Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Obere Ego Ị Na-akpata Mgbe Ihe Siiri Gị Ike Na-ezuru Gị
Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Obere Ego Ị Na-akpata Mgbe Ihe Siiri Gị Ike Na-ezuru Gị
O NWERE otu nwoke aha ya bụ Obed. Ọ mụrụ ụmụ abụọ. Ọ rụrụ ọrụ afọ iri n’otu nnukwu họtel nke dị n’otu nnukwu obodo n’Afrịka. N’oge ahụ, ọ naghị esiri ya ike igboro ezinụlọ ya mkpa ha. Mgbe ụfọdụ, ya na ezinụlọ ya na-aga atụrụ ndụ abalị ole na ole n’ebe a na-ekiri ụmụ anụmanụ n’obodo ha. Ma ihe niile a nyụrụ ka ọkụ mgbe a chụrụ ya n’ọrụ maka na ndị mmadụ anaghị abịakarịzi na họtel ahụ.
Otu nwoke ọzọ aha ya bụ Stephen rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ iri abụọ na abụọ n’otu nnukwu ụlọ akụ̀. O mechara nwee ọkwá dị elu n’ụlọ akụ̀ ahụ. Ụlọ akụ̀ ahụ nyere ya nnukwu ụlọ, ụgbọala, ndị odibo, ma tinyechaa ụmụ ya n’ụlọ akwụkwọ ndị a ma ama. Ma mgbe ụlọ akụ̀ ahụ gbanwere otú ihe ụfọdụ si aga n’ụlọ akụ̀ ha, a chụrụ nwoke a n’ọrụ. Stephen sịrị: “Ihe a merenụ gbawara mụ na ndị ezinụlọ m obi. Ebidoro m ichegbu onwe m, iwe jukwara m obi.”
Ihe a mere ụmụ nwoke abụọ a na-eme ọtụtụ ndị n’ụwa taa. A chụọla ọtụtụ nde mmadụ n’ọrụ n’ihi otú akụnụba ọtụtụ mba si ada n’ike n’ike. Otú ọnụ ihe niile si arị elu ọjị emeela ka obere ego a na-akwụ ndị nke jisiri ike nweta ọrụ ghara ịna-ezuru ha. O nweghị mba ụkọ ego na-adịghị na ya, ma ndị nke mepere emepe ma ndị nke na-emepeghị emepe.
Ọ Dị Mkpa Ka Anyị Nweta Ezi Amamihe
Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị ma ọ bụrụ na ego a na-akwụ anyị ebughị ibu ma ọ bụkwanụ na a chụrụ anyị n’ọrụ. N’eziokwu, o nweghị onye na-anaghị echegbu onwe ya mgbe ụfọdụ. Ma, otu nwoke maara ihe kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) Kama ichegbuwe onwe anyị mgbe ihe na-esiri anyị ike, ihe anyị kwesịrị ime bụ ịga n’Okwu Chineke ka anyị nweta “ezi amamihe.”—Ilu 2:7.
Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-akọ otú e si akpata ego na otú e si emefu ya, ndụmọdụ ndị o nyere banyere ego enyerela ọtụtụ ndị mmadụ aka n’ụwa niile. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru banyere ego.
Buru ụzọ chọpụta ihe ọ ga-efu. Chebara ihe a Jizọs kwuru na Luk 14:28 echiche. Ọ sịrị: “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?” Ime ihe a Baịbụl kwuru pụtara na i kwesịrị ide otú ị ga-esi na-emefu ego gị ma hụ na i si otú ahụ na-emefu ya. Ma Obed kwuru na ime nke a anaghị adịcha mfe. Ọ sịrị: “Mgbe a na-achụbeghị m n’ọrụ, anyị gaa ịzụ ihe, ọtụtụ ihe anyị na-azụ bụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa. Ọ dịtụbeghị mgbe anyị depụtara otú anyị ga-esi na-emefu ego anyị n’ihi na ego dị.” Mmadụ ibu ụzọ depụta otú ọ ga-esi emefu ego ya ga-eme ka onye ahụ ghara ịzụfusị ego o kwesịrị iji gbooro ezinụlọ ya mkpa ha.
Selata aka n’otú i si emefu ego. O doro anya na ọ naghị adịrị onye nweburu ego mfe iselata aka n’otú o si emefu ego. Ma, ọ dị mkpa ka
o mee otú ahụ. Stephen kwuru, sị: “Ihe mụ na ezinụlọ m mere ka anyị ghara ịna-emefu nnukwu ego bụ ịkwaga n’ụlọ nke anyị, ọ bụ eziokwu na ọ dị obere karịa nke anyị bibu, a rụzichabeghịkwa ime ya. Ụmụ anyị malitekwara ịga akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ na-akụzi ihe nke ọma, ma a naghị akwụ nnukwu ego na ya.”Ihe ga-enyere gị na ndị ezinụlọ gị aka iselata aka n’otú unu si emefu ego bụ gị na ha ikwurịta otú ihe si kwụrụ. Otu nwoke aha ya bụ Austin, bụ́ onye rụrụ ọrụ afọ itoolu n’otu ụlọ akụ̀ tupu a chụọ ya n’ọrụ, kwuru, sị: “Mụ na nwunye m nọdụrụ ala depụtasịa ihe ndị dị ezigbo mkpa n’ezinụlọ anyị. Anyị kwụsịrị ịzụ ihe oriri ndị dị oké ọnụ, kwụsịkwa ịga ezumike n’ebe anyị ga-emefu nnukwu ego, nakwa ịzụ uwe ọhụrụ ndị na-adịghị anyị mkpa. Obi dị m ụtọ na ndị ezinụlọ m kwetara ka anyị selata aka n’otú anyị si emefu ego.” Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isiri ụmụaka ike ịghọtacha ihe mere ezinụlọ unu ga-eji selata aka n’otú unu si emefu ego, ma unu bụ́ ndị mụrụ ha nwere ike inyere ha aka ka ha ghọta.
