Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jọn 3:16​—‘N’ihi na Chineke Hụrụ Ụwa n’Anya Otú A’

Jọn 3:16​—‘N’ihi na Chineke Hụrụ Ụwa n’Anya Otú A’

 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 3:​16, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi.”​—Jọn 3:16, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Jọn 3:16 Pụtara

 Chineke hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ihe a mere o ji zite Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, n’ụwa. Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ o mere bụ ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya gbasara Nna ya, bụ́ Chineke. (1 Pita 1:3) Ihe ọzọ o mere bụ iji ndụ ya chụọ àjà maka ndị mmadụ. Anyị ga-enwerịrị okwukwe na Jizọs ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi.

 E ji okwu a bụ́ “o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya” a kọwaa otú Chineke hụruru anyị n’anya. Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, bụ ọpụrụiche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke ji aka ya kee. (Ndị Kọlọsi 1:17) Jizọs bụ “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) E si n’aka Jizọs kee ihe ndị ọzọ niile, ma ndị mmụọ ozi ndị ọzọ. N’agbanyeghị ya, Jehova b Chineke zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu “ka o jee ozi ma nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Jizọs tara ahụhụ ma nwụọ iji napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ anyị butere n’aka nwoke mbụ, bụ́ Adam.​—Ndị Rom 5:​8, 12.

 Mmadụ inwe okwukwe na Jizọs karịrị onye ahụ ikwere na ya ma ọ bụ onye ahụ ikweta na o nwere ihe Jizọs meere anyị. Otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe n’Ọkpara Chineke bụ ịna-erubere ya isi na ịna-eme ka ya. (Matiu 7:​24-27; 1 Pita 2:21) Baịbụl kwuru, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi. Onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ.”​—Jọn 3:36.

Ihe Ndị Gbara Jọn 3:16 Gburugburu

 Ọ bụ Nikọdimọs, bụ́ otu n’ime ndị isi n’okpukpe ndị Juu, ka Jizọs gwara ihe a. (Jọn 3:​1, 2) Mgbe ya na Jizọs na-ekwu, Jizọs mere ka a mata ọtụtụ ihe gbasara Alaeze Chineke, c kwuokwa gbasara ‘ịmụ mmadụ ọzo.’ (Jọn 3:3) Jizọs kwukwara gbasara otú a ga-esi egbu ya. O kwuru, sị: “A ga-eweli Nwa nke mmadụ elu [kwụwa ya n’osisi], ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:​14, 15) Jizọs meziri ka o doo anya na ihe mere Chineke ji kwee ụmụ mmadụ nkwa ndụ ebighị ebi bụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Jizọs pịachiziri okwu ya mgbe o kwuru na ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndụ, na anyị ga-enwerịrị okwukwe na ya, na-emekwa ihe dị Chineke mma.​—Jọn 3:​17-21.

a Okwu Grik a sụgharịrị “mụrụ naanị ya” bụ monogenes. Otú otu akwụkwọ si kọwaa ya bụ “naanị otu, . . . ihe a na-enweghị ụdị ya ọzọ ma ọ bụ ihe na-enweghị oyiri.”​—A Greek-English Lexicon of the New Testament and Other Early Christian Literature, peeji nke 658.

b Ezigbo aha Chineke bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

c A kpọkwara Alaeze Chineke “Alaeze eluigwe.” Ọ bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. (Matiu 10:7; Mkpughe 11:15) Chineke họpụtara Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze Alaeze a. Alaeze Chineke ga-emezu uche Chineke maka ụwa. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?