Gaa n'Isiokwu

Ole Ndị Na-aga Hel?

Ole Ndị Na-aga Hel?

Ihe Baịbụl kwuru

 Hel (ya bụ, “Shiol” na “Hedis” n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl) pụtara ili, ọ bụghị ebe a na-ata mmadụ ahụhụ n’ọkụ. Ole ndị na-aga hel? Ma ndị ezigbo mmadụ ma ndị ajọ mmadụ na-aga na ya. (Job 14:13; Abụ Ọma 9:​17) Baịbụl kwuru na ili a bụ ‘ụlọ nke onye ọ bụla dị ndụ ga-aga.’​—Job 30:23.

 Jizọs gadịrị hel ma ọ bụ Hedis mgbe ọ nwụrụ. Ma, “a hapụghị ya n’ime Hedis” n’ihi na Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ.​—Ọrụ Ndịozi 2:​31, 32.

Ndị gara hel hà ga-anọ ebe ahụ ruo ebighị ebi?

 Ndị niile gara hel ga-apụta ọzọ. Jizọs ga-eji ike Chineke mee ka ha dị ndụ ọzọ. (Jọn 5:​28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15) Mkpughe 20:13 kwuru banyere mbilite n’ọnwụ ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu, sị: “Ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” Mgbe ndị niile nọ na hel pụtachara, hel agazighị adị. E nweghịzi onye ga-aga ebe ahụ n’ihi na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.”​—Mkpughe 21:​3, 4; 20:14.

 Ma, ọ bụghị onye ọ bụla nwụrụnụ na-aga Hel. Baịbụl kwuru na e nwere ndị ihe ọjọọ bara n’ụmị nke na ha enweghị ike ichegharị. (Ndị Hibru 10:26, 27) Mgbe ndị dị otú ahụ nwụrụ, ebe ha na-aga abụghị hel, kama ha na-aga Gehena nke nọchiri anya mbibi ebighị ebi. (Matiu 5:​29, 30) Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị ndú okpukpe ihu abụọ e nwere n’oge ya ga-aga Gehena.​—Matiu 23:27-​33