Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Si n’Ezinụlọ Keyafas

O Si n’Ezinụlọ Keyafas

Mgbe ụfọdụ, ihe e dere n’ihe ndị ọkachamara gwutere n’ala na-egosi na ọ bụ onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl nwe ihe ahụ ma ọ bụ na onye ahụ na onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl mekọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2011, ndị ọkà mmụta n’Izrel dere banyere ihe a chọtara nke gosiri na onye nwe ihe ahụ na onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl mekọrọ ihe. Ihe ha chọtara bụ igbe a chọrọ mma, nke e ji ụrọ na-acha nzu nzu rụọ. Ihe dị na ya bụ ọkpụkpụ onye nwụrụ anwụ. Igbe ahụ anọruola puku afọ abụọ.

Ihe e dere n’igbe ahụ bụ: “Miriam ada Yeshua nwa Keyafas, onye nchụàjà Meazaya, onye Bet Imraị.” Nnukwu onye nchụàjà nke so kpee Jizọs ikpe ma maa ya ikpe ọnwụ bụ Keyafas. (Jọn 11:48-50) Ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Fleviọs Josifọs, kpọrọ ya “Josef, onye a na-akpọ Keyafas.” O doro anya na onye nwe igbe ahụ bụ onye ikwu Keyafas. Ihe e dere n’ụdị igbe ahụ a chọtaburu, nke e chere na ọ bụ nke nnukwu onye nchụàjà ahụ, bụ “Yehosef nwa Keyafa,” ya bụ, Josef, nwa Keyafas. * N’ihi ya, Miriam bụ onye ikwu Keyafas.

Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Mgbe Ochie n’Izrel kwuru na ndị ha natara igbe ahụ e tinyere ọkpụkpụ Miriam bụ ndị gara zuo ohi n’ebe e liri ndị mgbe ochie. Mgbe a tụlechara ihe ahụ e gwutere na ihe e dere na ya, o doro anya na ọ bụ nke Miriam, bụ́ onye si n’ezinụlọ Keyafas.

E nwere ihe ọzọ igbe ahụ e tinyere ọkpụkpụ Miriam mere ka anyị mata. O kwuru banyere Meazaya, nke ezinụlọ ya bụ ndị ikpeazụ n’ime ụzọ iri abụọ na anọ e kere ndị nchụàjà ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (1 Ihe 24:18) Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Mgbe Ochie n’Izrel kwuru na ihe ahụ e dere n’igbe ahụ gosiri na e nwere ihe jikọrọ “ezinụlọ Keyafas na ezinụlọ Meazaya.”

Ihe ahụ e dere kpọkwara aha Bet Imraị. E nwere ụzọ abụọ e nwere ike isi kọwaa aha ahụ e dere. Ụlọ ọrụ ahụ kwuru, sị: “Ụzọ nke mbụ bụ na Bet Imraị nwere ike ịbụ aha otu ezinụlọ ndị nchụàjà, ya bụ, ụmụ Ịma (Ezra 2:36-37; Nehemaya 7:39-42), bụ́ ndị ụmụ Meazaya so n’ụmụ ụmụ ha. Ụzọ nke abụọ e nwere ike isi kọwaa ya bụ na Bet Imraị bụ obodo Miriam ma ọ bụ obodo ndị ezinụlọ ha niile.” Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, igbe ahụ e tinyere ọkpụkpụ Miriam mere ka o doo anya na ndị Baịbụl kpọrọ aha bụ ndị dịrị ndụ, ndị nwekwara ezinụlọ ha si.

^ para. 3 Ị chọọ ịgụkwu banyere igbe e tinyere ọkpụkpụ Keyafas, gụọ isiokwu bụ́ “Nnukwu Onye Nchụàjà nke Mara Jizọs Ikpe Ọnwụ,” n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2006, peeji nke 10-13.