Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Maliteghachi Ịtụkwasị Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Obi

Otú Ị Ga-esi Maliteghachi Ịtụkwasị Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Obi

Ihe Ndị Na-eme Ka E nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Otú Ị Ga-esi Maliteghachi Ịtụkwasị Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Obi

Steve sịrị *: “Mmadụ gwa m na Jodi ga-akwa iko, agaghị m ekweta. Atụkwasịghịzi m ya obi. O siiri m ezigbo ike ịgbaghara ya.”

Jodi sịrị: “Aghọtara m ihe mere na Steve atụkwasịghịzi m obi. O were ọtụtụ afọ tupu mụ emee ka ọ ghọta na ihe m mere wutere m.”

BAỊBỤL sịrị na ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ akwaa iko, onye ahụ nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya ahụ kwara iko alụkwaghịm. * (Matiu 19:9) Steve, bụ́ onye anyị kpọrọ aha n’elu, kpebiri na ya agaghị agba nwunye ya alụkwaghịm. Ya na nwunye ya kpebiri na ha agaghị etisa. Ma ọ dịghị anya, ha achọpụta na ibikọ ọnụ abụghị ebe okwu biri. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ihe ahụ ha kwuru n’elu gosịrị na iko ahụ Jodi kwara mere ka ha ghara ịtụkwasịzi ibe ha obi. Jodi na Steve ga-agbalịsi ike ka ha maliteghachi ịtụkwasị ibe ha obi, n’ihi na di na nwunye ịtụkwasị ibe ha obi na-eso eme ka ha nwee obi ụtọ.

Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-agbalịsi ike ka unu ghara ịtọsa mgbe otu onye n’ime unu kwara iko, o doro anya na ọ gaghị adịrị unu mfe. Obi ga-akacha agbawa gị ọnwa ole na ole ị matara na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko. Ma unu nwere ike ịmalitekwa ịtụkwasị ibe unu obi! Olee otú unu nwere ike isi mee ya? Baịbụl nwere ike inyere unu aka ịma ihe unu ga-eme. Ka anyị tụlee ihe anọ nwere ike inyere unu aka.

1 Na-agwanụ Ibe Unu Eziokwu. Pọl onyeozi dere, sị: “Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) Ọ bụrụ na ị gwaghị di gị ma ọ bụ nwunye gị eziokwu, ma ọ bụ ghara ịkọchara ya otú ihe si mee, ma ọ bụkwanụ na ị chọghịdị ịkọrọ ya ihe ọ bụla banyere ihe ahụ merenụ, o nwere ike ime ka ọ kwụsị ịtụkwasị gị obi. N’ihi ya, ezorola ya ihe ọ bụla, gwa ya eziokwu.

Ná mmalite, iwe nwere ike ime ka unu ghara ikwurịta banyere iko ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara. Ma e mechaa, unu kwesịrị ikwurịta otú ihe ahụ si mee. Unu nwere ike ikwu ihe ole na ole banyere ihe ahụ merenụ, ma ọ dịghị mma ịhapụ ikwurịta ya. Jodi, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị: “Ná mmalite, o siiri m ezigbo ike ịkọrọ di m ihe merenụ n’ihi na ọ na-eme m ihere. O wutere m nke ukwuu, achọghịkwa m ịna-ekwute okwu ya.” Ma, nke a kpataara ha nsogbu. Maka gịnị? Steve kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na Jodi achọghị ịna-ekwute okwu iko ahụ ọ kwara, o mere ka m ghara ịtụkwasị ya obi.” Jodi chetara ihe mere mgbe ahụ ma kwuo, sị, “O were oge tupu mụ na di m adịghachi ná mma n’ihi na achọghị m ka anyị kwurịta banyere ihe ahụ merenụ.”

Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị akwaa iko, o doro anya na obi agaghị adị unu mma ka unu kwurịta ya. Paul, bụ́ di Debbie, na odeakwụkwọ ya kwara iko. Debbie kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ihe m nọ na-ajụ onwe m. Olee otú ihe a si mee? Gịnị mere o ji mee ụdị ihe a? Gịnị ka ha kparịtara? O mere ka obi ghara ịna-adị m mma, mụ ana-echegbu onwe m banyere ya, na-ajụkwukwa onwe m ajụjụ.” Paul sịrị: “N’eziokwu, mụ na Debbie na-ese okwu mgbe ụfọdụ ma anyị na-akparịta ụka. Ma anyị na-arịọkarị ibe anyị mgbaghara ma e mechaa. Otú ahụ anyị si agwa ibe anyị eziokwu mgbe anyị na-ekwurịta okwu mere ka anyị hụkwuo ibe anyị n’anya.”

