Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Mmadụ ò nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi?

Olee ihe ga-eme ka anyị ghara ịnwụkwa anwụ?

Nwoke mbụ Chineke kere bụ́ Adam dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ. O mechakwara kaa nká ma nwụọ. Kemgbe ahụ, ndị mmadụ emeela ọtụtụ ihe ka ha ghara ịka nká. Ma, o nwebeghị mmadụ ọ bụla gbanahụrụla ọnwụ. Gịnị kpatara ya? Ihe mere Adam ji kaa nká ma nwụọ bụ na o nupụụrụ Chineke isi. Ihe mere anyịnwa ji aka nká bụ na anyị ketara mmehie n’aka Adam. Ọ bụ mmehie ahụ mere anyị ji anwụ anwụ.—Gụọ Jenesis 5:5; Ndị Rom 5:12.

Ọ bụrụ na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi, a ga-enwerịrị onye ga-akwụ ụgwọ a ga-eji gbapụta anyị. (Job 33:24, 25) Ụgwọ ahụ a ga-akwụ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’aka ọnwụ. (Ọpụpụ 21:29, 30) Jizọs kwụrụ ụgwọ ahụ. Otú o si kwụọ ya bụ na ọ nwụrụ maka anyị.—Gụọ Jọn 3:16.

Olee otú anyị nwere ike isi nweta ndụ ebighị ebi?

E nwere ndị Chineke na-agaghị ekwe ka ha dịrị ndụ mgbe ọ ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịna-arịa ọrịa ma na-aka nká. N’eziokwu, ndị niile nupụụrụ Chineke isi otú ahụ Adam mere agaghị adị ndụ ebighị ebi. Ọ bụ naanị ndị Chineke gbaghaara mmehie ha ga-enweta ndụ ebighị ebi.—Gụọ Aịzaya 33:24; 35:3-6.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị, o nwere ihe dị mkpa anyị ga-eme. Anyị ga-amụ Baịbụl ka anyị nwee ike ịmata onye Chineke bụ. Baịbụl na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ebi ezigbo ndụ nakwa ihe ndị anyị ga-eme ka Chineke hụ anyị n’anya ma nye anyị ndụ ebighị.—Gụọ Jọn 17:3; Ọrụ Ndịozi 3:19.