Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Taịwan

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Taịwan

OTU nwanna aha ya bụ Choong Keon na Julie nwunye ya dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise ugbu a. Tupu ihe dị ka afọ ise gara aga, ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile na Sidni dị n’Ọstrelia. Choong Keon kwuru, sị: “Anyị na-arụ ọrụ ụbọchị ụfọdụ n’izu, ihe anyị na-akpata na-ezukwara anyị. Ebe anyị bi anaghị ekpo oké ọkụ, ọ naghịkwa ajụ oké oyi. Ahụ́ ruru anyị ala n’ebe ahụ. Obi dị anyị ụtọ na anyị bi ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nso.” Ma, obi ezughị ha ike. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ na-eme ha obi abụọ ịgbanwe ihe ụfọdụ ha na-eme ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi n’agbanyeghị na ha ga-emeli ya.

Ma, mgbe ha gara mgbakọ distrikti n’afọ 2009, otu n’ime okwu ndị e kwuru ruru ha n’ahụ́. Nwanna mere ihe omume ahụ kwuru gbasara ndị nwere ike ijekwuru Jehova ozi. O kwuru, sị: “Chebara ihe atụ a echiche: Ọkwọ ụgbọala nwere ike ịkwọrọ ụgbọala ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe naanị ma ọ bụrụ na ụgbọala ya na-agba agba. E nwere ike iji ya tụnyere ozi anyị. Naanị ihe ga-eme ka Jizọs duzie anyị ka anyị nwee ọganihu bụ ma ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ịga n’ihu.” * Ọ dị ha ka ọ̀ bụ ha ka nwanna ahụ na-agwa okwu. Ná mgbakọ ahụ, a gbakwara otu nwanna na nwunye ya ajụjụ ọnụ. Ha abụọ bụ ndị ozi ala ọzọ na Taịwan. Ha kwuru gbasara obi ụtọ ha na-enwe n’ozi ha nakwa na a chọkwuru ndị ga-abịa nye aka. Ihe a ha kwuru mekwara ka ọ dị Choong Keon na nwunye ya ka ọ̀ bụ ha ka a na-agwa okwu.

Julie kwuru, sị: “Mgbe anyị lọtara mgbakọ ahụ, anyị kpere ekpere ka Jehova mee ka anyị kata obi kwaga Taịwan.” O kwukwara, sị: “Ma, ụjọ tụrụ anyị. Ọ dị anyị otú ahụ ọ na-adị onye na-egwutụbeghị mmiri nke chọrọ ịmaba n’ebe mmiri miri emi.” Ihe nyeere ha aka bụ Ekliziastis 11:4. Ebe ahụ sịrị: “Onye na-ele ifufe agaghị agha mkpụrụ; onye na-ele ígwé ojii agaghịkwa ewe ihe ubi.” Choong Keon kwuru, sị: “Anyị kpebiri na anyị ga-akwụsị ịnọ na-ele ifufe, kama na anyị ga-amalite ‘ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi.’” Ha kpesiri ekpere ike, gụọ akụkọ ndụ ndị ozi ala ọzọ, ha na ndị kwagara Taịwan ana-ederịta ozi iimel ka ha mata otú ebe ahụ. Ha rere ụgbọala ha na ngwongwo dị n’ụlọ ha, ma mechaa kwaga Taịwan mgbe ọnwa atọ gara.

Ọ CHỌPỤTARA NA IKWUSA OZI ỌMA NA-EME OBI ỤTỌ

Ihe karịrị otu narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị si ná mba ọzọ na-eje ozi ugbu a n’ebe ndị a chọkwuru ndị nkwusa na Taịwan. Ha si Ọstrelia, Briten, Kanada, Frans, Japan, Koria, Spen, na Amerịka. Ha dị n’agbata afọ iri abụọ na otu na iri asaa na atọ. Ihe karịrị mmadụ iri ise n’ime ha bụ ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di. Olee ihe nyeere ha aka iji obi ha niile na-eje ozi ná mba ọzọ? Ka anyị chọpụta.

