Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ bụ m kwụsị ịga akwụkwọ?

Ọ̀ bụ m kwụsị ịga akwụkwọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ọ̀ bụ m kwụsị ịga akwụkwọ?

Olee ebe i chere i kwesịrị ịgụru akwụkwọ?

․․․․․

Olee ebe ndị mụrụ gị chọrọ ka ị gụruo? 

․․․․․

IHE ị zara na ha abụọ ọ̀ bụ otu? Ọ bụrụgodị na ihe ị zara na ha abụọ bụ otu, ya abụrụkwa na ị ka na-aga akwụkwọ, e nwere ike inwe ụbọchị ndị ọ ga-adị gị ka gị kwụsị ịga akwụkwọ. È nwetụla mgbe ọ dị gị otú ọ dị ndị a e kwuru okwu ha n’okpuru ebe a?

“Mgbe ụfọdụ ike akwụkwọ na-agwụ m nke na ọ naghị adị m ka m si n’ebe m dina bilie. Ihe m na-eche bụ, ‘Oleedị uru ọ baara m ịga akwụkwọ gaa mụọ ihe ndị ọ na-enweghị ihe m ga-eji ha eme?’”—Rachel.

“O nweela ọtụtụ mgbe ike akwụkwọ gwụrụ m nke na ọ dị m ka m kwụsị ịga akwụkwọ ma gaa chọrọ ọrụ. Ọ na-adị m ka o nweghị uru akwụkwọ m na-aga na-abara m nakwa na ọ ga-akara m mma imewe ihe ga na-enye m ego.”—John.

“E nwere mgbe ihe omume ndị nkụzi na-enye m mee n’ụlọ na-ewe m awa anọ ime n’abalị ọ bụla! Ihe ndị m ga-eme eme na-esi n’elu si n’ala zuo m ahụ́, nke na ọ na-adị m ka ọ̀ bụ m kwụsị ịga akwụkwọ.”—Cindy.

“N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere ụbọchị anyị gbara ọsọ n’ihi na e kwuru na e nwere onye webatara bọmbụ. E nweela ugboro atọ e nwere ndị chọrọ igbu onwe ha, e nweela mgbe otu onye gburu onwe ya, e nweekwala mgbe òtù ọjọọ ndị e nwere n’ụlọ akwụkwọ anyị lụrụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị a niile na-eme ka ike akwụkwọ gwụ m.”—Rose.

Ì nwetụla ụdị nsogbu ndị a a kọrọ ebe a? Ọ bụrụ na i nwetụla, olee ihe mere ka ike akwụkwọ gwụ gị?

․․․․․

O nwere ike, ugbu a, i chesiwela echiche ike ịkwụsị ịga akwụkwọ. Ma olee otú ị ga-esi amata ma ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ọ̀ bụ n’ihi na ị gụruola ebe i kwesịrị ịgụru, ka ọ̀ bụ n’ihi na ike akwụkwọ agwụla gị?

Ọ̀ Dị Mma ma M Kwụsị Ịga Akwụkwọ?

Ị̀ ma na ná mba ụfọdụ, ọ bụghị ihe ọjọọ ma onye na-eto eto gaa akwụkwọ naanị afọ ise ma ọ bụ afọ asatọ? Ná mba ndị ọzọ, gọọmenti chọrọ ka nwa akwụkwọ ọ bụla gaa akwụkwọ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo afọ iri ma ọ bụ afọ iri na abụọ. N’ihi ya, afọ ole nwa akwụkwọ ga-adị tupu ọ gụchaa akwụkwọ ma ọ bụ afọ ole ọ ga-agụru akwụkwọ abụghị otu n’ụwa niile.

Ihe ọzọkwa bụ na ná mba ụfọdụ, a na-ekwe ka ndị nkụzi na-abịa n’ụlọ akụziri nwa akwụkwọ ihe niile a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ụfọdụ n’ime ha, kama nwa ahụ ịgawa n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ekpebie ka ndị nkụzi na-abịa n’ụlọ akụziri ụmụaka ha ihe, a gaghị asị na ụmụaka ahụ akwụsịla akwụkwọ.

