Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ ‘Onye Na-emere Anyị Ụzọ Mgbapụ’

Jehova Bụ ‘Onye Na-emere Anyị Ụzọ Mgbapụ’

Jehova Bụ ‘Onye Na-emere Anyị Ụzọ Mgbapụ’

“Jehova ga-enyere ha aka ma meere ha ụzọ mgbapụ.”—ỌMA 37:40.

1, 2. Olee otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ banyere Jehova nke na-akasi anyị obi ma na-enye anyị ume?

ONYINYO nke anyanwụ na-eme ka e nwee anaghị anọgide otu ebe. Ka ụwa na-echigharị, onyinyo na-anọgide na-agbanwe. Ma Onye kere ụwa na anyanwụ anaghị agbanwe agbanwe. (Mal. 3:6) Baịbụl na-ekwu, sị: “Ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.” (Jems 1:17) Eziokwu a bụ́ na Jehova adịghị agbanwe agbanwe bụ ihe na-akasi obi ma na-enye anyị ume, karịsịa mgbe anyị zutere ọnwụnwa na ihe isi ike ndị tara akpụ. N’ihi gịnị?

2 Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, Jehova ghọrọ ‘Onye na-emere ndị ya ụzọ mgbapụ’ n’oge Baịbụl. (Ọma 70:5) Ọ naghị agbanwe agbanwe, ọ na-emezukwa ihe o kwuru; n’ihi ya, ndị na-efe ya ofufe taa nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji tụkwasị ya obi na ọ “ga-enyere ha aka ma meere ha ụzọ mgbapụ.” (Ọma 37:40) Olee otú Jehova sirila meere ndị ohu ya ụzọ mgbapụ n’oge a? Olee otú o nwere ike isi meere anyị ụzọ mgbapụ n’otu n’otu?

Ndị A Napụtara n’Aka Ndị Mmegide

3. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ndị mmegide agaghị akwụsịli ndị Jehova ikwusa ozi ọma?

3 Ọ dịghị mmegide ọ bụla sitere n’aka Setan nke ga-egbochi Ndịàmà Jehova ife naanị Jehova dị ka ha kwesịrị. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma, ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.” (Aịza. 54:17) Ndị mmegide agbalịala igbochi ndị Chineke ikwusa ozi ọma a gwara ha kwusawa, ma ha akụọla afọ n’ala. Tụlee ihe atụ abụọ.

4, 5. Olee mmegide ndị Jehova nwetara na 1918, gịnịkwa si na ya pụta?

4 Na 1918, ndị ụkọchukwu kpaliri ndị mmegide ịkpagbu ndị Jehova iji kwụsị ọrụ nkwusa ha na-arụ. Na May 7, gọọmenti nyere iwu ka a nwụchie J. F. Rutherford, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa ahụ n’ụwa niile n’oge ahụ nakwa ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị. N’ime ọnwa abụọ, a mara Nwanna Rutherford na ndị ibe ya ikpe na-ezighị ezi na ha na-agba izu imegide ọchịchị ma kwuo na ha ga-aga mkpọrọ ruo ọtụtụ afọ. Ndị mmegide hà enweela ihe ịga nke ọma n’iji ụlọikpe kwụsị ọrụ nkwusa ahụ kpamkpam? N’ebeekwanụ!

5 Cheta nkwa Jehova kwere: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” N’ụzọ tụrụ mmadụ niile n’anya, na March 26, 1919—ọnwa itoolu ka a machara Nwanna Rutherford na ndị ibe ya ikpe—a nara ụmụnna ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ n’ebé. N’afọ sochirinụ, na May 5, 1920, a kagbuchara ebubo ndị e boro ha. Ụmụnna ndị a jiri oge a ha nweere onwe ha gaa n’ihu n’ọrụ Alaeze ahụ. Gịnị si na ya pụta? E nweela mmụba dị nnọọ ukwuu kemgbe ahụ! Ọ bụ ‘Onye na-eme ụzọ mgbapụ’ ka otuto niile na-agara maka ihe a a rụpụtara.—1 Kọr. 3:7.

6, 7. (a) Olee otú e si mesoo Ndịàmà Jehova nọ na Nazi Germany ihe, gịnịkwa siri na ya pụta? (b) Olee ihe akụkọ banyere Ndịàmà Jehova nke oge a na-egosi?

