Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?

Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?

Ihe Baịbụl kwuru

 Akwụkwọ ikpeazụ na Baịbụl kwuru na akara 666 bụ nọmba ma ọ bụ aha otu anụ ọhịa nwere isi asaa na mpi iri nke si n’oké osimiri pụta. (Mkpughe 13:​1, 17, 18) Anụ ọhịa a nọchịrị anya ọchịchị niile dị n’ụwa, bụ́kwa nke na-achị “ebo niile na ndị niile na asụsụ niile na mba niile.” (Mkpughe 13:7) Akara ahụ bụ 666 gosiri na ọchịchị ụwa a kụrụ afọ n’ala kpamkpam n’anya Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo ya?

  Ọ bụghị akara nkịtị. Aha ndị Chineke n’onwe ya nyere na-enwe ihe ha pụtara. Dị ka ihe atụ, Chineke nyere Ebram, nke pụtara “Nna Bụ Ihe Ukwu,” aha bụ Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mmadụ.” Ọ bụ mgbe Chineke kwere Ebreham nkwa na ya ga-eme ka ọ ghọọ “nna nke ìgwè mba dị iche iche” ka o nyere ya aha ọhụrụ a. (Jenesis 17:5) Otú ahụkwa ka Chineke si nye anụ ọhịa ahụ akara bụ́ 666 ka e jiri ya kọwaa ụdị ihe ọ bụ.

  Nọmba bụ́ isii nọchiri anya ihe na-ezughị okè. Ọtụtụ mgbe na Baịbụl a na-eji nọmba anọchi anya ihe. Nọmba bụ́ asaa na-anọchikarị anya ihe zuru okè. Ebe ọ bụ na isii ji otu ghara iru asaa, a na-ejikarị isii akọwa ihe na-ezughị ezu, ma ọ bụ ihe na-ezughị okè n’anya Chineke. A na-ejikwa ya akọwa ndị bụ́ ndị iro Chineke.​—1 Ihe E Mere 20:6; Daniel 3:1.

  E kwuru ya ugboro atọ iji mesie okwu ike. Na Baịbụl a chọọ imesi okwu ike, a na-ekwu ya ugboro atọ. (Mkpughe 4:8; 8:13) N’ihi ya, akara ahụ bụ́ 666 na-eme ka anyị ghọta nnọọ na Chineke na-ele ọchịchị ụwa anya ka ihe kụrụ afọ n’ala kpamkpam. Ha enwebeghị ike ime ka e nwee udo ga-adite aka n’ụwa ma ọ bụ ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli ihe ndị a.

Akara nke anụ ọhịa

 Baịbụl kwuru na ndị mmadụ na-enweta “akara nke anụ ọhịa” n’ihi na ha ji “oké mmasị” na-eso anụ ọhịa ahụ ruo nke na ha na-efe ya ofufe. (Mkpughe 13:​3, 4; 16:2) Otú ha si eme nke a bụ ife mba ha, ihe ndị e ji mara mba ha, na ngwá agha mba ha kwakọbara. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion kwuru, sị: “Mmadụ ịhụ obodo ya n’anya aghọọla ụdị okpukperechi nke ya n’ụwa ugbu a.” *

 Olee otú e si aka mmadụ akara anụ ọhịa n’aka nri ma ọ bụ n’egedege ihu? (Mkpughe 13:16) Mgbe Chineke na-enye mba Izrel iwu, ọ sịrị ha: “Keekwa ha n’aka unu dị ka ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa ihe unu ga na-ekegide n’egedege ihu unu.” (Diuterọnọmi 11:18) Ihe ebe a na-ekwu abụghị na ndị Izrel ga-eji ihe kee n’aka ha nakwa n’egedege ihu ha nkịtị, kama ihe ọ pụtara bụ na okwu Chineke ga na-eduzi ma echiche ha ma ihe niile ha na-eme ná ndụ. Otú ahụkwa ka ọ dị akara 666, ọ bụghị akara nkịtị a kanyere n’ahụ́, kama akara anụ ọhịa bụ ihe atụ e ji ama ndị kwere ka ọchịchị ụwa a bụrụ ihe na-eduzi ndụ ha. Ndị nwere akara anụ ọhịa na-eme onwe ha ka ha bụrụ ndị iro Chineke.​—Mkpughe 14:​9, 10; 19:​19-21.

^ Gụọkwa Nationalism in a Global Era, peeji nke 134, na Nationalism and the Mind: Essays on Modern Culture, peeji nke 94.