N’ihi ya, ma ị̀ na-aga akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na ị nọ n’ụlọ agụ, ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịkwụsị akwụkwọ tupu oge ị ga-agụcha eruo, ọ dị mkpa ka ị jụọ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ:

Gịnị ka iwu obodo anyị kwuru? Dị ka anyị kwuburu, afọ ole gọọmenti kwuru nwa akwụkwọ ga-agụru akwụkwọ, ma ọ dịkarịa ala, abụghị otu n’obodo niile. Afọ ole ka iwu obodo unu kwuru ka nwa akwụkwọ gụruo akwụkwọ, ma ọ dịkarịa ala? Ị̀ gụruola ebe ahụ? Ọ bụrụ ị gụrughị ebe ahụ, ọ gaghị adị mma ma ị kwụsị, n’ihi na ọ bụrụ na ị kwụsị, ọ pụtara na ị naghị ‘edo onwe gị n’okpuru ndị ọchịchị’ dị ka Baịbụl kwuru.—Ndị Rom 13:1.

Àmụtala m ihe ndị m chọrọ ịmụta? Olee ihe ndị ị chọrọ ịmụta n’akwụkwọ ị na-aga? Ọ̀ bụ na ị mabeghị ihe ndị ị chọrọ ịmụta? I kwesịrị ịma! Ma ọ́ bụghị ya, ị ga-adị ka onye banyere ụgbọ okporo ígwè ma onye ahụ amaghị ebe ọ chọrọ ịga. N’ihi ya, gị na ndị mụrụ gị nọrọ ala ma dejupụta ihe ndị e kwuru n’igbe dị na peeji nke 28, nke isiokwu ya bụ,  “Ihe Ndị M Ga-achọ Ịmụta n’Akwụkwọ M Na-aga.” Unu mee ya, ị ga-enwe ike ịma ihe ndị ị chọrọ ịmụta, ọ ga-enyekwara gị na ndị mụrụ gị aka ikpebi ebe ị ga-agụru.—Ilu 21:5.

O doro anya na ndị nkụzi unu na ndị ọzọ nwere ike ịtụrụ gị aro ebe ị ga-agụru. Ma, ọ bụ ndị mụrụ gị ka ọ dị n’aka ikpebi ebe ị ga-agụru. (Ilu 1:8; Ndị Kọlọsi 3:20) Ọ gaghị adị mma ka ị kwụsị akwụkwọ ma ọ bụrụ na ị gụrubeghị ebe gị na ndị mụrụ gị kpebiri na ị ga-agụru.

Gịnị mere m ji chọọ ịkwụsị akwụkwọ? Kpachara anya ka ị ghara iduhie onwe gị. (Jeremaya 17:9) Ụmụ mmadụ chọwa ime ihe na-enweghị isi, ha na-achọtakarị ihe ha ga-asị na ọ bụ ezigbo ihe mere ha ji mee ihe ha mere.—Jems 1:22.

Detuo ezigbo ihe ndị nwere ike ime ka ị kwụsị ịga akwụkwọ mgbe ị na-agụchabeghị.

․․․․․

Detuo ihe ndị na-enweghị isi mere i ji chọọ ịkwụsị.

․․․․․

Olee ezigbo ihe ndị i dere mere i ji chọọ ịkwụsị? Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ka i nwee ike kpatawa ego ị ga-eji nyere ndị ezinụlọ unu aka ma ọ bụ ka i nyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke. Ihe ndị na-enweghị isi mere i ji chọọ ịkwụsị nwere ike ịbụ iji gbaara ule a na-ele n’ụlọ akwụkwọ unu ọsọ ma ọ bụ ka ị kwụsị ime ihe omume ndị nkụzi unu na-enye gị mee n’ụlọ. Ebe okwu dị bụ ịchọpụta ihe bụ́ isi mere i ji chọọ ịkwụsị ịga akwụkwọ, ọ̀ bụ ezigbo ihe ka ọ̀ bụ ihe na-enweghị isi?