6 Ngwa ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Na 1934, Hitler fooro ntutu taa na ya ga-egbuchapụrịrị Ndịàmà Jehova na Germany. Nke a abụghị mbà ọnụ nkịtị. Mgbe o kwuchara ihe a, a malitere ịkpụrụ ọtụtụ ndị ma tụọ ha mkpọrọ. E mekpọrọ ọtụtụ puku Ndịàmà ọnụ, ma gbuo ọtụtụ narị ndị ọzọ n’ebe ndị a kpọchiri ha n’ogige ịta ahụhụ. Hitler ò gbuchapụrụ Ndịàmà dị ka o kwuru? Ọ̀ kwụsịrị ọrụ ikwusa ozi ọma na Germany kpamkpam? Mba! N’oge ahụ a na-akpagbu ụmụnna anyị, ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma na nzuzo. Mgbe a kwaturu ọchịchị ndị Nazi, ha jiri oge ahụ ha nweere onwe ha na-ekwusa ozi ọma. Taa, e nwere ihe karịrị otu narị puku ndị nkwusa Alaeze na iri puku isii na puku ise na Germany. ‘Onye na-emere ndị ya ụzọ mgbapụ’ emezuokwala nkwa ahụ o kwere ọzọ: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.”

7 Akụkọ banyere Ndịàmà Jehova taa na-agba akaebe na ọ dịtụghị mgbe Jehova ga-ekwe ka e kpochapụ ndị ya niile. (Ọma 116:15) Ma Jehova ọ̀ ga-echebe anyị n’otu n’otu? Olee otú Jehova si emere anyị ụzọ mgbapụ n’otu n’otu?

Olee Otú E Si Echebe Anyị n’Ụzọ Nkịtị?

8, 9. (a) Olee otú anyị si mara na e kweghị nkwa na a ga-echeberịrị anyị n’ụzọ nkịtị? (b) Gịnị ka anyị na-ekwesịtụghị ichefu?

8 Anyị maara na e kweghị anyị nkwa ichebe anyị n’otu n’otu n’ụzọ nkịtị. Anyị na-eṅomi ndị Hibru atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị jụrụ ịkpọrọ ihe oyiyi ọlaedo Eze Nebukadneza guzobere isi ala. Ụmụ okorobịa ndị a na-atụ egwu Chineke ebughị n’obi na Jehova ga-esi n’ụzọ ọrụ ebube chebe ha ka ihe ọ bụla ghara imerụ ha ahụ́. (Gụọ Daniel 3:17, 18.) Ma Jehova mechara napụta ha n’oké ọkụ ahụ. (Dan. 3:21-27) Ọbụna n’oge Baịbụl, ọ bụghị mgbe niile ka a napụtara ndị mmadụ n’ụzọ ọrụ ebube. Ndị na-emegide ndị ohu Jehova gburu ọtụtụ n’ime ha.—Hib. 11:35-37.

9 Oleekwanụ maka taa? Ebe ọ bụ na Jehova bụ ‘Onye na-emere ndị ya ụzọ mgbapụ,’ n’ezie o nwere ike ịnapụta onye ọ bụla nọ n’oké ihe isi ike. Ànyị nwere ike ikwu kpọmkwem mgbe Jehova napụtara mmadụ n’ụzọ ọrụ ebube na mgbe ọ na-emeghị otú ahụ? Ee e. Ma mmadụ nwere ike iche na ọ bụ Jehova napụtara ya ma ya lafere ọnọdụ tara akpụ. Ọ dịghị mkpa ịga rụwa onye ahụ ụka. Ma anyị agaghịkwa echefu na e nweela ọtụtụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ n’ihi mkpagbu, dị ka ọ dị n’oge ọchịchị ndị Nazi. E nweekwala ndị ọzọ nwụrụ n’ụzọ na-agbawa obi. (Ekli. 9:11) Anyị nwere ike ịjụ sị, ‘Jehova ọ̀ jụrụ imere ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụchuru ọnwụ ụzọ mgbapụ?’ Mbanụ.

10, 11. Gịnị mere mmadụ enwelighi ike igbochi ọnwụ ya, oleekwanụ ihe Jehova nwere ike ime banyere ọnwụ?