Laura

E nwere otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Laura. O si Kanada gaa na-asụ ụzọ n’ebe ọdịda anyanwụ Taịwan. Ma, tupu ihe dị ka afọ iri gara aga, ije ozi ọma anaghị atọ ya ụtọ. O kwuru, sị: “Ihe mere ozi ọma anaghị atọ m ụtọ bụ na m na-aga ya naanị mgbe ọ dabara.” Ndị enyi ya ha na ya nọ na Kanada gwara ya ka o soro ha gaa kwusaa ozi ọma otu ọnwa na Meksiko. Laura kwuru, sị: “Ọ bụ ya bụ mgbe mbụ m nọtere aka n’ozi ọma. Ọ tọrọ m ezigbo ụtọ. Amaghị m na ọ ga-atọ m ụtọ otú ahụ.”

O mere ka o kpebie ịgafe n’ọgbakọ na-amụ ihe n’asụsụ mba ọzọ na Kanada. Ọ malitere ịmụ asụsụ Chaịniiz, soro ụmụnna ole na ole na-amụ ihe n’asụsụ Chaịniiz na-amụ ihe, ma kpebie ịkwaga Taịwan. Ọ kwagara ebe ahụ na Septemba 2008. O kwuru, sị: “Ihe dị ka otu afọ gara tupu ebe a amara m ahụ́. Ma ugbu a, ịlaghachi Kanada anaghị abata m n’obi.” Olee otú obi dị ya maka ozi ọma ọ na-ekwusa? O kwuru, sị: “Ọ na-atọ m ezigbo ụtọ. O nweghị ihe na-eme obi ụtọ karịa ịhụ ka ndị ị na-amụrụ Baịbụl gbanwere otú ha si ebi ndụ n’ihi na ha amatala Jehova. Ozi ọma m na-ekwusa na Taịwan emeela ka m nwee ụdị obi ụtọ a ọtụtụ mgbe.”

IHE GA-ENYERE GỊ AKA MA Ọ BỤRỤ NA Ị MACHAGHỊ ASỤSỤ NDỊ EBE AHỤ

Brian na Michelle

Otu nwanna aha ya bụ Brian na Michelle nwunye ya dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise. Ha si Amerịka kwaga Taịwan ihe dị ka afọ asatọ gara aga. Mgbe ha gara ebe ahụ ọhụrụ, ọ dị ha ka e nweghị ezigbo uru ozi ọma ha na-ekwusa bara. Ma, otu nwanna nwoke bụ́ onye ozi ala ọzọ kemgbe ọtụtụ afọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụgodị na ihe unu ga-emeli bụ naanị inye mmadụ traktị, unu kwesịrị icheta na o nwere ike ịbụ nke mbụ onye ahụ na-anụ gbasara Jehova. N’ihi ya, ozi ọma unu na-ekwusa bara ezigbo uru.” Ihe a ọ gwara ha gbara ha ezigbo ume ma mee ka ha ghara ịda mbà. Nwanna ọzọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu achọghị ịda mbà, ihe unu ga-eji na-amata ma ùnu na-eme nke ọma n’asụsụ Chaịniiz unu na-amụ abụghị ịna-atụle otú unu si na-eme kwa ụbọchị, kama ọ bụ iji otú unu si mee n’otu mgbakọ tụnyere otú unu si mee ná mgbakọ ọzọ.” Ha ji nwayọọ nwayọọ mụta asụsụ ahụ. Taa, ha bụ ndị ọsụ ụzọ na-eme nke ọma.

Olee ihe nwere ike ime ka i kpebie ịmụ asụsụ mba ọzọ? E nwee obodo ị chọrọ ịga jewe ozi, gbalịa ka ị gaa hụ otú ebe ahụ dị. I ruo, soro ụmụnna gaa ọmụmụ ihe, gị na ha nọrịa, sorokwa ha gaa ozi ọma. Brian kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọtụtụ ndị na-anabata ozi ọma n’ebe ahụ nakwa na ụmụnna hụrụ gị n’anya, ọ ga-eme ka i kpebie ịga jewe ozi ná mba ahụ n’agbanyeghị na ime otú ahụ adịghị mfe.”

GỊNỊ KA Ị GA NA-ARỤ EBE AHỤ?

