Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Briten

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Ọ bụrụ na unu agaghị eru iri abụọ, Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya​—Maka Ndị Na-erughị Mmadụ Iri Abụọ.” Ma ọ bụghị ya, kpọọ anyị na fon iji gwa anyị na unu ga-adị mmadụ iri abụọ ma ọ bụ karịa.

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.

Adres Ya

1 Kingdom Way

West Hanningfield

CHELMSFORD

CM2 8FW

ENGLAND

+44 20-8906-2211

Ihe A Na-eme

Alaka ụlọ ọrụ a na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma Ndịàmà Jehova na-arụ na Briten, Ayaland na Mọlta. Ha na-ahazikwa maka ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ndị ogbi Briten, n’asụsụ Aịrish, Scottish Gaelic na Welsh. Ha na-emepụtakwa vidio na ihe ndị a na-egere egere.

Ebe Mmadụ Ga-elegharị Anya n’Onwe ya

  1. “Ihe Nketa Anyị”: N’ebe a, ị ga-ahụ otú Ndịàmà Jehova si malite izi ozi ọma na Briten na Ayaland.

  2. “Ịsụgharị na Ibipụta Baịbụl na Briten”: N’ebe a, e nwere Baịbụl ndị merela ochie ọtụtụ ndị na-enweghị. E gosikwara mbọ ndị a gbarala n’ịsụgharị Baịbụl kemgbe ọtụtụ narị afọ.

  3. Ngalaba Ndị Dị n’Alaka Ụlọ Ọrụ Briten: E nwere foto na vidio ndị kọwara ọrụ ndị a na-arụ n’Alaka Ụlọ Ọrụ Briten.

Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