Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

ỊKPỌ NDỊ MMADỤ ÒKÙ MAKA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS (Mach 11–Eprel 4)

“Anyị na-akpọ gị ka ị bịa otu nnọkọ pụrụ iche ọtụtụ nde mmadụ ga-abịa. Ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Nye ya akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ zigara ya nke dị n’Ịntanet. “Ị ga-ahụ oge na ebe anyị ga-anọ eme ya n’ógbè anyị a n’akwụkwọ a. Anyị na-akpọkwa gị ka ị bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-eji Baịbụl kwuo ná ngwụcha izu bu ya ụzọ.”

Ihe Ị Ga-eme ma O Nwee Mmasị: Kpọnyere ya vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs [ma ọ bụ zigara ya ihe ga-ebuga ya n’ebe ọ dị].

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?

MKPARỊTA ỤKA NKE MBỤ (Mach 1-10, Eprel 5-30)

Ajụjụ: Ònye bụ Jizọs?

Amaokwu Baịbụl: Mat. 16:16

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?

NLETAGHACHI

Ajụjụ: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?

Amaokwu Baịbụl: Mat. 20:28

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà mgbapụta Jizọs?