Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Aga Agha?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Aga Agha?

 Ọ bụ ihe ndị a e depụtara n’okpuru ebe a mere Ndịàmà Jehova anaghị aga agha:

  1.   Anyị na-erubere Chineke isi. Baịbụl kwuru na ndị na-efe Chineke ‘ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè’ nakwa na ha “agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:4.

  2.   Anyị na-erubere Jizọs isi. Jizọs gwara Pita onyeozi, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ndị na-eso ụzọ ya agaghị alụ agha.

     Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ịbụ nke ụwa. Otú ndị na-eso ụzọ Jizọs na-esi erube isi n’iwu a bụ na ha anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16) Ha anaghị eme ngagharị iwe maka na ndị ọchịchị na-alụ agha, ha anaghịkwa egbochi ndị mmadụ ịba amị.

  3.   Anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ‘na-ahụrịta ibe ha n’anya.’ (Jọn 13:34, 35) Ọ pụtara na ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe ụmụnna ná mba dị iche iche. O nweghịkwa onye ga-aga lụsowa nwanna ya nọ ná mba ọzọ ọgụ.—1 Jọn 3:10-12.

  4.   Anyị na-eme ka Ndị Kraịst oge mbụ. Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopedia of Religion and War kwuru, sị: “Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs ekweghị aga agha, ha ekweghịkwa aba amị.” Ha ghọtara na ihe ndị a “megidere iwu Jizọs nyere ha ka ha hụ ibe ha n’anya nakwa ka ha hụ ndị iro ha n’anya.” Onye Jamanị bụ́ ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe, onye aha ya bụ Peter Meinhold, kwuru banyere Ndị Kraịst oge mbụ, sị: “Ha weere ya na mmadụ agaghị abụli Onye Kraịst, bụrụkwa onye agha.”

Otú anyị si enye aka n’obodo

 Ndịàmà Jehova bụ ezigbo ụmụ amaala, ha anaghịkwa akpata nsogbu n’obodo ọ bụla ha nọ. Anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù n’ihi na anyị na-erube isi n’iwu ndị a Baịbụl nyere:

  •   “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị.”—Ndị Rom 13:1.

  •   “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Matiu 22:21.

 N’ihi ihe ndị a Baịbụl kwuru, anyị na-erube isi n’iwu, na-akwụ ụtụ isi anyị, na-enyekwara ndị ọchịchị aka n’ịrụrụ ọhaneze ọrụ.