Gaa n'Isiokwu

Ihe Iwu Kwuru

Ihe Iwu Kwuru

Ikike Ịgbanwe Ihe

© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Naanị anyị ka ikike ịgbanwe ihe ọ bụla n’ebe a dị n’aka.

Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc. (“Watchtower”) na-etinye ihe n’ebe a, ọ bụkwa ha na-elekọta ya. Ọ bụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania nwe ihe niile dị ebe a, ọ gwụkwala ma ò nwere nke ha kwuru na ha si ebe ọzọ nweta.

Akara Ndị I Nwere Ike Ịhụ

Adobe, akara Adobe, Acrobat, na akara Acrobat bụ ihe ndị e ji mara ụlọ ọrụ a na-akpọ Adobe Systems Incorporated. iTunes na iPod bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ Apple Inc. Akara ndị ọzọ i nwekwara ike ịhụ ebe a bụ ihe iwu kwadoro e ji mara ndị nwe ha.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme na jw.org

Ihe e dere ebe a bụ ihe ndị i nwere ike ime na ihe ndị ị na-agaghị eme na jw.org a. Ọ bụrụ na ị na-aga na jw.org eme ihe ọ bụla na ya, ọ pụtara na i kwetara ihe niile e kwuru ebe a. Ọ bụrụ na i kwetaghị, agala na jw.org eme ihe ọ bụla.

Olee ihe ndị i nwere ike ime na jw.org? I nwere ike ibipụta akwụkwọ na foto ndị e nyere gị ikike ibipụta, geekwa abụ ma lee vidio. I nwekwara ike iwere ha tinye na kọmputa gị ma ọ bụ n’ekwentị gị ma ọ bụkwanụ n’ihe ndị ọzọ. Ma, ị gaghị ere ihe ọ bụla i si na jw.org were. O nwekwara ihe ndị ọzọ ị na-agaghị eme. Ị gaghị:

  • Etinye ihe i wetara na jw.org n’ebe ọ bụla ọzọ n’Ịntanet;

  • Ewere ihe ndị i wetara na jw.org tinyeghachi n’Ịntanet n’aha gị ma ọ bụ jiri ha mepụta ihe a ga-eji na-arụ ọrụ na kọmputa;

  • Emepụtaghachi ihe dị na jw.org ma ọ bụkwanụ were ya na-eresị ndị ọzọ, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o nweghị uru ị na-enweta na ya. Ị gaghịkwa na-ekesara ndị mmadụ ihe ha ga-eji na-arụ ọrụ na kọmputa nke nwere ihe jikọrọ ya na jw.org, ma ọ bụ nke na-ebuga mmadụ na jw.org;

  • Aga na jw.org ka i si na ya mepụta akara ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ị ga-eji were ihe ndị ị na-ekwesịghị iwere na jw.org, ma ọ bụkwanụ na-ekesara ọhaneze akara ndị ahụ;

  • Aga na jw.org mee ihe ị na-ekwesịghị ime na ya, ma ọ bụ gaa na ya were ihe otú a na-emeghị ka e si na-aga na ya ewere ihe;

  • Eme ihe ọ bụla ga-emebi jw.org, ma ọ bụ nke ga-eme ka ọ na-esi ike ịga na ya, ma ọ bụkwanụ nke ga-eme ka ndị mmadụ gharazie inwe ike ịna-aga na ya. Ị gaghịkwa aga na ya mee ihe ọ bụla iwu na-akwadoghị, ma ọ bụ gwuo wayo, ma ọ bụ gaa na ya mee ihe ọ bụla nwere otú o si gbasa ihe iwu na-akwadoghị ma ọ bụ nke nwere otú o si gbasa igwu wayo;

  • Aga na jw.org iji mee ihe ọ bụla nwere otú o si gbasa azụmahịa.

Gịnị Ga-eme Ma I Mee Ihe Ndị A A Sị Gị Emela?

Ọ bụrụ na i mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị a a sị gị emela, ndị nwe jw.org, ya bụ Watchtower, ga-eme gị ihe ọ bụla ha chere kwesịrị ekwesị ka e mee gị. Ha nwere ike ịmachi gị ịna-aga na jw.org ruo oge ụfọdụ, ma ọ bụ machie gị kpamkpam ịna-aga na ya, ma ọ bụ machie kọmputa ọ bụla ọzọ iji Ịntanet gị aga na jw.org, ma ọ bụ gwa ndị na-enye gị ikike ịga n’Ịntanet ka ha napụ gị ikike ịga na jw.org, ma ọ bụkwanụ gbaa gị akwụkwọ n’ụlọikpe.

Ịgbanwe Ihe E Kwuru

Watchtower nwere ike ịnọtụ gbanwee ihe ndị i nwere ike ime na ihe ndị ị na-agaghị eme na jw.org. A gbanwee ha, iwu ji gị ibido ụbọchị e tinyere ha ebe a mewe ha. Biko, na-abịa ebe a mgbe niile ka ị mata mgbe a gbanwere ihe.

Ebe Iwu Na-achị Ihe E Kwuru Ebe A Gbakwasịrị Ụkwụ

Ọ bụ iwu Steeti Niu Yọk dị n’Amerịka na-achị ihe niile e kwuru ebe a, ọ bụkwa ha ga-akọwa ihe ihe ọ bụla e kwuru ebe a pụtara n’agbanyeghị ihe iwu ọ bụla ọzọ nwere ike ikwu. Ọ bụ ụlọikpe steeti ma ọ bụ nke etiti, nke nwere ike ikpebi ikpe na Steeti Niu Yọk, dị n’Amerịka, ga-eleba anya n’okwu ikpe ọ bụla gbasara iwu e nyere ebe a.

Otu Iwu A Kagburu Agaghị Agbasa Iwu Ndị Ọzọ

Ọ bụrụ na ụlọikpe iwu kwadoro ekwuo na o nwere nke na-adabaghị adaba n’ime iwu ndị anyị tiri ebe a, ma ọ bụ nke ọ na-enweghị ihe a ga-eme onye dara ya, ma ọ bụkwanụ nke megidere iwu obodo, ọ gaghị agbasa iwu ndị ọzọ dị ebe a. Ọ bụrụ na Watchtower enweghị ihe ha mere onye dara nke ọ bụla n’ime iwu ndị a, ọ pụtaghị na ha akagbuola iwu ahụ, ma ọ bụ na ha enweghịzi ikike ime onye ahụ ihe ọ bụla.

Ihe Niile Gị na Watchtower Kwekọrịtara

Ihe niile e dere ebe a bụ ihe gị na Watchtower kwekọrịtara gbasara ịga na jw.org eme ihe ọ bụla. Anyị jikwa ihe niile e kwuru ebe a dochie ihe niile anyị kwuburu gbasara ịga na jw.org.