Gaa n'Isiokwu

Okpukpe Niile Hà Bụ Otu? Ha Niile Hà Na-enyere Mmadụ Aka Ịmata Onye Chineke Bụ?

Okpukpe Niile Hà Bụ Otu? Ha Niile Hà Na-enyere Mmadụ Aka Ịmata Onye Chineke Bụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba, okpukpe niile abụghị otu. Baịbụl kwuru banyere okpukpe dị iche iche ndị na-anaghị eme ihe Chineke chọrọ. E nwere ike ikwu na e kere ha niile ụzọ abụọ.

Nke mbụ: Ndị na-efe chi ụgha

 Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere ife chi ụgha, o kwuru na ọ bụ “naanị ume e kupụrụ ekupụ,” nakwa “ihe efu na ihe ndị na-enweghị uru ha bara.” (Jeremaya 10:​3-5; 16:19, 20) Jehova * Chineke nyere ndị Izrel iwu, sị: “Enwela chi ọ bụla ọzọ tinyere m.” (Ọpụpụ 20:​3, 23; 23:24) Mgbe ndị Izrel fekwara chi ndị ọzọ, ‘Jehova were iwe dị ọkụ.’​—Ọnụ Ọgụgụ 25:3; Levitikọs 20:2; Ndị Ikpe 2:​13, 14.

 Otú ahụ ka obi ka na-adịkwa Chineke ma mmadụ na-efe ihe ndị ahụ “a na-akpọ ‘chi.’” (1 Ndị Kọrịnt 8:​5, 6; Ndị Galeshia 4:8) O nyere ndị chọrọ ife ya iwu ka ha na ndị na-efe chi ụgha kwụsị ịkpa. O kwuru, sị: “Sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụnụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrịnt 6:​14-​17) Ọ bụrụ na okpukpe niile bụ otu, na-enyekwara ndị mmadụ aka ka ha na Chineke dị ná mma, gịnịzi mere Chineke ji nye iwu a?

Nke abụọ: Ndị na-efe Chineke otú ọ na-achọghị

 Mgbe ụfọdụ, ndị Izrel fewe Chineke, ha emewe ihe ndị na-efe chi ụgha na-eme ma ọ bụ kwerewe ihe ndị ha kweere. Ma, mgbe ọ bụla ha mewere otú ahụ, Jehova anaghị anabata ofufe ha. (Ọpụpụ 32:8; Diuterọnọmi 12:​2-4) Jizọs katọrọ ndị ndú okpukpe nọ n’oge ya n’ihi otú ha si efe Chineke. Ha na-eme ka à ga-asị na ha ji obi ha niile efe Chineke ma ha na-eme ihu abụọ. Ha ‘leghaara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.’​—Matiu 23:23.

 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụ naanị okpukpe nke na-akụzi eziokwu si na Baịbụl na-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye Chineke bụ. (Jọn 4:​24; 17:17; 2 Timoti 3:​16, 17) Okpukpe ndị na-anaghị akụzi ihe dị na Baịbụl na-eme ka ndị mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. Ọtụtụ ozizi ndị mmadụ chere na ha si na Baịbụl, dị ka, ozizi Atọ n’Ime Otu, mkpuru obi anaghị anwụ anwụ, na ịta mmadụ ahụhụ ebighị ebi, bụ n’okpukpe ndị na-efe chi ụgha ka ha si. Okpukpe ndị na-akụzi ụdị ihe ndị a enweghị isi. Ha bụkwa “ihe efu” n’ihi na ha na-akụzi omenala okpukpe kama ịkụzi iwu Chineke.​—Mak 7:​7, 8.

 Chineke kpọrọ ihu abụọ ndị okpukpe na-eme asị. (Taịtọs 1:​16) Okpukpe ọ bụla chọrọ inyere ndị mmadụ aka ịbịaru Chineke nso kwesịrị ịna-akụziri ndị mmadụ ka ha na-akpa ezigbo àgwà ọ bụghị ịna-akụziri ha omenala okpukpe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya bụ onye na-ekpere Chineke, mgbe ọ dịghị akwa ire nke ya nga, kama ọ na-aghọ obi ya aghụghọ, okpukpe Chineke nke onye a bụ ihe efu. Okpukpe Chineke nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emeru n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndi inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”​—Jems 1:​26, 27, Bible Nsọ nke Union Version.

^ Baịbụl kwuru na aha ezi Chineke bụ Jehova.