Kristin na Michelle

Otú ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na Taịwan si na-enweta ego ha ji egbo mkpa ha bụ ịkụzi Bekee. Kristin na Michelle na-ere azụ̀. Kristin kwuru, sị: “Arụtụbeghị m ụdị ọrụ ahụ. Ma, ọ bụ ya mere ka anyị nwee ike ịna-eje ozi anyị n’obodo a.” Ka oge na-aga, o nwetara ndị ahịa. Ihe a ọ na-arụ mere ka ọ na-enweta ego o ji na-egbo mkpa ya na nwunye ya, meekwa ka ha nwee oge ha ga-eji na-arụ ihe mere ha ji bịa n’obodo ahụ, ya bụ, ịsụ ụzọ ma na-akụta ndị mmadụ ka azụ̀.

NA-ENWE OBI ỤTỌ N’OZI GỊ

Ihe dị ka afọ asaa gara aga, William na Jennifer nwunye ya si Amerịka kwaga Taịwan. William kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ịmụ asụsụ ndị ebe a, ịsụ ụzọ, ilekọta ọgbakọ, na ịkpata ego anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị na-eme ka ike na-agwụ anyị.” Gịnị nyeere ha aka ịna-eje ozi ha ma na-enwe obi ụtọ? Ha kpebiri ime ihe ha ga-emeli. Dị ka ihe atụ, mgbe ahụ ha na-amụ Chaịniiz, ha atụghị anya imewe ihe ha na-agaghị emeli. O mere ka ha ghara ịda mbà mgbe ọ na-esiri ha ike ịmụta ya.

William na Jennifer

William kwuru na e nwere mgbe otu onye nlekọta sekit gwara ha na ọ bụrụ na ha ekpebie ihe ha ga-eme n’ozi Jehova, ha kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ ka ha na-eme ihe ndị ga-enyere ha aka ime ihe ahụ ha kpebiri. William kwuru na ime ihe ahụ ọ gwara ha mere ka ha ghara ịna-esi ọnwụ. O mere ka ha na-ege ndị okenye ebe ahụ ntị, na-agbanwekwa otú ha si eme ihe ka ozi ọma ha na-ekwusa ná mba ọzọ nwee ike ịna-aga nke ọma. O kwukwara, sị: “O nyekwaara anyị aka ịna-ewepụta oge na-aga ele ihe ndị mara mma Jehova kere n’agwaetiti ebe a anyị na-eje ozi.”

Onye ọzọ bụ otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Megan. Ọ bụ ọsụ ụzọ si Amerịka. O mere ihe ahụ William na Jennifer mere. O ji obi ụtọ na-eje ozi ya ka ọ na-agba mbọ ịna-asụ asụsụ Chaịniiz nke ọma. Ná ngwụcha izu ọ bụla, ọ na-eso ndị nkwusa aga ozi ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’otu obodo a na-akpọ Kaụshiụng. Ọ bụ ya kacha ọdụ ụgbọ mmiri ndị ọzọ dị na Taịwan. Megan na-esi n’otu ụgbọ mmiri kwusara ozi ọma gaa n’ụgbọ mmiri ọzọ. O ziela ọtụtụ ndị na-akụ azụ̀ ozi ọma, ya bụ, ndị si Bangledesh, India, Indonisha, Filipinz, Taịland, na Vanuwatu. Megan kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ndị bịara ịkụ azụ̀ anaghị anọte aka n’ọdụ ụgbọ mmiri, anyị na-amalitere ha ọmụmụ Baịbụl ebe ahụ ozugbo. Ka anyị nwee ike ịmụrụ ha niile Baịbụl, anyị na-amụrụ mmadụ anọ ma ọ bụ ise ihe otu mgbe.” Olee otú o si na-eme n’asụsụ Chaịniiz ọ na-amụ? O kwuru, sị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na m ga-amụta ya n’egbughị oge. Ma, m na-echeta ihe otu nwanna gwara m otu mgbe. Ọ sịrị: ‘Mee ike gị niile. Jehova ga-eme nke fọrọnụ.’”

Megan

OLEE EBE HA GA-AGA JEWE OZI?

Tupu otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Cathy esi na Briten gawa ije ozi ná mba ọzọ, o mere nchọnchọ ka ọ mata ebe dị mma nwanna nwaanyị na-alụbeghị di ga-aga jewe ozi. O kpere ekpere gwa Jehova ihe na-echegbu ya, degakwara alaka ụlọ ọrụ dị iche iche akwụkwọ ozi ma jụọ ha nsogbu ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di nwere ike inwe n’obodo ha. O chebaara ihe niile ha zara ya echiche ma kpebie na ịga jewe ozi na Taịwan ga-akara ya mma.