Mgbe unu na-akparịta ihe a merenụ, olee ihe i nwere ike ime ka ị ghara ikwu ihe ndị ga-ewe di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe? Cheta na ihe bụ mkpa gị abụghị imesi di gị ma ọ bụ nwunye gị ike, kama ọ bụ ịmụta ihe n’ihe ahụ merenụ na ime ka unu hụkwuo ibe unu n’anya. Dị ka ihe atụ, mgbe Chul Soo kwara iko, ya na nwunye ya aha ya bụ Mi Young kwurịtara ihe kpatara ya. Chul Soo kwuru, sị: “M chọpụtara na ihe ndị m na-eme anaghị ekwe m wepụta oge ka mụ na nwunye m nọrịa. Ihe bụ́ mkpa m bụ ime ndị ọzọ obi ụtọ na ime ihe ha chọrọ ka m mee. Ọ bụ ha ka m na-ejikarị oge m elebara anya. Ọ bụ ya mere na anaghị m enwecha ohere ka mụ na nwunye m nọrịa.” Chul Soo na Mi Young chọpụtara ihe bụ́ nsogbu ha, meekwa ihe ha kwesịrị ime. Nke a nyeere ha aka ka ha hụghachi ibe ha n’anya.

MEGODỊ IHE A: Ọ bụrụ na ọ bụ gị kwara iko, azọwala isi gị ma ọ bụ tawa di gị ma ọ bụ nwunye gị ụta. Kweta na i mere ihe ọjọọ nakwa na ihe i mere gbawara di gị ma ọ bụ nwunye gị obi. Ọ bụrụ na ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, abarala ya mbà ma ọ bụ na-akparị ya. Nke a nwere ike ime ka di gị ma ọ bụ nwunye gị gwa gị obi ya.—Ndị Efesọs 4:32.

2 Jirinụ Otu Obi Rụkọọ Ọrụ Ọnụ. Baịbụl kwuru, sị: “Abụọ dị mma karịa otu.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.” (Ekliziastis 4:9, 10) Ihe ahụ Baịbụl kwuru ga-akacha baara unu uru ma ọ bụrụ na unu na-agbalị ka unu maliteghachi ịtụkwasị ibe unu obi.

Ọ bụrụ na unu abụọ agbakọọ aka rụsie ọrụ ike, ọ ga-eme ka unu maliteghachi ịtụkwasị ibe unu obi. Ma, ihe kwesịrị ịbụ mkpa unu abụọ bụ otú unu ga-esi ghara itisa. Ọ bụrụ na unu na-eme ihe iche iche, unu nwere ike ịbanyekwu ná nsogbu. Unu kwesịrị ịghọta na unu abụọ na-achụ otu ihe.

Steve na Jodi chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Jodi sịrị: “Ọ bụ eziokwu na o were anyị oge, mụ na di m gbakọrọ aka rụsie ọrụ ike ka anyị ghara itisa. Ekpebisiri m ike na agaghị m akwa iko ọzọ. Ọ bụ eziokwu na iko ahụ m kwara wutere di m, o kpebiri na nke ahụ agaghị eme ka anyị tisaa. Kwa ụbọchị, m na-agbalị mee ka obi sie ya ike na m gaghị akwa iko ọzọ, ọ na-emekwa ka m ghọta mgbe niile na ọ hụrụ m n’anya. Otú ahụ Steve si egosi m na ya hụrụ m n’anya na-eme m obi ụtọ.”

MEGODỊ IHE A: Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị jiri otu obi rụsie ọrụ ike ka unu maliteghachi ịtụkwasị ibe unu obi.

3 Hapụ Àgwà Ọjọọ ma Kpawa Àgwà Ọma. Mgbe Jizọs dọchara ndị na-ege ya ntị aka ná ntị ka ha ghara ịkwa iko, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.” (Matiu 5:27-29) Ọ bụrụ na ọ bụ gị kwara iko, chee echiche banyere àgwà ma ọ bụ ihe ụfọdụ ị na-eme, bụ́ ndị i kwesịrị ịkwụsị, ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghara itisa?

