwu bụ na ị gaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na i nweghị ihe ndị i kpebiri ime ná ndụ gị. Ma i nwee ihe ndị i kpebiri ime ma hụ na i mere ha, obi ga-adị gị ụtọ. Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi, bụ́ Onye Kraịst na narị afọ mbụ, ji kwuo n’otu oge, sị: “Anaghị m agba ọsọ n’enweghị ebe m kpebiri ịgbaru.” (1 Ndị Kọrịnt 9:26, nsụgharị Baịbụl a na-akpọ Contemporary English Version) Chetakwa na i nwee nnukwu ihe i kpebiri ime ma mee ya, ị ga-enwe nnukwu obi ụtọ na i mere ya!

Ì jikerela ikpebi ihe ị ga-eme na ibido ya? Chakapụta peeji na-esonụ ma si n’etiti pịajie ya gaa n’aka nri, meekwa ihe ndị e depụtara ka i mee. *

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Aro ndị a tụrụ na peeji ahụ ga-enyere gị aka n’ihe ndị i kpebiri ime n’ime izu ole na ole ma ọ bụ ọnwa ole na ole. Ma, e nweekwa nnukwu ihe ndị i kpebiri ime, ha ga-enyekwara gị aka ime ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Mmadụ ò nwere ike inwe ọtụtụ ihe ndị o kpebiri ime?—Ndị Filipaị 1:10.

● Ikpebi ihe ndị ị ga-eme ọ̀ pụtara na ị ga-ahazi ihe ị ga na-eme n’oge ọ bụla n’ụbọchị?—Ndị Filipaị 4:5.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17, 18]

Otú ị ga-esi eme ihe ndị i kpebiri ime

CHỌPỤTA HA Ilu 4:25, 26 1

“Ụjọ atụla gị ikpebi ime nnukwu ihe. Ebe ọ bụ na ndị ọzọ emeela ha, gịnwa ga-emeli ha.”—Roben.

1. Chepụta ihe ndị i nwere ike ime. Mgbe ị na-edepụta ihe ndị ị ga-eme, echerela ya oké echiche; dewe nnọọ ihe ọ bụla batara gị n’obi. Lee ma ị̀ ga-edepụtali ihe ruru iri ma ọ bụ iri abụọ.

2. Lebara ha anya. Olee ndị nke ga-akacha agụ gị agụụ ime? Olee ndị nke ga-akacha siere gị ike ime? Olee nke ga-akacha enye gị obi ụtọ ma i mete ya? Cheta na ihe ndị ị ga-akacha eme nke ọma na ha bụ ndị nke kacha atọ gị ụtọ ime.

3. Hazie otú ị ga-esi eme ha. Buru ụzọ họrọ ndị nke ị ga-emechali n’ụbọchị ole na ole. Họrọzie ndị nke ga-ewe gị ọtụtụ izu ma ọ bụ ọnwa ole na ole imecha. Depụtazie ha otú ọ ga-abụ i mechaa otu, gị emee nke na-eso ya.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ikpebi Ime

Enyi Imete otu onye na-abụghị ọgbọ m enyi. Ịhụ na mụ na otu onye bụ́bu enyi m dịwakwara ná mma.

Ahụ́ ike Ịhụ na m na-ejiru nkeji iri itoolu na-emega ahụ́ kwa izu. Ịhụ na m na-ehiru ụra awa asatọ kwa abalị.

Agụmakwụkwọ Imekwu nke ọma ná mgbakọ na mwepụ. Ịhụ na esoghị m ụmụ akwụkwọ ibe m ghọọ aghụghọ ule ma ha chọọ ka m soro ha mee ya.

Ihe ime mmụọ Ịhụ na m na-eji nkeji iri na ise agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Izi otu nwa akwụkwọ ibe m ozi ọma n’izu a.

Hazie Ha Ilu 21:5 2

“Ọ dị mma inwe ihe ndị i kpebiri ime, ma ọ dịkwa mkpa ka ị hazie otú ị ga-esi eme ha. Ọ bụrụ na ị hazighị ya, naanị ihe ị ga na-ekwu bụ na ị chọrọ ime nke a na nke ọzọ, ma ị gaghị eme ha eme.”—Derrick.

Na nke ọ bụla n’ime ihe ndị i kpebiri ime, mee ihe ndị a:

1. Dee otu ihe i kpebiri ime.

2. Dee ụbọchị ị ga-achọ imecha ya. A sị kwuwe, mmadụ ikpebi ihe ọ ga-eme n’enweghị mgbe o bu n’obi imecha ya enweghị isi!

3. Dee otú ị ga-esi eme ya.

4. Dee nsogbu ndị i nwere ike inwe. Dezie otú ị ga-esi emeri ha.

5. Kpebisie ike na ị ga-emerịrị ya. Gwa onwe gị na ị ga-eme ihe niile i nwere ike ime iji hụ na i mere ihe ahụ i kpebiri ime. Bịanyezie aka n’akwụkwọ ahụ i dere ihe ndị ahụ ma dee ụbọchị ị bịanyere aka.