Cathy kwagara Taịwan n’afọ 2004 mgbe ọ dị afọ iri atọ na otu. Ọ naghị ebi ndụ okomoko n’ebe ahụ. O kwuru, sị: “M na-ajụ ụmụnna ndị ebe ahụ ebe kacha mma m ga-aga zụta mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri n’ọnụ ego dị ala. Ezigbo ndụmọdụ ha nyere m mere ka m ghara imefusị ego m.” Gịnị nyeere ya aka ka ọ ghara ịna-ebi ndụ okomoko? O kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile, na-arịọ Jehova ka o mee ka obi na-adị m ụtọ n’agbanyeghị na nri ndị m na-eri na uwe ndị m na-eyi adaghị oké ọnụ. Jehova zara ekpere m. Otú o si zaa ya bụ na o mere ka m mata ihe ndị dị m mkpa n’eziokwu, meekwa ka ihe ndị m nwere ju m afọ n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe niile m chọrọ ka m na-enweta.” O kwukwara, sị: “Obi dị m ụtọ na anaghị m ebi ndụ okomoko n’ihi na o meela ka m lekwasị anya n’ihe ndị gbasara ofufe Jehova.”

Cathy

Ọ bụghị naanị na Cathy anaghị ebi ndụ okomoko, ụdị ndụ ọ na-ebi na-atọ ya ụtọ. O kwuru ihe kpatara ya, sị: “M na-ezi ozi ọma n’ebe ọtụtụ ndị na-ege ntị. Ọ na-eme m obi ụtọ.” Mgbe o ruru Taịwan, ọ bụ naanị ọgbakọ Chaịniiz abụọ ka e nwere n’ebe ọ na-asụ ụzọ. Ma, e nwere ọgbakọ asaa n’ebe ahụ ugbu a. Cathy kwuru, sị: “Obi na-adị m ụtọ kwa ụbọchị maka na m ji anya m na-ahụ ka ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ nakwa maka na m so na-enyere ha aka ka ha mụta eziokwu.”

‘E NYERE MA MỤNWA’

Ná mmalite isiokwu a, anyị kwuru gbasara Choong Keon na Julie. Olee otú ihe si dịrị ha n’ebe ha na-eje ozi? Ná mmalite, Choong Keon chere na o nweghị ezigbo uru ya baara ọgbakọ ha ebe ọ bụ na ọ machaghị asụsụ Chaịniiz. Ma, ndị nọ n’ọgbakọ ha echeghị otú ahụ. Choong Keon kwuru, sị: “Mgbe e si n’ọgbakọ anyị kewapụta ọgbakọ ọzọ, abụ m ohu na-eje ozi. Ma, e nyekwuru m ọrụ n’ọgbakọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na m na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ihe a ga-arụ karịrị akarị. Ọ bụ ya mere e ji nye ma mụnwa.” Ọ bụ okenye ugbu a. Julie kwuru, sị: “Ọ bụ ugbu a ka anyị ghọtara na anyị na-arụ ihe bara uru. Anyị enwetụbeghị ụdị obi ụtọ anyị nwere ugbu a. Anyị bịara ebe a ka anyị nye aka. Ma, otú ozi anyị si na-atọ anyị ụtọ mere ka ọ dị anyị ka ọ̀ bụ anyịnwa ka e nyeere aka. Anyị na-ekele Jehova na o kwere ka anyị bịa jewe ozi n’ebe a.”

N’ọtụtụ mba, a ka chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ị̀ gụchawala akwụkwọ ma na-eche ihe ị ga-eji ndụ gị mee? Ị̀ bụ onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma chọọ ịrụkwu ọrụ ná nzukọ Jehova? Ị̀ chọrọ ime ka ndị ezinụlọ gị nwee ọtụtụ ihe ọ ga-abụ ha cheta, obi adị ha ụtọ n’ozi Jehova? Ị̀ laala ezumike nká ma nwee ọtụtụ ihe bara uru ị mụtara ị ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ? Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi gị ma ọ bụrụ na i kpebie ijekwuru ya ozi ma kwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa.

^ para. 3 Gụọ akwụkwọ bụ́ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke,’ isi nke 16, paragraf nke 5 na nke 6.