Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Ka Mma Ị Ga-esi Na-ele Àgwà Ndị Na-adịghị Gị Mma Anya

Otú Ka Mma Ị Ga-esi Na-ele Àgwà Ndị Na-adịghị Gị Mma Anya
  •   Ị na-emekarị ihe ọ bụla batara gị n’obi; di gị ma ọ bụ nwunye gị na-achọ ka e buru ụzọ hazie ihe nke ọma.

  •   Ị bụghị onye okwu, ị bụ onye ihere; di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwukarị okwu, na-achọkarịkwa ka ya na ndị mmadụ na-anọ.

 Di gị ma ọ bụ nwunye gị, ò nwere àgwà na-adịghị gị mma? Ịna-echekarị banyere ya nwere ike ịkpatara unu nsogbu. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na “onye na-ekwukarị gbasara ihe ọjọọ e mere ya na-ekewa ndị bụ́ ezigbo enyi.”​—Ilu 17:9.

 Kama ikwe ka àgwà na-adịghị mma di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa butere unu esemokwu, gbalịa ka ị na-ele ya anya otú ka mma.

Ihe dị n’isiokwu a

 Otú ka mma ị ga-esi na-ele àgwà ndị na-adịghị gị mma anya

 Àgwà na-adịghị gị mma di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa nwedịrị ike inwe otú ya na àgwà ya ọzọ na-amasị gị si yie. Legodị ihe atụ atọ ndị a:

 “Di m anaghị eme ọsọ ọsọ ma ọ na-eme ihe ma ọ bụ na-ejikere ịga ihe. Ma àgwà a mere ya ka ọ na-enwe ndidi. Mgbe ụfọdụ, otú ahụ o si eme ihe nwayọọ nwayọọ na-ewute m, ma o so n’ihe mere ihe ya ji amasị m.”​—Chelsea.

 “Nwunye m ma ka esi ahazi ihe nke ọma; ọ na-achọ ka ihe niile dịrị otu ọ chọrọ. Ihe a na-ewe m iwe. Ma otu a anya si ruo ya ala mere ka ihe ọ bụla nwee ọnọdụ.”​—Christopher.

 Ihe anaghị adịkarị di m ọkụ ọkụ n’ahụ. Ihe a na-ewekasịkwa m ahụ́. Ma otú a o si akpa àgwà so n’ihe ndị mere ihe ya ji masị m mgbe anyị malitere ịkpa. Otú o si anọ nwayọọ n’oge nsogbu na-atọ m ụtọ.”​—Danielle.

 Ihe Chelsea, Christopher na Danielle kwuru gosiri na àgwà ndị na-adịghị gị mma di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa nakwa àgwà ya ndị na-amasị gị nwere ike inwe otú ha si yie. Ya dị otú ahụ, ọ pụtara na ọ kwụsị ndị nke na-adịghị gị mma, ọ ga-akwụsịkwa ndị nke ahụ na-amasị gị. O yiri ụkwụ abụọ dị n’ígwè gị. Ị gaghị atụfu otu, jiri naanị otu na-agba ya.

 Ma, àgwà ụfọdụ na-adịghị anyị mma enweghịdị àgwa dị mma ya na ya yiri. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị “na-ewekarị iwe.” (Ilu 29:22) N’ihi ya, mmadụ kwesịrị ịgba mbọ kwụsị ‘inwe ụdị obi ilu ọ bụla, iwe, ọnụma, iti mkpu na ịkparị mmadụ.’ a​—Ndị Efesọs 4:31.

 Ma ọ bụrụ naanị na àgwà ahụ anaghị adịghị gị mma, mee ihe a Baịbụl kwuru, ya bụ, “Na-edirinụ ibe unu ihe, . . . ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.”​—Ndị Kọlọsi 3:13.

 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịgba mbọ chọpụta àgwà dị mma ya na nke ahụ yiri nke nwere ike iso n’ihe mere ihe ya ji masị gị mgbe unu malitere ịkpa. Otu nwoke aha ya bụ Josef sịrị, “Ịna-echekarị banyere àgwà na-adịghị gị mma dị ka ebe mmadụ na-echeta naanị na dayamọnd nwere ike iyiwa mmadụ aka ma chefuo na ọ makwara mma ile anya.”

 Ihe ga-enyere unu aka ịma ihe unu ga-akparịta

 Onye nke ọ bụla n’ime unu buru ụzọ zaa ajụjụ a n’onwe ya. Unu mechazie, unu ekwurịta ihe ndị unu zara.

  •   È nwere àgwà di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa na-adịghị gị mma, nke i chere na ọ na-akpatara unu nsogbu? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ọ bụ?

  •   Àgwà ahụ ọ̀ bụ àgwà ọjọọ ka ọ̀ bụ naanị na ọ dịghị gị mma?

  •   È nwere àgwà dị mma ya na ya yiri? Ọ bụrụ na e nwere, olee ihe ọ bụ? Gịnị mere àgwà nke a ji amasị gị?