Leghachigodị anya n’ihe ndị ahụ i dere. N’eziokwu gị niile, olee ihe kacha mkpa mere i ji chọọ ịkwụsị akwụkwọ? Na nke ahụ kacha mkpa dee 5, n’ọzọ na-eso ya dee 4, derezie ya otú ahụ na-agbada. Ọ bụrụ na ị kwụsị ịga akwụkwọ naanị iji gbaara nsogbu ọsọ, i nwere ike imecha kwaa mmakwaara.

Gịnị Mere Ọ Dịghị Mma Ịkwụsị Akwụkwọ?

Ịkwụsị akwụkwọ yiri isi n’ụgbọ okporo ígwè wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga. O nwere ike otú ụgbọ ahụ dị na-eme ka ahụ́ ghara iru gị ala, o nwekwara ike ndị gị na ha nọ n’ụgbọ ahụ na-akpasu gị iwe. Ma ọ bụrụ na i si n’ụgbọ ahụ wụpụ, ị gaghị agaru ebe ị na-aga, i nwekwara ike imerụ ezigbo ahụ́. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị kwụsị akwụkwọ, ị gaghị amụta ihe ndị ị chọrọ ịmụta, i nwekwara ike ịkpatara onwe gị ọtụtụ nsogbu.

Nsogbu ndị o doro anya na ị ga-enwe O nwere ike isiri gị ike inweta ọrụ. I nwetagodị ọrụ, o nwere ike ịbụ na ego a ga na-akwụ gị agaghị aharu ka nke a gaara na-akwụ gị ma a sị na ị gụchara. Iji nweta ego ga-ezuru gị, o nwere ike ihe ị ga-emezi bụ ịrụ ọrụ ọtụtụ awa n’ụdị ebe nwedịrị ike ịka ụlọ akwụkwọ unu njọ.

Nsogbu ndị ị na-agaghị echeta na ị ga-enwe Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ndị kwụsịrị ịga akwụkwọ n’ihi na ike akwụkwọ agwụla ha na-aka arịa ọrịa ná ndụ, ọ bụkwa ha na-aka ebido n’oge mụwa nwa, mete ihe e ji atụ ha mkpọrọ, ọ na-abụkarịkwa ha na-achọ ka a gbatara ha ọsọ enyemaka.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ị gụchaa akwụkwọ, ya abụrụ na ị gaghị enwe nsogbu ndị ahụ. Ma, olee uru ọ ga-abara gị ịhapụ ịgụcha akwụkwọ ma kpatara onwe gị nsogbu?

Uru Ịgụcha Akwụkwọ Bara

N’eziokwu, e nwee ule ị dara ma ọ bụ i nwee nsogbu ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ime ka ike akwụkwọ gwụ gị, ya-adị gị ka e nweghị nsogbu ị ga-enwe n’ọdịnihu ga-aka nke ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ unu ugbu a njọ. Ma tupu i kpebie na ọ kaara gị mma ịkwụsị ịga akwụkwọ, gụọ ihe ụmụ akwụkwọ ndị ahụ e kwuru okwu ha ná mbụ kwuru na ọ bụ uru ha ritere n’ihi na ha akwụsịghị ịga akwụkwọ.

“Amụtala m inwe ndidi mgbe m na-eme ihe ọ bụla, mụtakwa ichebara ihe ọ bụla m na-eme echiche nke ọma. Amụtakwala m na ọ bụrụ na e nwere ihe mmadụ na-eme na-esiri ya ike, ọ bụ ya ga-agbalịsi ike hụ na o metere ya. Ebe ọ bụ na akwụsịghị m ịga akwụkwọ, amụtakwuola m otú e si ese ihe, nke bụ́ ihe m ga-eme ma m gụchaa akwụkwọ.”—Rachel.

“Amatala m ugbu a na m gbaa ezigbo mbọ, m ga-amụta ihe ndị m chọrọ ịmụta. Ihe m na-amụ n’akwụkwọ m na-aga bụ otú e si arụzi ígwè e ji ebi akwụkwọ. Ọ ga-enyekwara m aka inweta ụdị ọrụ m chọrọ ịrụ ma m gụchaa akwụkwọ.”—John.

“Akwụkwọ m na-aga enyerela m aka ịma ihe m ga-eme ma m nwee nsogbu, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ebe ọ bụla ọzọ. Otú a m mụtarala ihe m ga-eme ma m nwee nsogbu n’ụlọ akwụkwọ, n’oge mụ na ndị ọzọ na-emekọ ihe, nakwa n’oge ndị ọzọ, enyerela m aka ịna-eme ihe ka onye toro eto.”—Cindy.