O doro anya na i kwesịrị ịkwụsị ihe ọ bụla jikọrọ gị na onye ahụ gị na ya kwara iko. * (Ilu 6:32; 1 Ndị Kọrịnt 15:33) Paul, bụ́ onye anyị kwuru banyere ya n’elu mere otú ahụ. Ọ gbanwere oge o ji arụ ọrụ na nọmba ekwentị ya ka a ghara inwe ihe ga-ejikọ ya na nwaanyị ahụ. Ma, mbọ a niile Paul gbara emeghị ka nwaanyị ahụ kwụsịchaa inye ya nsogbu. Ebe Paul kpebisiri ike ime ihe ga-eme ka nwunye ya maliteghachi ịtụkwasị ya obi, ọ hapụrụ ọrụ ahụ. Ihe ọzọ o mere bụ na ọ kwụsịrị iji ekwentị ya na-ejizi nke nwunye ya. Ihe a niile o mere adịghịrị ya mfe. Ma, ò mere ka nwunye ya maliteghachi ịtụkwasị ya obi? Debbie nwunye ya kwuru, sị: “Afọ isii agaala kemgbe Paul kwara iko, ma m ka na-eche mgbe ụfọdụ na nwaanyị ahụ nwere ike ịgbalị ka ya na Paul kpawakwa. Ma ugbu a, m tụkwasịrị Paul obi na ọ gaghị akwa iko ọzọ.”

Ọ bụrụ na ọ bụ gị kwara iko, ọ ga-adị mma ka ị gbanwee àgwà gị. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị na-achụkarị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ihe ị na-echekarị n’echiche bụ ebe gị na onye na-abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe mmekọahụ. Ya bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ‘yipụ mmadụ ochie ahụ na omume ya.’ Kwụsị àgwà ọjọọ ndị ahụ ị na-akpa ma kpawa àgwà ọma ndị ga-eme ka di gị ma ọ bụ nwunye gị tụkwasịkwuo gị obi. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Otú e si zụọ gị, ò mere ka ọ na-esiri gị ike igosi di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya? Ọ bụrụgodị na o siiri gị ike ná mmalite, na-egosi di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbe niile na ị hụrụ ya n’anya, na-agwakwa ya na ị hụrụ ya n’anya. Steve kwuru, sị: “Nwunye m Jodi, na-ebikarị m aka iji gosi na ọ hụrụ m n’anya, ọ na-agwakwa m mgbe niile na ya hụrụ m n’anya.”

Ruo oge ụfọdụ, i kwesịrị ịna-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe niile ị na-eme n’ụbọchị. Mi Young, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, kwuru, sị: “Chul Soo gbara mbọ ịna-agwa m ihe niile merenụ n’ụbọchị, ọ na-agwadị m ma ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Ihe mere o ji agwa m ihe niile bụ ka m ghọta na o nweghị ihe ọ na-ezoro m ezoro.”

MEGODỊ IHE A: Jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ndị o chere onye ọ bụla n’ime unu nwere ike ime ka unu maliteghachi ịtụkwasị ibe unu obi. Depụta ha n’akwụkwọ ma na-eme ha eme. Ihe ọzọ unu ga-eme bụ ịna-emekọ ihe ụfọdụ na-adị unu abụọ mma.

4 Ekwubila Ngwa Ngwa na Ihe Adịla Mma. Ya adịla gị ngwa ngwa ichewe na oge eruola ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị mewe ka à ga-asị na nsogbu adịghịzi. Ilu 21:5 dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” Ọ ga-ewe oge ụfọdụ tupu di gị ma ọ bụ nwunye gị amaliteghachi ịtụkwasị gị obi. O nwedịrị ike iwe ọtụtụ afọ.

Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, ya adịla gị ọsọ ọsọ ikwu na ị gbagharala ya. Mi Young kwuru, sị: “M na-echebu na ọ ga-esi ike ịhụ nwaanyị na-agaghị agbaghara di ya ma di ya kwaa iko. Aghọtaghị m ihe mere o ga-eji na-eburu di ya iwe n’obi ruo ogologo oge. Ma, mgbe di m kwara iko, m ghọtara ihe mere o ji esi ike nwunye ịgbaghara di ya kwara iko.” Ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka ị ga-eji gbaghara ya, ma maliteghachi ịtụkwasị ya obi.

Ma, Ekliziastis 3:1-3 kwuru na e nwere “oge ịgwọ agwọ.” Ná mmalite, i nwere ike iche na ọ ga-akacha mma ka ị ghara ịna-akọrọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ahụ kwara iko otú obi dị gị. Ma, ime otú ahụ agaghị eme ka di gị ma ọ bụ nwunye gị maliteghachi ịtụkwasị gị obi. Ihe ga-enyere unu aka ịdịghachi ná mma bụ ịgbaghara ya. Otú ị ga-esi gosi na ị gbagharala ya n’eziokwu bụ ịna-akọrọ ya otú obi dị gị. Gbaakwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ume ka ọ na-akọrọ gị otú obi dị ya.

