Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Kweere n’Agba Ochie?

Ndịàmà Jehova Hà Kweere n’Agba Ochie?

 Ee. Ndịàmà Jehova kweere na Akwụkwọ Nsọ dum ‘si n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru.’ (2 Timoti 3:​16) Ma Agba Ochie ma Agba Ọhụrụ socha n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, ihe Ndịàmà Jehova na-akpọkarị ha bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ihe mere ha ji akpọ ha aha ndị a bụ ka ọ ghara ịdị ka è nwere nke merela ochie ma ọ bụ nke na-adịghịzi mkpa.

Gịnị mere Agba Ochie na Agba Ọhụrụ ji dị Ndị Kraịst mkpa?

 Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka.” (Ndị Rom 15:4) N’ihi ya, e nwere ihe ndị ga-abara anyị uru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma é nweghị ihe ọzọ, akụkọ ndị a kọrọ na ya na ndụmọdụ ndị dị na ya ga-abara anyị uru.

  •   Akụkọ ndị dị ezigbo mkpa. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a kọrọ gbasara otú Chineke si kee ihe na otú Adam na Iv si mehie Chineke. A sị na Baịbụl emeghị ka anyị mara ihe ndị a, anyị agaraghị ama otú mmadụ si bido dịwa na ihe mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ? (Jenesis 2:7, 17) Ihe ọzọkwa bụ na Akwụkwọ Hibru kọọrọ anyị otú Jehova Chineke si mesoo ndị mmadụ ibe anyị ihe, bụ́ ndị ihe na-eme anyị obi ụtọ mere obi ụtọ na ndị nwere ụdị nsogbu anyị na-enwe.​—Jems 5:​17.

  •   Ndụmọdụ bara uru. Akwụkwọ Ilu na akwụkwọ Ekliziastis, ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nwere okwu amamihe ndị oge ha na-anaghị agafe agafe. Ha gwara anyị ihe anyị ga-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ anyị (Ilu 15:17), otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ (Ilu 10:4; Ekliziastis 4:6), na ihe kacha mma ndị na-eto eto ga-eji oge ntorobịa ha mee (Ekliziastis 11:9–​12:1).

 Anyị ga-eritekwa ezigbo uru ma anyị mụọ ihe ndị dị n’Iwu Mozis. Ha dị na Tora (ya bụ, akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl). Ọ bụ eziokwu na Iwu ahụ abụghị maka Ndị Kraịst, ma e nwere ezigbo ihe ndị dị na ya ga-eme ka ndụ anyị kakwuo mma.​—Levitikọs 19:18; Diuterọnọmi 6:​5-7.