ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọktoba 2013

Ụlọ Nche a kwuru otú ihe ndị e kere eke si egosi na Onye kere anyị nwere ike na amamihe. O kwukwara otú anyị nwere ike isi mee ihe Jizọs kwuru n’ekpere o kpere.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Filipinz

Chọpụta ihe mere ụfọdụ ndị ji gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ha, ree ihe ndị ha nwere, ma na-ebi ndụ ka ndị ogbenye na Filipinz.

Ihe Ndị E Kere Eke Na-eme Ka Anyị Mata Onye Chineke Dị Ndụ Bụ

Mụta otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ka ha ghọta nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke, meekwa ka okwukwe anyị nwere na ya sikwuo ike.

“Bụrụnụ Ndị Ohu Jehova”

Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịbụ ndị ohu Setan? Olee ihe ọma Jehova ga-emere ndị ohu ya ji obi ha niile jeere ya ozi?

AKỤKỌ NDỤ

Ịtụkwasị Jehova Obi Abaarala Anyị Uru

Malcolm Allen na Grace nwunye ya ejeerela Jehova ozi ihe karịrị iri afọ asaa na ise. Gụọ otú ha si mụta na Jehova na-agọzi ndị tụkwasịrị ya obi.

Ihe Anyị Kwesịrị Ịmụta n’Ekpere E Chere Echiche Kpee

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ekpere ndị Livaị kpere? Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ekpere anyị ka mma?

Na-eme Ihe Ị Mụtara n’Ekpere Dị Mkpa Jizọs Kpere

Mgbe Jizọs kpere ekpere, o bu ụzọ kwuo gbasara ime uche Jehova tupu ya arịọ Chineke ihe ọ ga-emere ya. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Jizọs kpere n’ekpere?

Ì Nwere Ike Ịgbakwu Mbọ Na-adọ Ndị Ọzọ Aka ná Ntị?

Chọpụta otú ụfọdụ ndị si jiri ohere ọ bụla ha nwere na-ezi ndị mmadụ ozi ọma mgbe ha na-arụ ihe dịịrị ha n’ụbọchị.