Echela ihe nwere ike ime ka ị na-ewekwu iwe. Gbalịa wepụ iwe n’obi gị. (Ndị Efesọs 4:32) Ịtụgharị uche n’ihe Chineke mere mgbe ndị Izrel hapụrụ ya fewe chi ọzọ nwere ike inyere gị aka. Ihe ahụ ha mere wutere ya nke ukwuu. Jehova Chineke jidị onwe ya tụnyere nwoke nwunye ya kwara iko. (Jeremaya 3:8, 9; 9:2) Ma ‘o bughị iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi.’ (Jeremaya 3:12) Mgbe ndị Izrel ji obi ha niile chegharịa ma maliteghachi ife ya, ọ gbaghaara ha.

Mgbe o mechara doo unu anya na unu emeela ihe ndị unu kwesịrị ime ka unu dịghachi ná mma, unu ga-amaliteghachi ịtụkwasị ibe unu obi. Ugbu a unu maliterela ịtụkwasị ibe unu obi, ihe ga-abụzi mkpa unu abụghị naanị ihe unu ga-eme ka unu ghara itisa, kama ọ bụ ihe ndị ọzọ unu ga-eme ga-abara unu uru. O kwesịkwara ịbụ unu nọtụ, unu atụlee ma ùnu na-eme nke ọma. Unu echela na okwu ebiela. Dozienụ obere nsogbu ọ bụla unu nwere ike inwe, gosikwa di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị ka tụkwasịrị ya obi.—Ndị Galeshia 6:9.

MEGODỊ IHE A: Kama ịgbalịwa ime ka unu dịghachi otú ahụ unu dị tupu di gị ma ọ bụ nwunye gị akwaa iko, werenụ ya na unu ka lụrụ ọhụrụ, nakwa na unu chọrọ ka alụmdi na nwunye unu bụrụ a kwaa akwụrụ.

Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Nwere Ike Ịmaliteghachi Ịtụkwasị Gị Obi

Ọ bụrụ na ị na-eche mgbe ụfọdụ na o nweghị ihe ga-eme ka di gị ma ọ bụ nwunye gị tụkwasị gị obi ọzọ, cheta na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye. (Matiu 19:4-6) Ọ ga-enyere gị aka mee ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịghachi ná mma. Di na nwunye niile ahụ e kwuru banyere ha n’isiokwu a etisaghị n’ihi na ha mere ihe Baịbụl kwuru.

O ruola iri afọ abụọ kemgbe Steve na Jodi nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha. Steve kwuru ihe nyeere ha aka ka ha ghara itisa. Ọ sịrị: “Ọ bụ mgbe anyị na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl ka anyị mere ihe nyeere anyị aka ka anyị ghara itisa. Ha nyeere anyị ezigbo aka. Nke a mere ka anyị ghara itisa mgbe ahụ Jodi kwara iko.” Jodi sịrị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na anyị etisaghị mgbe ahụ anyị nwere nsogbu. Alụmdi na nwunye anyị bụ a kwaa akwụrụ ugbu a, n’ihi na anyị na-amụkọ Baịbụl ọnụ, na-emekwa ihe niile anyị kwesịrị ime.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 5 Ị chọọ ihe ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ma di gị ma ọ bụ nwunye gị kwaa iko, gụọ Teta! April 22, 1999, peeji nke 6, nakwa nke August 8, 1995, peeji nke 10 na nke 11.

^ par. 17 Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na onye ahụ gị na ya kwara iko na-arụ ọrụ otu ebe, ma gị achọpụta na ọ gaghị adịcha mfe ka gị na ya kwụsị imekọ ihe ụfọdụ, kwe ka ọ bụrụ naanị ihe ndị dị mkpa ka gị na ya ga na-emekọ. Ihe ọ bụla gị na ya ga-emekọ kwesịrị ịbụ n’ihu ndị ọzọ, i kwesịkwara ime ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara ihe niile na-aganụ.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

▪ Gịnị mere m ji chọọ ka mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ghara itisa n’agbanyeghị na ọ kwara iko?

▪ Olee àgwà ọma di m ma ọ bụ nwunye m na-akpa ugbu a?

▪ Mgbe mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ka na-akpa, olee obere ihe ndị m na-eme iji gosi ya na m hụrụ ya n’anya, oleekwa otú m nwere ike isi na-eme ihe ndị ahụ ugbu a?