Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ ezigbo nne ma ọ bụ nna?

Ị̀ na-akụziri ụmụ gị ka ha hụ Chineke n’anya?

Ọ bụrụ na di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya, na-akwanyekwara ibe ha ùgwù, ụmụ ha ga-amụta ihe bara uru n’aka ha. (Ndị Kọlọsi 3:14, 19) Ezigbo ndị nne na nna na-ahụ ụmụ ha n’anya, na-ajakwa ha mma otú ahụ Jehova Chineke si jaa Ọkpara ya mma.—Gụọ Matiu 3:17.

Nna anyị nke eluigwe na-ege ndị ohu ya ntị, ọ na-achọkwa ịma otú obi dị ha. Ndị nne na nna kwesịrị iṅomi ya. Ha kwesịrị ịna-ege ụmụ ha ntị ma ụmụ ha kọwara ha ihe dị ha n’obi. (Jems 1:19) Ha kwesịkwara igosi na ha ghọtara otú obi dị ụmụ ha, ọ bụrụgodị na ihe ụmụ ha na-ekwu adịghị ha mma.—Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 11:11, 15.

Olee otú ị ga-esi azụ ụmụ gị ka ha baa uru?

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, i nwere ikike ịgwa ụmụ gị ihe ị chọrọ ka ha mee. (Ndị Efesọs 6:1) Mụta ihe n’aka Chineke. Otu ụzọ Chineke si egosi na ọ hụrụ ụmụ ya n’anya bụ na ọ na-enye ha iwu, gwakwa ha nsogbu ha ga-abanye na ya ma ha mebie iwu ya. (Jenesis 3:3) Ma, ọ naghị amanye ụmụ mmadụ irubere ya isi. Kama, ọ na-agwa ha uru ha ga-erite ma ha rubere ya isi, mee ihe dị mma.—Gụọ Aịzaya 48:18, 19.

Gbalịa kụziere ụmụ gị ka ha hụ Chineke n’anya. Ha ga na-akpa àgwà ọma ma gị na ha ọ̀ nọ ma ọ bụ na unu anọghị. Chineke na-eme ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị hụ Chineke n’anya, i kwesịkwara ịna-eme ihe ndị ga-egosi na ị hụrụ Chineke n’anya.—Gụọ Diuterọnọmi 6:5-7; Ndị Efesọs 4:32; 5:1.