Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-aga Ekwusa Ozi Ọma ná Mba Ọzọ?

Ndịàmà Jehova Hà Na-aga Ekwusa Ozi Ọma ná Mba Ọzọ?

 Ee. N’ebe ọ bụla Ndịàmà Jehova bi, ha na-agbalị ezi ndị si mba ọzọ ozi ọma. Ha na-aga mgbe niile akọrọ ndị mmadụ ihe ndị ha kweere.​—Matiu 28:19, 20.

 O nwekwara Ndịàmà Jehova na-aga ekwusa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ dị ná mba ha, ma ọ bụkwanụ ha akwaga ebe ndị ahụ n’ihi na e nweghị ndị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Ndịàmà Jehova ndị ọzọ na-akwaga ná mba ndị ọzọ ka ha nwee ike ịna-ekwusakwu ozi ọma. Obi dị ha ụtọ iso na-emezu amụma Jizọs buru. Ọ sịrị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”​—Ọrụ Ndịozi 1:8.

 N’afọ 1943, anyị hiwere ụlọ akwụkwọ a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Gilied ka a nọrọ na ya na-azụ Ndịàmà Jehova ụfọdụ ga-aga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ. Kemgbe ahụ e hiwere ya, ihe karịrị puku Ndịàmà Jehova asatọ agaala ya.