Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ n’Ezie?

Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ n’Ezie?

Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ n’Ezie?

“Mgbe ọ banyere na Jeruselem, obodo ahụ dum malitere ịgba aghara, ha ana-asị: ‘Ònye bụ onye a?’ Ìgwè mmadụ ahụ nọ na-akọ, sị: ‘Onye a bụ Jizọs onye amụma, onye Nazaret nke Galili!’” —MATIU 21:10, 11.

OLEE ihe mere ọgba aghara ji dị na Jeruselem n’ụbọchị a Jizọs Kraịst * rutere ebe ahụ n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 Oge Anyị? Ọtụtụ ndị nọ n’obodo ahụ anụla banyere Jizọs na ihe ebube ndị o mere. Ha nọgidere na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya. (Jọn 12:17-19) Ma, ìgwè mmadụ ahụ amaghị na onye ha na ya nọ bụ onye akụkọ ya ga-eru ebe niile n’ụwa ma ruo ọtụtụ narị afọ, rute n’oge anyị!

Legodị ihe atụ ole na ole gosiri otú ndụ Jizọs sirila metụta ọtụtụ ndị n’ụwa.

▪ Kalenda ọtụtụ ndị ji agụ oge n’ọtụtụ ebe n’ụwa dabeere n’afọ e chere na a mụrụ Jizọs.

▪ Ihe dị ka nde mmadụ abụọ, ya bụ, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa, na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst.

▪ Alakụba, bụ́ okpukpe ihe karịrị otu ijeri mmadụ na-ekpe n’ụwa niile, na-akụzi na Jizọs bụ “onye amụma karịrị Ebreham, Noa, na Mozis.”

▪ A na-ekwuzi ọtụtụ okwu amamihe Jizọs kwuru n’ụdị dị iche iche n’okwu ndị mmadụ na-ekwu kwa ụbọchị. Ụfọdụ n’ime ha bụ:

‘Tụgharịa ntì nke ọzọ.’MATIU 5:39.

‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’MATIU 22:39.

‘Mmadụ enweghị ike ịbụ ohu nna ukwu abụọ.’MATIU 6:24.

‘Enyela nkịta ihe dị nsọ.’MATIU 7:6.

‘Ihe niile ị chọrọ ka ndị mmadụ na-emere gị, na-emere ya ndị ọzọ.’MATIU 7:12.

‘Ka ee gị bụrụ ee gị, ka ee e gị bụrụ ee e.’MATIU 5:37.

O doro anya na ndụ Jizọs na-emetụta nnọọ ọtụtụ mmadụ. Ma, ndị mmadụ kweere ihe dị nnọọ iche iche banyere ya. N’ihi ya, i nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ònye ka Jizọs Kraịst bụ n’ezie?’ Ọ bụ naanị Baịbụl kọwaara anyị ebe Jizọs si bịa, otú o si bie ndụ, na ihe mere o ji nwụọ. Ịmata eziokwu ndị ahụ banyere ya ga-emetụta ndụ gị nke ukwuu—ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 “Jizọs,” nke bụ́ aha onye amụma a si Nazaret, pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” “Kraịst” bụ utu aha pụtara “Onye E Tere Mmanụ,” nke na-egosi na e tere Jizọs mmanụ, ma ọ bụ na Chineke họpụtara ya ịrụ ọrụ pụrụ iche.