“Akwụkwọ m na-aga enyerela m aka ịma otú m ga-esi merie nsogbu ndị m ga-enwe ma m rụwa ọrụ. E nweekwala ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere n’ụlọ akwụkwọ anyị, bụ́ ndị nyeere m aka ịchọpụta ihe mere m ji kwere ihe ndị a kụziiri m n’okpukpe m na-ekpe. N’ihi ya, akwụkwọ m na-aga enyerela m aka ime ka okwukwe m sie ike.”—Rose.

Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya. Onye nwere ndidi ka onye mmụọ ya dị mpako mma.” (Ekliziastis 7:8) N’ihi ya, kama ị ga-akwụsị ịga akwụkwọ, jiri ndidi sowe nsogbu ndị ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ unu. Ọ bụrụ na i jiri ndidi sowe ha, ị ga-achọpụta na ọ ga-aka baara gị uru n’ikpeazụ.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Olee otú inwe ihe ndị ị ga-achọ ịmụta n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ ndị na-agaghị ewe gị oge ịmụta, ga-esi baara gị uru ma ị gụchaa?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ịma ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ ma ị gụchaa akwụkwọ?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“N’ụlọ akwụkwọ ka m mụtara inwe mmasị ịgụ akwụkwọ. I nwee ike ịgụ ihe onye ọzọ dere, ghọta otú onye ahụ si eche echiche na otú o si ele ihe anya, obi ga-adị gị ụtọ.”

“Ọ na-esiri m ike ịhazi ihe ndị m ga-eji oge m eme. A sị na m anaghị aga akwụkwọ, nsogbu a gaara aka njọ! Akwụkwọ m na-aga na-enyere m aka inwe ihe ndị m kwesịrị ime, ịhụ na m mere ha n’oge m kwesịrị ime ha, na ịhụ na m na-ebu ụzọ eme ihe ndị ka mkpa.”

[Foto]

Esme

Christopher

[Igbe dị na peeji nke 28]

IHE NDỊ M GA-ACHỌ ỊMỤTA N’AKWỤKWỌ M NA-AGA

Otu uru ịga akwụkwọ na-abara gị bụ ịkụziri gị ihe ndị ga-enyere gị aka inweta ọrụ ị ga-eji akpata ego ma nwee ike ilekọta onwe gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị ma i mechaa nwee ezinụlọ. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12) Ì kpebiela ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ nakwa otú akwụkwọ ị na-aga ga-esi enyere gị aka ịrụ ya? Iji nyere gị aka ịma ma akwụkwọ ị na-aga ọ̀ ga-abara gị uru n’ihe ị ga-achọ ịrụ, zaa ajụjụ ndị a:

  Olee ihe ndị m ma eme? (Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-adịrị gị mfe imete ndị mmadụ enyi? Ịrụ ọrụ aka ọ̀ na-atọ gị ụtọ, dị ka ịrụzi ihe ndị mebiri emebi ma ọ bụ ịrụpụta ihe ọhụrụ? E nwee ihe siiri gị ike omume, ị̀ na-anọrọ ala chebara ya echiche ma mee ya?)

․․․․․

Olee ụdị ọrụ ndị m nwere ike iji ihe ndị m ma eme rụọ?

․․․․․

Olee ụdị ọrụ ndị m nwere ike inweta n’obodo ebe anyị bi?

․․․․․

Olee ihe ndị a na-akụziri m ugbu a n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ndị ga-enyere m aka ịchọta ụdị ọrụ ahụ?

․․․․․

Olee ihe ndị ọzọ ọ ga-abụ m mụọ, ha enyere m aka ịmụtakwu ọrụ a m chọrọ ịrụ nke ọma?

․․․․․

Cheta na ihe mere i ji aga akwụkwọ bụ ka ị mụta ihe ga-enyere gị aka ma ị gụchaa. N’ihi ya, adịkwala ka onye banyere n’ụgbọ okporo ígwè ma o kweghịzi arịtu arịtu, ya bụ, aghọkwala nwa akwụkwọ na-anaghị agụcha agụcha, n’ihi na ị chọghị ka ndị ọzọ lewe gị anya ego n’aka.