10 Chegodị nke a: Mmadụ enweghị ike igbochi ọnwụ ya, n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ike “imere mkpụrụ obi ya ụzọ ọ ga-esi gbanahụ Shiol,” ma ọ bụ Hedis, bụ́ ili mmadụ niile. (Ọma 89:48) Oleekwanụ banyere Jehova? Otu nwanna nwaanyị lafeere mmekpọ ọnụ ahụ e mekpọrọ Ndịàmà n’oge ọchịchị ndị Nazi kwuru otu ihe mama ya bụ́ Onyeàmà gwara ya n’otu oge iji kasie ya obi maka ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ n’ogige ịta ahụhụ: “Ọ bụrụ na ọnwụ ga-ejichi ndị o gburu, ọ ga-akazinụ Chineke ike, ọ́ bụghị ya?” N’ezie, ọ dịtụghị mgbe ọnwụ ga-aka onye kacha ike, bụ́ Isi Iyi nke ndụ, ike! (Ọma 36:9) Jehova na-echeta ndị niile nọ na Shiol, ma ọ bụ Hedis, ọ ga-anapụtakwa onye ọ bụla n’ime ha.—Luk 20:37, 38; Mkpu. 20:11-14.

11 Ka ọ dịgodị, Jehova na-eleba anya n’ihe na-eme ná ndụ ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi taa. Ka anyị lee ụzọ atọ o si ‘emere anyị ụzọ mgbapụ’ n’ezie.

Ọ Na-echebe Anyị n’Ụzọ Ime Mmụọ

12, 13. Gịnị mere ichebe anyị n’ụzọ ime mmụọ ji bụrụ ihe kacha mkpa, oleekwa otú Jehova si echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ?

12 Jehova na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma anyị na ya, nke bụ́kwanụ ihe kacha mkpa. Anyị bụ́ Ndị Kraịst ghọtara na e nwere ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ndụ anyị dị ugbu a. Ọ dịghị ihe dị oké ọnụ ahịa anyị nwere nke karịrị mmekọrịta anyị na Jehova. (Ọma 25:14; 63:3) Ma ọ́ bụghị mmekọrịta a, ndụ anyị dị ugbu a enweghị isi, anyị agakwaghị enwe olileanya maka ọdịnihu.

13 Anyị nwere obi ụtọ na Jehova nyere anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ịhụ na anyị na ya nọgidere na-adị ná mma. Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ na-enyere anyị aka. Olee otú anyị nwere ike isi rite uru dị ukwuu n’ihe ndị a Jehova nyere anyị? Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi Okwu ya anya, nke a ga-eme ka okwukwe na olileanya anyị sikwuo ike. (Rom 15:4) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-arịọ maka mmụọ nsọ ya, Jehova ga-enyere anyị aka ịghara ime ihe ndị ga-emebi mmekọrịta anyị na ya. (Luk 11:13) Ọ bụrụ na anyị na-eso ntụziaka ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-enye anyị n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl nakwa n’ọmụmụ ihe na mgbakọ ukwu na mgbakọ nta, nri ime mmụọ ndị a na-enye “n’oge kwesịrị ekwesị” ga-eme ka ahụ́ na-adị anyị mma. (Mat. 24:45) Ihe ndị a Jehova na-enye anyị na-echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ ma na-eme ka anyị nọrọ ya nso.—Jems 4:8.

14. Kọọ ahụmahụ gosiri otú Jehova si echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ.

14 Iji gosi otú Jehova si echebe mmekọrịta anyị na ya, cheta nne na nna ahụ anyị kpọtụrụ aha ná mmalite isiokwu bu nke a ụzọ. Naanị abalị ole na ole ka ha nụchara na a na-achọ nwa ha nwaanyị bụ́ Theresa achọ, ha nụrụ nke kacha agbawa obi: E gbuola ya. * Papa ya kwuru, sị: “Mgbe ahụ anyị nụrụ na a na-achọ ya achọ, ekpere m ekpere ka Jehova chebe ya. Mgbe anyị nụrụ na e gbuola ya, ihe mbụ m jụrụ onwe m bụ ihe mere Jehova azaghị ekpere m. N’ezie, m maara na Jehova ekweghị nkwa ichebe ndị ya n’otu n’otu n’ụzọ ọrụ ebube. Anọgidere m na-ekpe ekpere ka Jehova nyere m aka ịghọta ihe mere o ji dị otú ahụ. Ịghọta na Jehova na-echebe ndị ya n’ụzọ ime mmụọ—ya bụ na ọ na-enye anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma—kasiri m obi. Ụdị nchebe a kacha mkpa, n’ihi na o nwere ike imetụta ndụ ebighị ebi anyị. Ọ bụ otú a ka Jehova si chebe Theresa; ọ kwụsịghị ijere Jehova ozi ruo ọnwụ. Obi eruola m ala ka m na-echeta na Nna anyị hụrụ anyị n’anya ga-echeta ya.”

