Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Baptizim?

Gịnị Bụ Baptizim?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọ bụrụ na e mee mmadụ baptizim, ọ pụtara na e mikpuru onye ahụ n’ime mmiri ma selite ya. * Ọ bụ ya mere Jizọs ji gaa n’osimiri, e mee ya baptizim. (Matiu 3:13, 16) Mgbe otu nwoke onye Etiopia ruru “n’otu mmiri,” ọ sịrị ka e mee ya baptizim.—Ọrụ Ndịozi 8:36-40.

Ihe ime baptizim pụtara

 Na Baịbụl, e ji otú e si eme baptizim tụnyere otú e si eli mmadụ. (Ndị Rom 6:4; Ndị Kọlọsi 2:12) Mmadụ ime baptizim ná mmiri pụtara na onye ahụ nwụọla n’ihe gbasara otú o si ebi ndụ na mbụ, ya bụ na ọ kwụsịla ibi ndụ ọjọọ, ghọzie onye Kraịst nyefere Chineke onwe ya ma biwe ndụ ọhụrụ. Baptizim na ihe mmadụ ga-eme iji ruo eruo ime ya bụ ndokwa Chineke mere ka mmadụ nwee ike inwe ezigbo akọnuche maka na onye ahụ nwere okwukwe n’àjà Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ. (1 Pita 3:21) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime baptizim.—Matiu 28:19, 20.

Mmadụ ime baptizim ná mmiri ọ̀ na-asachapụ mmehie?

 Mba. Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ọbara Jizọs na-asachapụ mmadụ mmehie. (Ndị Rom 5:8, 9; 1 Jọn 1:7) Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ baara ya uru, onye ahụ kwesịrị inwe okwukwe na Jizọs, kwụsị ibi ndụ ọjọọ mewe ihe Jizọs kụziri, meekwa baptizim.—Ọrụ Ndịozi 2:38; 3:19.

Gịnị bụ ime mmiri chukwu?

 Okwu ahụ bụ́ ime mmiri chukwu adịghị na Baịbụl. Ụfọdụ chọọchị na-eme ụmụaka mmiri chukwu sị na ha emeela ha baptizim. Otú ha si eme ya bụ ifesa ha mmiri n’isi ma ọ bụ ikuru mmiri wụọ ha n’isi, ma gụọ ha aha mmiri chukwu.

Baịbụl ò kwuru ka a na-eme ụmụaka baptizim?

 Mba, o kwughị otú ahụ. Baptizim ndị Kraịst na-eme bụ maka ndị torurula ịghọta “ozi ọma gbasara Alaeze Chineke” ka ha nwee ike ikwere na ya. (Ọrụ Ndịozi 8:12) Onye ahụ ga-enwe ike ịnụ okwu Chineke, nabata ya, ma chegharịa. Ụmụaka agaghị emeli ihe ndị a.—Ọrụ Ndịozi 2:22, 38, 41.

 Ihe ọzọ bụ na Baịbụl gosiri na Chineke na-ewere ụmụntakịrị ndị na-efe ya mụrụ ka ndị dị nsọ ma ọ bụ ndị dị ọcha n’anya ya n’ihi na nne na nna ha ji obi ha na-efe ya. (1 Ndị Kọrịnt 7:14) Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka a na-eme ụmụaka baptizim, ọ gaghị na-ele ụmụntakịrị ndị ahụ anya ka ndị dị ọcha n’ihi nne na nna ha na-efe ya. *

Ihe ndị na-abụghị eziokwu a na-ekwu banyere baptizim

 Ụgha: E nwere ike iji ifesa mmadụ mmiri n’isi dochie anya imikpu mmadụ ná mmiri mgbe a na-eme ya baptizim.

 Eziokwu: E mikpuchara ndị niile Baịbụl kwuru na e mere baptizim n’ime mmiri mgbe e mere ha baptizim. Dị ka ihe atụ, mgbe Filip onye na-eso ụzọ Jizọs mere nwoke Etiopia baptizim, ha ‘banyere ná mmiri.’ Mgbe o mechara baptizim, ‘ha si ná mmiri ahụ pụta.’—Ọrụ Ndịozi 8:36-39. *

 Ụgha: Mgbe Baịbụl kwuru na e mere mmadụ niile nọ n’ezinụlọ baptizim, ọ pụtara na ụmụaka so ná ndị e mere baptizim. Dị ka ihe atụ, o kwuru gbasara otu nwoke na-elekọta ụlọ mkpọrọ na Filipaị, sị: ‘E mere ya na ndị ezinụlọ ya niile baptizim.’—Ọrụ Ndịozi 16:31-34.

 Eziokwu: Ihe Baịbụl kwuru gbasara nwoke ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ, nke ghọrọ onye Kraịst, gosiri na ndị ahụ e mere baptizim ghọtara “okwu Jehova” nakwa na obi bụ nwoke ahụ na ezinụlọ ya “sọ aṅụrị.” (Ọrụ Ndịozi 16:32, 34) Ihe ndị a Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụrụ na e nwere ụmụaka n’ezinụlọ nwoke ahụ, ọ pụtara na ha esoghị ná ndị e mere baptizim n’ihi na ha agaghị aghọtali okwu Jehova.

 Ụgha: Mgbe Jizọs kwuru na Alaeze eluigwe bụ nke ụmụntakịrị, ọ pụtara na ihe ọ na-ekwu bụ na e kwesịrị ime ụmụntakịrị baptizim.—Matiu 19:13-15; Mak 10:13-16.

 Eziokwu: Mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ, ọ bụghị ihe gbasara baptizim ka ọ nọ na-ekwu. Kama, ihe ọ nọ na-ekwu bụ na ndị ga-aba n’Alaeze Chineke kwesịrị ịdị ka ụmụntakịrị, ya bụ, na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi, na-anabatakwa ihe a na-akụziri ha otú ụmụntakịrị si eme.—Matiu 18:4; Luk 18:16, 17.

^ Okwu Grik e si sụgharịta okwu bụ́ baptizim si n’okwu pụtara “imikpu.” Tụlee akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament, Mpịakọta nke I, peeji nke 529.

^ Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru na “o nweghị ebe Agba Ọhụrụ kwuru gbasara ime nwa a ka ku n’aka baptizim.” O kwukwara na ihe mere e ji malite mewe ụmụntakịrị a ka ku n’aka baptizim bụ na ndị mmadụ “ghọtahiere ihe mere e ji eme baptizim.” Ha na-ekwu na ọ bụ baptizim na-asachapụ mmehie.—Mpịakọta nke 1, peeji nke 416-417.

^ N’isiokwu bụ́ “Baptizim (nke e kwuru gbasara ya na Baịbụl)” nke dị n’akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia, e kwuru, sị: “O doro anya na otú e si eme ndị mmadụ baptizim na chọọchị n’oge gboo bụ imikpu ha ná mmiri.”—Mpịakọta nke 2, peeji nke 59.