Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma Ọ Bụrụ na M Na-arịa Ọrịa Na-anaghị Ala Ala?

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma Ọ Bụrụ na M Na-arịa Ọrịa Na-anaghị Ala Ala?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee, Baịbụl nwere ike inyere gị aka. Chineke na-enyere ndị na-efe ya aka ma ha na-arịa ọrịa. Baịbụl kwuru banyere onye Chineke na-arịa ọrịa, sị: “Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa.” (Abụ Ọma 41:3) Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala, ihe atọ a ga-enyere gị aka idi ya:

  1.   Kpegara Chineke ekpere ka o nye gị ike ị ga-eji die ya. I mee otú a, Chineke ga-enye gị ‘udo ya nke karịrị echiche niile.’ Udo ahụ Chineke ga-enye gị ga-eme ka ị kwụsịlata ichegbu onwe gị, meekwa ka i die nsogbu ahụ.​—Ndị Filipaị 4:6, 7.

  2.   Na-enwe obi ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru uju oge nile na-akpata ọrịa.” (Ilu 17:22, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Na-enwe obi ụtọ. Inwe obi ụtọ ga-eme ka obi ghara ịna-ajọcha gị njọ, ọ ga-emekwa ka ahụ́ gbasie gị ike.

  3.   Obi sie gị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Inwe olileanya na ihe ga-aka mma ga-eme ka obi na-atọ gị ụtọ, ọ bụrụgodị na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala. (Ndị Rom 12:12) Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe a na-agakwaghị enwe onye ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.” (Aịzaya 33:24) Mgbe ahụ, Chineke ga-ewepụ ọrịa niile nyịrị ndị ụlọ ọgwụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịna-aka nká. Ọ sịrị: “Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata; ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.”​—Job 33:25.

 Ihe ị ga-eburu n’obi: N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova ghọtara na Chineke na-enyere ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala aka, Ndịàmà Jehova na-agakwa ụlọ ọgwụ. (Mak 2:17) Ma anyị anaghị agwa onye na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala otú a ga-esi agwọ ya, ọ bụ onye ahụ na-arịa ọrịa ga-ekpebi otú a ga-esi agwọ ya.