Gaa n'Isiokwu

A Zara Otu Pastọ Ajụjụ Ya

A Zara Otu Pastọ Ajụjụ Ya

 E nwere otu ụbọchị otu nwaanyị Onyeàmà Jehova aha ya bụ Eliso nọ n’ụlọ otu nwaanyị na-akụziri ya Baịbụl, mmadụ abụọ nwaanyị ahụ na-atụghị anya ha abịa na nke ya. Ndị ahụ bịaranụ bụ otu pastọ na nwunye ya. Eliso anụbuola na o tebeghị aka otu mkpụrụ nwa nwoke ha nwụrụ.

 Mgbe Eliso kasichara ha obi maka ọnwụ nwa ha nwoke, pastọ ahụ na nwunye ya bewere ezigbo ákwá. Pastọ ahụ jikwa iwe kwuo, sị: “Amaghị m ihe mere Chineke ji gba nkịtị ụdị ihe a emee anyị! Gịnị mere o ji kpọrọ otu mkpụrụ nwa nwoke anyị mụrụ? M nọ na-efe Chineke kemgbe afọ iri abụọ na asatọ ugbu a, na-eme ọtụtụ ihe ọma, ya abụrụ otú a ka ọ ga-esi kwụọ m ụgwọ! Gịnị mere Chineke ji gbuo nwa m?”

 Eliso kọwaara di na nwunye ahụ na Chineke akpọrọghị nwa ha. Ọ gwara ha gbasara ihe mgbapụta, mbilite n’ọnwụ, nakwa ihe mere Chineke ji hapụ ka ihe ọjọọ na-eme. Pastọ ahụ na nwunye ya gwaziri Eliso na ọ zaala ha ajụjụ ndị ha nọ na-ekpe ekpere ka a zaa ha.

 Mgbe Eliso nọ na-akụziri nwaanyị ahụ Baịbụl n’izu ọzọ ya, pastọ ahụ na nwunye ya bịara soro ha. Ọ bụ akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ka ha nọ na-amụ, n’isiokwu bụ́ “Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ.” Pastọ ahụ na nwunye ya ji obi ha niile soro mụọ ihe ahụ.

 Ha abụọ mechara gaa otu mgbakọ pụrụ iche Ndịàmà Jehova nwere n’obodo Tibilisi dị na Jọjia. Otú ndị bịara mgbakọ ahụ si hụ ibe ha n’anya na otú ha si dịrị n’otu metụrụ ha n’ahụ́, n’ihi na ọ dịla anya ha nọ na-akụziri ndị chọọchị ha ka ha hụ ibe ha n’anya, dịrịkwa n’otu, ma otu abụghị n’ezi.