Kweta ịrụ ụdị ọrụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọrụ ọfịs amarala gị ahụ́, o nwere ike ịdị gị ka ị gaghị arụli ọrụ ọkpụkpụ aka. Austin sịrị: “O siiri m ezigbo ike ikweta ịrụ ọrụ ọkpụkpụ aka n’ihi na ọrụ ọfịs amarala m ahụ́.” O doro anya na ihe mere o ji esiri ndị mmadụ ike ikweta ịrụ ọrụ ọzọ bụ ihe a Baịbụl kwuru n’Ilu 29:25, sị: “Ịtụ mmadụ egwu na-eweta ọnyà.” Ọ bụrụ na i chewe ihe ndị mmadụ ga-ekwu, ọ ga-esiri gị ike ịkpata ihe gị na ndị ezinụlọ gị ga-eri. Gịnị ga-enyere gị aka ịkwụsị inyewe onwe gị nsogbu maka ihe ndị mmadụ ga-ekwu?
Ihe ga-enyere gị aka bụ iwetu onwe gị ala. Mgbe a chụrụ Obed n’ọrụ na họtel ahụ, otu onye ya na ya na-arụbu ọrụ gwara ya ka ọ bịa rụwara ya ọrụ n’ebe ọ na-arụzi ụgbọala. Otu n’ime ihe Obed na-arụ bụ iji ụkwụ gaa zụta ágbá e ji ete ụgbọala nakwa ịzụta ihe ndị ọzọ. Ebe ọ na-agakwa azụta ha dị anya, okporo ụzọ ya bụkwa uzuzu uzuzu. Obed sịrị: “Ọrụ a amasịghị m, ma o nweghị ihe m maara m ga-eme. Ihe nyeere m aka ikweta ịrụ ọrụ a ọ na-enweghị ezigbo ihe a na-akwụ m na ya bụ na m weturu onwe m ala. Ma, obi ụtọ m bụ na ọ na-ezuru m ịkpa afọ ezinụlọ m.” Í cheghị na ọ ga-abara gị uru iwetu onwe gị ala otú a Obed mere?
Afọ ju gị n’ihe i nwere. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na onye afọ juru n’ihe o nwere bụ onye “weere ụwa ya otú o si hụ ya ma ka na-enwekwa obi ụtọ.” Ma o nwere ike ọ gaghị adịrị onye ihe na-esiri ike mfe ikweta ihe akwụkwọ a kwuru. O nwere ihe Pọl onyeozi kwuru nke anyị kwesịrị ichebara echiche. Pọl kwusara ozi ọma n’obodo dị iche iche, o nwekwara oge ihe siiri ya ike. Ọ sịrị: “Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya. Amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị ụkọ, amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị n’ụba.”—Ndị Filipaị 4:11, 12.
Ọ bụ eziokwu na ihe nwere ike ịkara anyị mma echi, ma o nwekwara ike ịka njọ n’ihi otú ụwa si na-agbanwe. E nwere ọtụtụ uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ana-echeta ndụmọdụ a Pọl si n’ike mmụọ nsọ nye anyị. Ọ sịrị: “N’ezie, nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” Ihe a Pọl kwuru apụtaghị na ọ chọrọ ka anyị dịrị umengwụ, kama ihe ọ na-ekwu bụ na ihe oriri na uwe ekwesịghị ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.—1 Timoti 6:6, 8.
Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Ezigbo Obi Ụtọ
Mmadụ inwe ego na akụnụba niile dị n’ụwa a agaghị eme ka onye ahụ nwee ezigbo obi ụtọ ná ndụ. Jizọs sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” N’eziokwu, ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ onye ahụ iji ihe o nwere enyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ na-agba ha ume.—Ọrụ 20:35.
Jehova Chineke, bụ́ Onye kere anyị, maara ihe niile dị anyị mkpa. Ihe ndị e dere n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, enyerela ọtụtụ ndị aka ime ka ndụ ha ka mma nakwa ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha. Nke a apụtaghị na ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka ihe kwụsị isiri anyị ike ozugbo. Ma Jizọs gwara ndị ‘bu ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke’ na Chineke ga-enye ha ihe niile dị ha mkpa n’ụbọchị.—Matiu 6:33.