Ọ Na-enye Anyị Ume Mgbe Anyị Nọ n’Ọrịa

15. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka mgbe anyị nọ n’ezigbo ọrịa?

15 Jehova nwere ike inye anyị ume mgbe anyị nọ “n’ute ọrịa,” dị ka o nyere Devid. (Ọma 41:3) Ọ bụ ezie na Jehova adịghị agwọ anyị ọrịa taa n’ụzọ ọrụ ebube, ma e nwere ụzọ o si enyere anyị aka. Olee otú o si eme nke a? Ihe ndị e kwuru n’Okwu ya nwere ike inyere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma banyere otú anyị ga-achọ ka e si gwọọ anyị nakwa banyere ihe ndị ọzọ. (Ilu 2:6) Anyị nwere ike ịchọta ihe ndị ga-enyere anyị aka na aro ndị ga-abara anyị uru n’isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche na Teta!, ndị kwuru banyere ọrịa ahụ anyị na-arịa. Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya nye anyị “ike karịrị ike nkịtị” ka anyị wee nwee ike idi nsogbu anyị na-enwe ma nọgide na-eme uche ya, n’agbanyeghị ihe ọ bụla nwere ike ime. (2 Kọr. 4:7) Enyemaka dị otú a ga-eme ka anyị ghara ichegbu onwe anyị gabiga ókè banyere ọrịa anyị nke na anyị ga-elegharazi ihe ndị metụtara Chineke anya.

16. Gịnị nyeere otu nwanna nwoke aka idi ọrịa ya?

16 Tụlee ihe banyere nwanna nwoke ahụ na-eto eto anyị kwuru okwu ya ná mmalite nke isiokwu bu nke a ụzọ. N’afọ 1998, a chọpụtara na o nwere ọrịa a na-akpọ ALS, bụ́ nke mechara kwarụọ ya ahụ́ dum. * Gịnị nyeere ya aka idi ọrịa a? O kwuru, sị: “E nweela oge ndị m nwere ihe mgbu na nkụda mmụọ bụ́ mgbe m chere na ọ bụ naanị ọnwụ ga-eme ka m nwere onwe m. Mgbe ọ bụla ọ dị m ka nsogbu m ọ̀ karịala m ike, m na-ekpe ekpere ka Jehova nye m ihe atọ: obi dị jụụ, ndidi, na ntachi obi. Echere m na Jehova zara m ekpere ndị ahụ. Inwe obi dị jụụ na-enyere m aka ịdị na-eche banyere ihe ndị na-akasi obi, ihe ndị dị ka otú ọ ga-adị n’ime ụwa ọhụrụ bụ́ mgbe m ga-enwe ike ịga ije, ịnụ ụtọ nri, na iso ndị ezinụlọ m na-ekwurịta okwu ọzọ. Ndidi na-enyere m aka idi nsogbu na ihe isi ike ndị ha na ọrịa m so aga. Ntachi obi na-eme ka m nọgidesie ike n’akụkụ Jehova ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla mebie mmekọrịta mụ na ya. N’ezie ọ dị m otú ọ dị ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, n’ihi na Jehova na-enye m ume n’ute ọrịa m.”—Aịza. 35:5, 6.

Ọ Na-egboro Anyị Mkpa Anyị

17. Gịnị ka Jehova kwere nkwa imere anyị, gịnịkwa ka nkwa ahụ o kwere pụtara?

17 Jehova kwere nkwa inye anyị ihe ndị anyị ga-eji egbo mkpa anụ ahụ́ anyị. (Gụọ Matiu 6:33, 34 na Ndị Hibru 13:5, 6.) Nke a apụtaghị na anyị ga-atụ anya ka Jehova si n’ụzọ ọrụ ebube nye anyị ihe ndị anyị ga-eji elekọta onwe anyị, ọ pụtaghịkwa na anyị agaghị na-arụ ọrụ. (2 Tesa. 3:10) Ihe nkwa ahụ e kwere pụtara bụ: Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ alaeze ahụ ná ndụ anyị, ma dị njikere ịrụ ọrụ iji nweta ihe anyị ga-eri, obi nweziri ike isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka inweta ihe ndị dị anyị mkpa ná ndụ. (1 Tesa. 4:11, 12; 1 Tim. 5:8) Ọ ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa n’ụzọ ndị o nwere ike ịbụ na anyị echeghị na ọ ga-esi eme ya, ikekwe site n’aka onye anyị na ya so efe Jehova, bụ́ onye gbataara anyị ọsọ enyemaka ma ọ bụ nye anyị ọrụ.

