Mkpughe E Kpugheere Jọn 14:1-20

  • Nwa Atụrụ ahụ na 144,000 (1-5)

  • Ozi ọma dị iche iche ndị mmụọ ozi atọ ziri (6-12)

    • Otu mmụọ ozi nọ n’etiti eluigwe na-ezisa ozi ọma (6, 7)

  • Ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu ha anwụọ ga-enwe obi ụtọ (13)

  • Ugboro abụọ e were ihe ubi n’ụwa (14-20)

14  M wee hụ Nwa Atụrụ ahụ+ ka o guzo n’Ugwu Zayọn,+ ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000).+ E dere aha ya na aha Nna ya+ n’egedege ihu ha.  Anụkwara m ụda si n’eluigwe, nke dị ka ụda mmiri na-asọ ike ike, dịkwa ka ụda oké égbè eluigwe. Ụda ahụ m nụrụ dịkwa ka nke ndị na-abụ abụ, ndị na-akpọ ụbọ akwara ha ka ha na-abụ abụ.  Ha na-abụkwa abụ yiri abụ ọhụrụ+ n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu ndị mmụọ ozi anọ ahụ*+ na n’ihu ndị okenye ahụ.+ O nweghịkwa onye mụtaliri abụ ahụ ma e wezụga otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ahụ,+ ndị Chineke zụtara n’ụwa.  Ndị a ejighị ụmụ nwaanyị merụọ onwe ha. N’eziokwu, ha dị ka ụmụ nwaanyị na-amaghị nwoke.+ Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga.+ Chineke si n’ụmụ mmadụ zụta ha+ ka ha bụụrụ ya na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ.+  Aghụghọ ọ bụla adịghịkwa n’ọnụ ha. Ha enweghịkwa ntụpọ ọ bụla.+  Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe.* Ọ nọ na-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile ozi ọma ga-adịru mgbe ebighị ebi.+  O ji oké olu na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke, tookwanụ ya, n’ihi na oge ọ ga-eji ekpe ndị mmadụ ikpe eruola.+ N’ihi ya, feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri+ na isi mmiri niile.”  Mmụọ ozi nke abụọ wee sochie nke mbụ, sị: “Babịlọn Ukwu ahụ+ adaala! Ọ daala!+ Ọ bụ ya bụ onye mere ka mba niile ṅụọ mmanya ya nke na-eme ka ịkwa iko* gụsiwe ha agụụ ike!”+  Mmụọ ozi nke atọ wee sochie ha, jiri oké olu sị: “Onye ọ bụla a kara akara n’egedege ihu ya ma ọ bụ n’aka ya,+ nke na-efekwa anụ ọhịa ahụ+ na ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ, 10  ga-aṅụkwa mmanya Chineke, nke bụ́ iwe ya. A gwaghị mmanya a agwa. Chineke ga-agbanyekwa ya n’iko iwe ya.+ A ga-ejikwa ọkụ na sọlfọ+ mekpaa onye ahụ ahụ́ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. 11  Ọkụ e ji na-emekpa ha ahụ́ ga na-akwụ anwụrụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Ndị ahụ na-efe anụ ọhịa ahụ na ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ, na onye ọ bụla a kara akara nke aha anụ ọhịa ahụ,+ agaghịkwa ezu ike ma n’ehihie ma n’abalị. 12  Ndị nsọ, bụ́ ndị na-edebe iwu Chineke, ndị nwekwara okwukwe+ ka Jizọs, kwesịrị ịtachi obi.”+ 13  Anụkwara m olu si n’eluigwe sị, “Dee ihe a: Si ugbu a gawa, ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu+ tupu ha anwụọ ga-enwe obi ụtọ. Mmụọ nsọ na-asị ka ha zuru ike n’ọrụ ha nọ na-arụ, n’ihi na a gaghị echefu ya.”* 14  Ahụkwara m ígwé ojii na-acha ọcha, na onye yiri nwa nke mmadụ+ nke nọ ọdụ n’elu ígwé ojii ahụ, onye kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ya. O jikwa mma dị nkọ e ji ewe ihe ubi n’aka. 15  Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ pụta, jiri oké olu gwa onye ahụ nọ ọdụ n’elu ígwé ojii ahụ, sị: “Were mma i ji ewe ihe ubi ghọrọ mkpụrụ, n’ihi na ihe ubi nke ụwa achaala nke ọma,+ oge e ji aghọ mkpụrụ eruokwala.” 16  Onye ahụ nọ ọdụ n’elu ígwé ojii ahụ wee jiri mma o ji ewe ihe ubi ghọrọ mkpụrụ ndị dị n’ụwa. 17  Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ dị n’eluigwe pụta. Yanwa jikwa mma dị nkọ e ji ewe ihe ubi. 18  Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe ịchụàjà ahụ pụta. E nyekwara ya ikike ịhụ maka ọkụ. O wee jiri oké olu gwa mmụọ ozi ahụ ji mma e ji ewe ihe ubi, sị: “Were mma dị nkọ i ji ewe ihe ubi ghọrọ ụyọkọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’ụwa, n’ihi na mkpụrụ ha achaala.”+ 19  Mmụọ ozi ahụ wee tinye mma o ji ewe ihe ubi n’ụwa ma ghọrọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’ụwa. Ọ wụbakwara ha n’ime nnukwu ebe a na-azọchapụta mmanya nke nọchiri anya iwe Chineke.+ 20  A zọchakwara mkpụrụ vaịn ahụ n’ebe a na-azọchapụta mmanya nke dị n’azụ obodo, ọbara esikwa ebe ahụ na-asọpụta, tookwa ruo n’eriri e kere ịnyịnya n’olu, ruo ebe dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri itoolu na isii (296).*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”
Ma ọ bụ “ọ na-efegharị n’elu.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “ọrụ ha rụrụ na-eso ha.”
Na Grik, “stediọm 1,600.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.