Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Ole Ndị Bụ Ndịàmà Jehova?

Ole Ndị Bụ Ndịàmà Jehova?

Otu nwaanyị Amerịka aha ya bụ Becky, kwuru, sị: “O teela m matara Mike. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ma, aghọtabeghị m ụdị chọọchị ọ na-ekpe ihe a. Amaghị m onye bụ́ Jehova. Amaghịkwa m ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ndị ibe ha na-eme. Ọ̀ ga-abụ na ha nọ n’òtù nzuzo?”

Otu nwoke onye Kanada aha ya bụ Zenon, kwuru, sị: “Mgbe ndị agbata obi m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, m nọ na-ajụ onwe m ihe aha chọọchị a pụtara. Ọ daghị m ka aha chọọchị.”

Otu nwoke onye Amerịka aha ya bụ Kent, kwuru, sị: “Mụ na nwunye m chere na ihe mere Ndịàmà Jehova ji abịa n’ụlọ anyị bụ ka ha gwa anyị na anyị bụ ndị mmehie n’ihi na anyị anaghịzi aga chọọchị. Anyị chere na ebe anyị na-achọtalighị ihe anyị na-achọ na chọọchị ndị a ma ama, anyị agaghị achọtali ya n’òtù Ndịàmà Jehova a anyị na-amaghị ebe ha si.”

Otu nwaanyị Denmak aha ya bụ Cecilie, sịrị: “N’eziokwu, amaghị m ndị ha bụ, amaghịkwa m ihe ha kweere.”

O nwere ike ịbụ na ị hụtụla ebe Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ ma ọ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. O nwekwara ike ịbụ na ị hụtụla ebe ha na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ma ọ bụ ebe ha na ndị mmadụ na-amụ Baịbụl. Ọ ga-abụkwa na otu n’ime ha nyere gị akwụkwọ a ị na-agụ ugbu a. Ma, ọ ka nwere ike ịbụ na ị matachabeghị ndị ha bụ. O nwere ike ịbụ na ihe ị na-eche banyere Ndịàmà Jehova yiri ihe Becky, Zenon, Cecilie ma ọ bụ Kent chere.

Gịnị ka ị ga-eme ma ị chọọ ịmata Ndịàmà Jehova nke ọma? Olee otú ị ga-esi amata ihe ndị ha kweere, ma ọ bụ otú ha si enweta ego ha ji arụ ebe ndị ha na-anọ efe Chineke na ego ha ji ebi akwụkwọ ndị ha ji ezi ozi ọma? Oleekwa otú ị ga-esi amata ihe mere ha ji abịa na nke gị ma ọ bụ achọ izi gị ozi ọma n’ebe ọ bụla ọzọ?

Cecilie, onye anyị dere ihe o kwuru ná mbido, sịrị: “M gụrụ ọtụtụ ihe n’Ịntanet gbasara Ndịàmà Jehova. Anụrụ m asịrị ndị mmadụ ji ha na-agba, nụkwa ihe ndị kpọrọ okpukpe ha asị na-ekwu gbasara ha. Ihe ndị a niile mere ka m lewezie ha anya ọjọọ.” Ma, o mechara jụọ Ndịàmà Jehova, ha akọọrọ ya nke bụ́ eziokwu.

Ị chọọ ịma nke bụ́ eziokwu gbasara Ndịàmà Jehova, gbalịa jụọ ha n’ihi na ọ bụ hanwa ga-aka agwa gị eziokwu gbasara onwe ha. Ọ bụ ha na-ebipụta akwụkwọ a. (Ilu 14:15) Obi siri anyị ike na isiokwu ndị na-eso nke a ga-enyere gị aka ịmata ndị anyị bụ na ihe anyị kweere nakwa ihe mere anyị ji ezi ozi ọma.