18. Kọọ ahụmahụ gosiri na e nwere ike inye anyị ihe na-akpa anyị mgbe anyị nọ ná mkpa.

18 Cheta nwaanyị ahụ naanị ya na-azụ nwa ya nke a kpọtụrụ aha ná mmalite nke isiokwu bu nke a ụzọ. Mgbe ya na nwa ya nwaanyị dị obere kwagara n’ebe ọhụrụ, o siiri ya ike ịchọta ọrụ. O kwuru, sị: “Ana m aga ozi ọma n’ụtụtụ, ma jiri ehihie niile na-achọ ọrụ. Echetara m otu ụbọchị m gara ebe a na-ere ihe e ji esi nri ịga zụrụ mmiri ara ehi. Akwụụrụ m na-ele akwụkwọ nri ndị dị ebe ahụ, ma enweghị m ego m ga-eji azụ ha. Ọ dịtụbeghị mgbe obi jọrọ m njọ otú ọ jọrọ m n’ụbọchị ahụ. Mgbe m laruru, ahụrụ m akpa ụdị akwụkwọ nri ọ bụla juru na ha n’ọnụ ụzọ azụ ụlọ m. Anyị enweela nri ga-ezuru anyị ọtụtụ ọnwa. Ebere m nnọọ ákwá ma kelee Jehova.” Nwanna nwaanyị a mechara chọpụta na ọ bụ otu nwanna nwoke nọ n’ọgbakọ ha, bụ́ onye kụrụ akwụkwọ nri ndị ahụ n’ugbo ya, dọsara ha. O mechara degara nwanna nwoke ahụ akwụkwọ, sị: “Ọ bụ ezie na m kelere gị nke ukwuu n’ụbọchị ahụ, ekelekwara m Jehova bụ́ onye jiri obiọma gị chetara m na ya hụrụ m n’anya.”—Ilu 19:17.

19. N’oké mkpagbu ahụ, olee ihe obi ga-esi ndị ohu Jehova ike na ọ ga-eme, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ugbu a?

19 O doro nnọọ anya na ihe ndị Jehova mere n’oge Baịbụl na ndị nke ọ na-eme n’oge anyị a na-eme ka anyị tụkwasị ya obi na ọ bụ onye Inyeaka anyị. N’oge na-adịghị anya, mgbe oké mkpagbu ahụ ga-abịakwasị ụwa Setan, enyemaka Jehova ga-adị anyị mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ma, ndị ohu Jehova ga-enwe obi ike zuru ezu na Jehova ga-anapụta ha. Ha ga-enwe ike iweli isi ha elu ma ṅụrịa, n’ihi na ha maara na nnapụta ha erule nso. (Luk 21:28) Ka ọ dịgodị, ọnwụnwa ọ bụla ọ sọkwara ya ya bịara anyị, ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova obi, nwee obi ike zuru ezu na Chineke anyị na-adịghị agbanwe agbanwe bụ n’ezie ‘Onye na-emere anyị ụzọ mgbapụ.’

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Lee isiokwu bụ́ “Okwukwe M Nyere M Aka Idi Ọrịa ALS,” nke dị na Teta! bekee nke January 2006, peeji nke 25-29.

Ì Chetara?

• Olee otú Jehova nwere ike isi meere ndị nwụchuru ọnwụ ụzọ mgbapụ?

• N’ihi gịnị ka nchebe ime mmụọ ji karachaa mkpa?

• Gịnị ka nkwa Jehova kwere igboro anyị mkpa anụ ahụ́ anyị pụtara?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 8]

E mechara hapụ Nwanna Rutherford na ndị ibe ya bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ na 1918, a kagbukwara ebubo ndị e boro ha

[Foto dị na peeji nke 10]

Jehova nwere ike inye anyị ume mgbe anyị nọ “n’ute ọrịa”