M ga-amụ Yoruba maka mgbe m ga-aga Legọs na Julaị 1

Otú m ga-esi eme ya

1. M ga-achọta akwụkwọ e ji amụ Yoruba.

2. M ga-agbalị ịmụta mkpụrụ okwu ọhụrụ iri n’izu ọ bụla.

3. M ga na-ege ntị mgbe ndị na-asụ Yoruba na-ekwu okwu.

4. M ga-agwa onye ma asụ Yoruba ka ọ na-ege m ntị ma gwa m nke m na-ekwuteghị.

Nsogbu ndị m nwere ike inwe

O nweghị onye ma asụ Yoruba nọ m nso

Otú m ga-esi emeri ya

M ga-enweta kaseti ma ọ bụ siidi dị n’asụsụ Yoruba ma na-ege ya.

․․․․․ ․․․․․

Bịanye aka Ụbọchị

Bido Ya! Jọn 13:17 3

“Ọ bụrụ na mmadụ akpachaghị anya, ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka o chefuo ihe ndị o kpebiri ime. N’ihi ya, uche gị kwesịrị ịdị n’ihe ndị i kpebiri ime, i kwesịkwara ịgba mbọ hụ na i mere ha.”—Erika.

Bido ya taa. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime taa iji bido ime ihe a m kpebiri ime?’ Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ị gaghị amatacha ozugbo otú ị ga-esi eme ihe ahụ ị chọrọ ime, ma ekwela ka ọ bụrụ ya ga-egbochi gị ibido ya. Dị ka Baịbụl kwuru, “ọ bụrụ na mmadụ echere mgbe ìfùfè kwụsịrị, ọ gaghị agha mkpụrụ. Ọ bụrụkwa na mmadụ elekwasị igwé ojii anya, onye ahụ agaghị ewè ihe ubi.” (Ekliziastis 11:4, Bible Nsọ Ọhụụ) Chọpụta ihe i nwere ike ime taa ma mee ya, ọ sọgodị ya ya dịrị obere.

Na-elebagharị anya kwa ụbọchị n’ihe ndị ahụ i kpebiri ime. Na-agwa onwe gị ihe mere nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ i kpebiri ime ji dị gị mkpa. N’ebe ahụ i depụtara otú ị ga na-esi eme ya, kanye na nke ọ bụla i mechara (ma ọ bụkwanụ gị edee ụbọchị i mechara ya).

Gbanwee ya ma ọ dị mkpa. Otú ọ sọkwara gị si hazie otú ị ga-esi eme ya, ka oge na-aga, o nwere ike dị mkpa na ị ga-agbanwe ihe ụfọdụ. Ọ dịghị njọ ma i mee otú ahụ. Ọ bụghị iwu na ị ga-esorịrị otú ahụ i si hazie ya na mbụ. Ihe ka mkpa bụ ịgba mbọ hụ na i mechara ihe ahụ i kpebiri.

Were ya na ị na-ahụ mgbe i mechara ya. Were ya na ị na-ahụ mgbe i mechara ihe ahụ i kpebiri ime. Chee otú obi ga-adị gị ma i mechaa ya. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ iche otú i si mere ya ruo mgbe i mechara ya. Ngwa, malitezie ime ya. Ichebara ya echiche otú a ga-eme ka ị gbalịsie ike mee ya!

[Foto]

Ihe i kpebiri ime yiri ụlọ e sere ese nke a chọrọ ịrụ arụ—a ga-agba mbọ tupu e mezuo ihe abụọ ahụ!

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU 4

“Obi ga na-ajọkarị gị njọ ma ọ bụrụ na o nweghị ihe i kpebiri ime ná ndụ. Ma e nwee ihe ndị i kpebiri ime ma hụ na ị na-eme ha, obi ga na-adị gị mma.”—Reed.

“E nwee ihe i kpebiri ime, obi ajọkwala gị njọ ma ọ bụrụ na ị naghị emetecha ya otú ị chọrọ ma ọ bụkwanụ i mechaghị ya n’oge i bu n’obi i mecha ya. Obi ịjọwa gị njọ agaghị enyere gị aka. Ihe dị mkpa bụ ijisi ike mechaa ya!”—Cori.

“Gwa ndị nwerela ike ime ihe ndị ahụ i kpebiri ime ka ha nyere gị aka. Ha nwere ike ịgba gị ume ma gwa gị ihe ụfọdụ ga-abara gị uru. Gwakwa ndị ezinụlọ unu ihe ndị i kpebiri ime ka ha nwee ike iso ná ndị ga-enyere gị aka.”—Julia.

[Ihe Osise dị na peeji nke 17]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Chakapụta ebe a e suru kpọm kpọm kpọm

Pịajie ebe a