[Igbe dị na peeji nke 29]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

“Ndị nkụzi anyị amaghị akụzi ihe!” “Ndị nkụzi m na-enye m ọtụtụ ihe omume m ga-eme n’ụlọ!” “Ana m ejisi ike agafere n’ule, oleedị uru ọ baara m ịna-akụwasị isi m?” Ihe ndị a bụ ihe ndị na-eme ka ụfọdụ ndị na-eto eto chewe echiche ịkwụsị ịga akwụkwọ tupu ha amụtadị ihe ndị ga-enyere ha aka ịkpata ihe ha ga-eri. Ọ bụrụ na ike akwụkwọ agwụwala nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị, gịnị ka i nwere ike ime?

Leba anya n’otú gịnwa si ele ịga akwụkwọ anya. Mgbe ị dị obere, ì weere ịga akwụkwọ ka igbu oge? Ọ̀ dị gị ka ụlọ mkpọrọ ị ga-anọrịrị na ya ruo ụbọchị ị ga-apụta ma chọrọ ihe ọzọ ka mma ị ga-emewe? Ọ bụrụ otú ahụ ka i si were ya n’oge ahụ, ya abụrụkwa na ị ka na-ele ya anya otú ahụ, o nwere ike ịbụ ya mere ike akwụkwọ ji agwụ ụmụ gị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ịga akwụkwọ ga-enyere ụmụ gị aka inweta “ezi amamihe na ikike iche echiche,” nke bụ́kwanụ àgwà ndị ga-enyere ha aka ime nke ọma ná ndụ ma ha too.—Ilu 3:21.

Nye ha ihe ndị ha ga-eji amụ ihe. Ụfọdụ ụmụaka ndị kwesịrị ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ anaghị eme nke ọma n’ihi na ha amaghị otú e si amụ ihe ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha enweghị ebe dị mma ha ga-anọ mụọ ihe. Ọ ga-adị mma ka e nwee tebụl a na-akwajughị ihe n’elu ya, ezigbo ọkụ e ji ahụ ụzọ, na akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ n’ebe a na-anọ amụ ihe. I nwere ike inyere nwa gị aka imewe nke ọma, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ihe gbasara ife Chineke, ma ọ bụrụ na ị hụ na o nwere ebe dị mma ọ ga-anọ echebara ihe ndị ọ na-agụ echiche.—1 Timoti 4:15.

Na-etinye anya n’akwụkwọ ọ na-aga. Were ndị nkụzi nwa gị na ndị na-enye ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ ka ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ, ọ bụghị ndị iro gị. Gbalịa ka gị na ha mata nke ọma. Gakwuru ha ka gị na ha kparịta ihe nwa gị chọrọ ime n’ọdịnihu na nsogbu ndị ọ na-enwe n’ụlọ akwụkwọ ugbu a. Ọ bụrụ na ọ na-esiri nwa gị ike ịgafere n’ule, gbalịa chọpụta ihe na-akpata ya. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-adị nwa gị ka ụmụ akwụkwọ ụfọdụ ga-emesiwe ya ike ma ya mewe nke ọma n’ụlọ akwụkwọ? È nwere onye nkụzi ya na ya na-enwe nsogbu? È nwere ihe ha na-amụ n’ụlọ akwụkwọ na-esiri ya ike ịmụta? Ihe ndị nwa gị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ nwere ike ịna-esitụrụ ya ike, ma o kwesịghị ime ka ụjọ ịga akwụkwọ na-atụ ya. Ihe ọzọ i kwesịrị ịchọpụta bụ ma anya ọ̀ na-enye nwa gị nsogbu ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ na-esiri ya ike ịmụta ihe.

Ka ị na-etinyekwu anya n’akwụkwọ nwa gị na-aga na otú o si eme n’ọgbakọ, ọ ga-adịkwuru nwa gị mfe ime nke ọma.—Ilu 22:6.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịkwụsị akwụkwọ yiri isi n’ụgbọ okporo ígwè wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga